Anatago m Jesu n’obi m [Complete Hymn with Lyrics]

The hymn entitled ‘Anatago m Jesu n’obi m‘ is one of the popular Igbo Hymns which is used in Christian communities during worship. Catholic faithful use this hymn as one of the Communion Hymns for Mass and other liturgical celebrations. You will find below the lyrics of this hymn.

Anatago m Jesu n’obi m Lyrics

s.s:s.s:-.s/l:m.s:f/m.m.m.r:-.m/s:-:-

Chorus: Anatago m Jesu n’obi m

Ọ bụ mbosị añụrị

O si n’eligwe bịa n’ụwa

Otito dịrị ya.

1. N’umeala ka m sekpuelu gị,

Onye nzọpụta nke m;

Eji m obi m nile kwelu Chukwu,

Onye okike m.

2. Ka m were obi m nile ọnụ m

N’ike nile nke ndụ m

N’ekene gị ezi ekene,

Chukwu nk’ịhụnanya.

3. Gee ntị nụrụ ihe m n’arịọ Gị,

Ezigbo Dinwenụ.

Debe ndụ nke dị n’ime obi m

Na grasịa nke Chukwu.

4. Eucharistịa, site na taa

Ị ga-adị n’ime obi m

Oge nile m ga-anọ n’ụwa

Wee rue na mbosị ọnwụ.

Other Igbo Communion Hymns

Other Catholic Hymns