Bịanụ Nara Ahụ Kristi [Complete Hymn with Lyrics]

The hymn entitled ‘Bịanụ Nara Ahụ Kristi‘ is one of the popular Igbo Hymns which is used in Christian communities during worship. Catholic faithful use this hymn as one of the Communion Hymns for Mass and other liturgical celebrations. You will find below the lyrics of this hymn.

Bịanụ Nara Ahụ Kristi Lyrics

:m.s:s/d:m.r.-.d/d:-:-//

Sop. Solo: Kulitenụ ụmụ Chukwu, Kulitenụ bịanụ nar’ahụ n’ọbara Onyenweanyị, na onye ọbụla riri ahụ Kristi m’ọbụ ñụọ ọbara ya, agụụ agaghị ịgụ y’ọzọ, ọ gaghị ahụnata ọnwụ anya, ọ ga-enwetakwa ndụ nke mmụọ n’uju.

Chorus: Kulitenụ bịanụ nara ahụ Kristi rie rienụ ya bịanụ nara ọbara Kristi ñụọ, na onye n’anata ahụ n’ọbara Kristi na-enweta ndụ n’uju, nwanne m nara ya, bịa nara onye ahụ chụrụ aja n’obe Ozur’oke na oriri nsọ makana Kristi n’onwe ya ekwugo ya, beere sọ ma iriri ahụ m ñụọ ọbara mo, Ị gaghị enwe ndụ n’ime gị.

1. Bịanụ, bịanụ nara ahụ Kristi rie, bịanụ bịanụ nara ọbara Kristi ñụọ, bịanụ rie nri dị nsọ si n’igwe bịa n’ụwa, matakwa n’ịgaghị enwe ndụ n’ime gị, matakwa n’ịgaghị enwe ndụ, matakwa n’ịgaghị enwe ndụ nwa nne m, matakwa n’ịgaghị enwe ndụ n’ime ma ncha biko bịanụ doo biko bịanụ nara ahụ Kristi rie, Meghepụ obi gị ka Kristi bata biri na ya, Kulie nara ahụ Kristi rie. Bịanụ doo bịanụ, bịanụ, bịanụ, bịanụ, bịanụ, bịanụ, bịanụ, matakwa n’ịgaghị enwe ndụ sọsọ ma iriri ahụ maọbụ ñụọ ọbara Kristi, onye jiri maka mụ na gị bịa n’ụwa nwụọ.

2. Achịcha ndị mmụọma agbadatago n’ụwa bịa nara ya rie, rie osi N’igwe bịa Dinwenụ Kristi abịago n’ụwa, were onwe ya chụọ aja n’elu obe n’ihi njọ mụ na gị o beere sọ ma iriri ahụ ya ñụọ ọbara ya Ị gaghị enwe ndụ n’ime gị nwa nne m.

3. Ma chetakwa na onye ọbụna n’anata ahụ n’ọbara ya n’etoghị eto, onye ahụ mara onwe ya ikpe jụọ onwe gị ajụjụ, doo chee echiche nke ọma tupu ikunite jee ịnara Kristi, onye ọbụla natara Kristi n’enweghị atụtụ g’enweta ndụ ebighịebi. Meghepụ obi gị ka Kristi bata biri na ya biko Meghepụ obi gị ka Kristi bata, Meghepụ obi gị ka Kristi bata.

Other Igbo Communion Hymns

Other Catholic Hymns