Chinaemere m [Complete Hymn with Lyrics]

The hymn entitled ‘Chinaemere m‘ is one of the popular Igbo Hymns which is used in Christian communities during worship. Catholic faithful use this hymn as one of the Offertory Hymns for Mass and other liturgical celebrations. You will find below the lyrics of this hymn.

Chinaemere m Lyrics

Ọ na-emere m mma (kelee ya)

Ọ na-emere m mma mma,

Kedụ, ihe m g’enye ezi Nna mo

Onye Obi ọma (bịa k’anyị jaa ya mma)

Aga m aja ya mma.

Aga m atụrụ Ya mma mma ihe Chinaemere mo

ọnụ m apụghị ịkọchasị

(Bukọtaba ha onyinye nile k’anyị bunye Chineke Nna na Ọ n’emere m ihe ọnụ m apụghị ị kọchasị).

Bass: Chinaemere m mma n’eziokwu

Refrain: Chinaemere mo.

Bass: mana Chineke Nna bụ ya buchi obu. Chi . . . . . . . .

1. Ị na-ajụ m onye nyere mụ ndụ mo, ndụ nke ịdị onye nyere gị ee. Ị na-ajụ m onye nyere m ahụike? Ahụike nke i nwere onye nyere gị ee Oh.

2. Ị na-eje eje ị nabata, Ọ bụ onye n’echebe gị n’ihe mberede n’ọnya nile nke ekwensu n’agba.  Ọ bụ onye na-echebe gị n’ihe mberede Oh.

3. Ọ bụ onye kere anyanwụ na ọnwa ma kee kpakpando nile dị n’eligwe o nyere mmadụ echiche na ihe nile n’uju nwanne m soro m kelee Chineke Chi-mo-ne mere m ihe ọma.

Other Igbo Offertory Hymns

Other Catholic Hymns