Ahụ Jesu na-enye Ndụ [Complete Hymn with Lyrics]

The hymn entitled ‘Ahụ Jesu na-enye Ndụ‘ is one of the popular Igbo Hymns which is used in Christian communities during worship. Catholic faithful use this hymn as one of the Communion Hymns for Mass and other liturgical celebrations. You will find below the lyrics of this hymn.

Ahụ Jesu na-enye Ndụ Lyrics

:s:l/m:-:-/-:s:l/m:-:-/m:s:m/d:r:f/m:-

Chorus: Naranụ, rienụ ahụ Jesu n’enye ndụ. DC.

1. Onyenweanyị Jesu bịara n’ụwa taa ahụhụ wee gbapụta mmadụ, Site n’iwere Onwe ya mee achịcha nke ndụ.

2. Ka Jesu bịara n’isi njedebe ọlụ ya n’elu ụwa, Ka O gosịrị anyị omume nke ịhụnanya. Site n’iwere Onwe ya mee achịcha nke ndụ.

3. N’oriri Nsọ ka Jesu n’onwe ya gosịrị, anyị ịhụnanya, Na Ọ ga-anọnyere anyị wee rue mgb’ebighịebi. Site n’iwere Onwe ya mee achịcha nke ndụ.

4. Ndị ụmụ-azụ Jesu ka Jesu tinyere ya n’aka Ka ha gbasaba ebube Chineke n’elu ụwa. Site n’iwere Onwe ya mee achịcha nke ndụ.

5. Neenụ ka Jesu bịara n’ụdị Chukwu Wee bụr’ihe oriri nke mkpụr’obi Site n’iwere Onwe Ya mee achịcha nke ndụ.

Other Igbo Communion Hymns

Other Catholic Hymns