Uzo Nke Obe (Igbo Stations of the Cross) – Ekpere Mmechi.
Nke a bụ Uzo Nke Obe (Igbo Stations of the Cross) – Ekpere Mmechi.
MMECHI
Onye-ndu: Dinwenụ anyị huwere isi garuo n’ọnwụ
Sekpuru ala zaa: ỌNWỤ N’ELU OBE
Geenụ ntị ka m gwa ụnụ otu ihe omimi. Anyị niile agaghị adacha mba n’ụra ma anyị niile ga-agbanwocha. N’oge ntakịrị n’otu ntabi anya n’ụda opi-igwe. Maka na-aga egbu opi-igwe ndị nwụrụ anwụ ebilite n’ụdị anwụ anwụ, anyi niile abịa gbanwoo. Maka na ahụ anyị nke a na-emebi emebi ga-abịa yiri emebighị emebi, ahụ anyị nke a na-anwụ anwụ abịa bụrụ anwụ anwụ. Mgbe ihe na-emebi emebi ga-abịa yiri emebighị emebi, ihe nke na-anwụ anwụ abịa bụrụ anwụ anwụ, mgbe ahụ ka a ga-emezu ihe e dere sị: “E loole ọnwụ na mmeri”.
Ọnwụ! O lee mmeri gị
Ọnwụ O lee ụfụ gị? (1 Ndi Korint 15:51-52).
Ọha: Jesu m; ahụrụ m gị n’anya karichaa ihe niile;
E ji m obi m niile chegharịa maka mmeghe m mehiere Gị.
Ekwela ka m kewapụ onwe m ọzọ n’ebe Ị nọ;
Mee ka m hụ Gị na anya mgbe ọbụla;
Bịa were m mee ihe ọbụla masịrị Gị.
Nna anyị nọ n’eluigwe… Ekele Marịa … Otito dịrị Nna…
Onye-ndu: Jesu a kpọdoro n’obe maka ihi anyị.
Ọha: Mere anyị ebere
Onye-ndu: ka mkpụrụobi ndị niile kwerenụ gara aga;
Ọha: Site n’ebere nke Chukwu ka ha zuo ike na ndokwa. Amen.
Ukwe: Otu ukwe lent ma ọ bụ ukwe mbilite n’ọnwụ.
Ụzọ nke Obe
- Ekpere Mmeghe: N’ihu Altar
- Nkwụsị nke Mbụ: A ma Jesu Ikpe ọnwụ
- Nkwụsị nke Abụọ: Jesu Eburu Obe Ya
- Nkwụsị nke Atọ: Jesu Adaa nke Mbụ
- Nkwụsị nke Anọ: Jesu Ezute Nne ya N’Uzo
- Nkwụsị nke Ise: Simion Enyere Jesu Aka Ibu Obe
- Nkwụsị nke Isii: Veronica Ehichaa Jesu Ihu
- Nkwụsị nke Asaa: Jesu Adaa nke Ugboro Abụọ
- Nkwụsị nke Asatọ: Jesu Ezute Umunwaanyi Jerusalem
- Nkwụsị nke Itoolu: Jesu Adaa nke Ugboro Atọ
- Nkwụsị nke Iri: A gbawa Jesu ọtọ
- Nkwụsị nke Iri na Otu: A Kpodo Jesu n’obe
- Nkwụsị nke Iri na Abụọ: Jesu Anwụọ n’elu obe
- Nkwụsị nke Iri na Atọ: E butuo Ahụ Jesu n’obe
- Nkwụsị nke Iri na Anọ: A Dọnye Jesu N’ili
- Ekpere Mmechi: Ekpere Mmechi Uzo nke Obe
Nke a bụ Uzo Nke Obe (Igbo Stations of the Cross) – Ekpere Mmechi.