Bịa Mmụọ Nsọ [Complete Hymn with Lyrics]

The hymn entitled ‘Bịa Mmụọ Nsọ‘ is one of the hymns used in Igbo Christian communities during worship. Catholic faithful use this hymn as Entrance Hymns for the Mass and other liturgical celebrations. You will find below the lyrics of this hymn.

Bịa Mmụọ Nsọ Lyrics (Key G34)

d:-.m:m/r:-:-/:m.s:m/d:-.t:l/s:-:-

1. Bịa, bịa Mmụọ Nsọ

Osebụlụwa nk’ihe

Si n’eligwe zidata ihe Gị;

Ihe Gị na-amụke amụke.

2. Bịa O Nna ndị ogbenye

Wel’onyinye nke ntasị obi bịa

Bịa onye bụ ife ndị nile dị ndụ.

3. Ngị onye ntasị obi k’asị mma

Ngị b’onye ọbịa n’enye añụlị n’obi

Ngị n’enyenwo ndụ.

4. N’olu Ngị bụ ezumike, n’ekpo m’ọkụ

Ngị bụ ndo; na nsogbu

Ngị bụ ntasị obi.

5. Ife dị anwụ anwụ

Ife mmụọ dị ngọzi

Chajuo n’ime obi ndị nile kwerenụ.

6. Ewepụ Grasịa Gị onwerọz’ihe dị n’ime mmadụ dizi ọcha;

ifeọma dị n’ime ya apụọ

Ọbụrụzịa ife lụl’alụ.

7. Biko sachapụ atụtụ njọ anyị

gbasa mmiri n’obi kpọrọ nkụ

gwọọ-ọ ọya anyị ga.

8. Tinye umeanị n’obi sir’ike,

mụnye ọkụ n’obi jul’oyi;

duzie ndị n’eme njefie ụzọ.

9. Nye ndị kwerenụ

Ndị chekwubere na gị,

ndị n’efe gị onyinye asaa gị dị asọ.

10. N’isi njedebe ny’anyị nzọpụta

Na ụgwọ dịlị eziomume nye

Anyị añụlị ebebe Amen. (Alleluia).

Other Igbo Entrance Hymns

Other Catholic Hymns