Dinwenụ bata Sachaa m [Complete Hymn with Lyrics]

The hymn entitled ‘Dinwenụ bata Sachaa m‘ is one of the popular Igbo Hymns which is used in Christian communities during worship. Catholic faithful use this hymn as one of the Communion Hymns for Mass and other liturgical celebrations. You will find below the lyrics of this hymn.

Dinwenụ bata Sachaa m Lyrics

Chorus: Bata n’obi m Dinwenụ sachaa m sachaa m na njọ m mekwa ka m ka dị ọcha. Mee m ka m dị ọcha n’ime obi m. Ọ bụ ngị na-edo anyị nsọ, Gị ka ihe nile dị n’aka ya sachaa mo. Bata n’ime m sachaanụ mo ahụrụ m ngị n’anya. Ma njọ m n’ekebi mụ na Gị biko Wer’ike Gị sachaanụ mo. Wer’obi ebere biri n’ime m batawa Dinwenụ. Gị sowa n’ihi Dinwenụ enweghị m ike ịdị mma.

1. Dịka ala kpọrọ nkụ si achọ mmiri

Etu ahụ ka mkpụrụobi m si achọkwa Gị

O Dinwenụ bịa, bata O

Dinwenụ bata, biko biko

Bịa menyụnata agụ oriwarawara nke ime njọ,

O Dinwenụ m mkpụrụobi m n’achọsi Gị ike batawa Dinwenụ.

Mkpụrụobi m agaghị enwe ezumike belụsọ na Gị Dinwenụ.

2. O Dinwenụ cheta, cheta chetakwa na ntụ k’a m bụ, Aja nkịtị ka m bụ chetakwa na m bụ aja n’enweghị ike inyer’onwe ya aka maọbụ kpee ka mekpere m’ọbụ nye gị otito. Belụsọ ma ike si n’aka Gị bịa. Chineke cheta n’abụ m aja na ntụ nọọrọ onwe ya, O Dinwenụ cheta, cheta n’abụ m Aja n’enweghị ike ikuru ume ndụ m’ọbụ rụọ ọrụ belụsọ na gị.

3. Ịmarala ka adịghị ike m ha, Amazi m ụma Dinwenụ bata, bata biri n’ime m kuziere m ụzọ gị, nyekwa m ndụ gị. Biko nyerenụ m aka ka m wee dị ọcha wee dị mma ịnata Gị.

4. O Biko elena anya na njọ m, ịnụgo Chineke mo Ị ga-echekwa ka m dị ọcha dịka Gị, o kwere omume Ekwela k’ahụhụ ịtaara m n’elu obe ka ọbụrụ ihe nkịtị. Chetakwa Ekwela ọbara Gị dị oke ọnụ ịgbafuru maka njọ, Ka ọbụrụ ihe nkịtị Dinwenụ. Ekwela ka ọbara Gị dị oke ọnụ ịgbafuru maka njọ m ka ọ bụrụ ihe nkịtị Dinwenụ.

5. Bịazienụ Dinwenụ were m mere ebe obibi Gị bata n’ime m were m mere ihe sọrọ gị, bịa onye amara onye dị nsọ, Chukwu onye ebere, onye dị mma bịa onye amara, onye dị nwayọọ dịkwa ike, onye dị umeala dịkwa elu, onye nwere ugwu na nsọpụrụ. Bịa bịa nye m olilanya, olilanya dịrị onye mere uche Gị, Olilanya dịrị ndị kwere na Gị, Olilanya dịrị ndị bụ ndị nke Gị. Bịa bịa nye m olilanya ịhụ ihu Gị, ịhụ ihu Gị nweta ndụ ebighịebi.

Other Igbo Communion Hymns

Other Catholic Hymns