Bute Ihe Onyinye [Complete Hymn with Lyrics]

The hymn entitled ‘Bute Ihe Onyinye‘ is one of the popular Igbo Hymns composed by Joe Onyekwelu which is used in Christian communities during worship. Catholic faithful use this hymn as one of the Offertory Hymns for Mass and other liturgical celebrations. You will find below the lyrics of this hymn.

Bute Ihe Onyinye Lyrics (Key F24)

m:-:-:s/d:f.f:r/m:-:-:t/r:-.r:r:d/d:-

Chorus: Butenụ ihe onyinye ka anyị nye Dinwenụ

Onyinye mara mma anyị na-ebunye ya

Onyinye buru ibu n’atụ n’anya

Ngị bute ya, weta ya, k’odo gị nsọ,

Bute ya, weta ya, k’odo gị nsọ.

1. N’ihina Chineke n’onwe ya bụ onye onyinye

Chineke dị mma onye okike

Ọ naghị atụcha atụcha mgbe ọ na-enye gị

N’ihi ya, elelanya n’azụ mgbe ị na-enye ya onyinye.

2. Bute onyinye, k’ụnụ kelee ya

Bute onyinye ụnụ n’ihu ya

Bute onyinye k’ụnụ bịa kelee Chukwu,

Onye nwe mmadụ, Ezi Nna, ọkasị akasị.

3. Onyinye ị na-enye Chineke

Bụ onyinye Chineke nyere gị

Were ya nyekwa ya, k’odo gị nsọ maka,

Akụ nile ịkpara, bụ Chineke nyere gị

Ihe nile i nwere, bụ Chineke nyere gị

Ndụ nile i nwere n’ụwa, bụ Chineke nyere gị

Añụrị nile i nwere n’ụwa, bụ Chineke nyere gị

Amamihe gị nile bụ Chineke nyere gị.

Other Igbo Offertory Hymns

Other Catholic Hymns