Aja Dị Nsọ [Complete Hymn with Lyrics]
The hymn entitled ‘Aja Dị Nsọ‘ is one of the popular Igbo Hymns which is used in Christian communities during worship. Catholic faithful use this hymn as one of the Offertory Hymns for Mass and other liturgical celebrations. You will find below the lyrics of this hymn.
Aja Dị Nsọ Lyrics (Key Eb24)
s:l:s:-/s:-:-:-/s:l:s:s/m:-
Chorus: Aja dị nsọ aja dị oke ọnụ ụmụ Chineke n’achụrụ Chukwu.
Aja anyị n’achụrụ Chukwu bụ onwe anyị,
ahụ na mkpụrụ-obi anyị.
Nara Nna nara nara Onyinye ụmụ gị nara aja dị nsọ.
1. Anyị ekele gị maka ọgọ gị niile
Refrain: Chukwu biko nara aja nara ụmụ gị gozie,
Anyị ekele gị maka afọma gị.
Refrain: Chukwu biko nara aja nara ụmụ gị gozie,
Anyị ekele gị maka ngọzi gị.
Refrain: Chukwu biko nara aja nara ụmụ gị gọzie.
2. Anyị enye gị nsọpụrụ na otito kachaelu. Ref:
Anyị edoo gị ebube Nna onye kasịelu Ref:
Anyị ebunye gị iko nsọ biko nara ya. Ref:
3. Anyị arịọ gị mgbaghara njọ anyị. Ref:
Anyị arịọ gị ebere n’obodo anyị. Ref:
Anyị arịọ gị grasịa na ngọzi niile. Ref: