Abụ m Achịcha Dị Ndụ [Complete Hymn with Lyrics]

The hymn entitled ‘Abụ m Achịcha Dị Ndụ‘ is one of the popular Igbo Hymns composed by Sir Jude Nnam which is used in Christian communities during worship. Catholic faithful use this hymn as one of the Communion Hymns for Mass and other liturgical celebrations. You will find below the lyrics of this hymn.

Abụ m Achịcha Dị Ndụ Lyrics

s/s:-:f/m:-:l/s:-:-/m:-:-

Chorus: Abụ m achịcha dị ndụ

Abụ m achịcha dị ndụ

Si n’eligwe bịa.

1. Onye riri achịcha nke a

Ga-adị ndụ ọkpụ.

2. Achịcha m ga enye ụnụ bụ ahụ m

maka ndụ nke ụwa.

3. Onye riri ahụ m ñụọ ọbara m

Ga-ebi n’ime mụ.

4. Onye riri ahụ m ñụọ ọbara m

aga m ebi n’ime ya.

5. Ahụ m bụ ihe oriri ezie

Ọbara m bụ ihe ọñụñụ ezie.

6. Ezie, Ezie agwa m ụnụ

beere sọ ụnụ riri ahụ m ñụọ ọbara m,

Ụnụ am’enwenata ndụ n’ime ụnụ.

7. Onye riri, ñụọ n’eto eto

mara onwe ya ikpe.

8. Oge ụnụ na-eme ihe ndị a

Ụnụ na-echeta ọnwụ m.

9. Ị gwara ndị Jew, ma ha ekwenyeghị

ha jebe ha enweghị okwukwe.

10. Ị gwara ndị Apostle ha aghọtaghị

ma kwere ha nwere okwukwe.

11. Ọ bụghị na Ngị kwuru nke a

Ọ bụdị onye ga-ekwere.

12. I nwere ike imeju nkwa i kwere

makana ị bụ Chukwu.

13. I mere mmiri ọghọrọ mmanya

I mere ihe n’adịghị ọdị.

14. A ghọtaghị m ma mụ kwere

Ka Pita siri kwere.

15. A hụghị m ka Thomas ma kwere

Ka okwukwe m sie ike.

16. Ngọzi dịrị ndị n’ahụghị

mana ha nwa ekwere.

17. Chukwu zoro n’ihe anyị n’ahụ

ugbu a, esekpuere m Gị.

18. Ezigbo Jesu ji ahụ ya azụ mụ

Ekene dịrị Gị.

19. Etoghị m ka ị bata n’ime ụlọ m

maka njọ nke m mere.

20. Were ọbara Ị dị oke ọnụ

wee wụchaa njọ nke mụ mere.

21. Otu ọnụ Ọbara Ị dị oke ọnụ

pụrụ ịwụcha njọ ụwa nile.

22. Gosị m O ezigbo Jesu

Otito gị n’ụwa ọzọ.

Other Igbo Communion Hymns

Other Catholic Hymns