Igbo Mass Readings for November 30 2024, Emume Ncheta Andru Dị Nsọ, Onye Apostụl

Nke a bụ Igbo Mass Readings for November 30 2024, Emume Ncheta Andru Dị Nsọ, Onye Apostụl

IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 10:9-18

Ihe ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọozi Pọl degaara ndị Rom.

N’ihina ọ bụrụ na ị ga-ewere ọnụ gị kwupụta na Jesu bụ Onyenweanyị, ọ bụrụkwa na ị ga-ewere obi gị kwere na Chineke mere ka O si na n’ọnwụ bilie, a ga-azọpụta gị!

Ọ bụ site n’iji obi anyị kwere, ka Chineke ji gụnye anyị na ndị eziomume sitekwa n’iji ọnụ anyị kwupụta Kristi, ka e ji zọpụta anyị. Akwụkwọ Nsọ na-ekwu sị, “Onye ọbụla nke kwere na ya, Chineke agaghị ekwe ka ihere mee ya.”

Nke a bụ maka mmadụ niile, maka n’ime Kristi, o nweghị ihe dị iche n’etiti ndị Juu na ndị Grik. Chineke bụ Dinwenụ nke mmadụ niile.

Ọ na-egosikwa afọma ya n’ebe ndị na-akpọku ya nọ. Dịka Akwụkwọ Nsọ si kwuo, “Onye ọbụla nke na akpọku ya ga-enweta nzọpụta.”

Ma olee otu ụmụ mmadụ ga-esi akpọku onye ahụ nke ha na-ekweghị na ya? Ha ga-esi aghaa nụ ma ọ bụrụ na onye na-ezisa oziọma agwaghị ha okwu?

A ga-esi aghaa kwusa oziọma ahụ ma ọ bụrụ na e zipụghị ndịozi? Dịka Akwụkwọ Nsọ na-ekwu, “Lee ka ha si maa mma nke ukwu, bụ ụkwụ nke ndị na-ezisa oziọma!”

Ọ bụghị mmadụ niile narala oziọma ahụ. Aịzaya n’onwe ya kwuru sị, “Onyenweanyị, onye kwerela ihe anyị kwuru? Ya bụ, okwukwe si n’ọnụnụ pụta.

Ọnụnụ ahụ sikwara n’ikwusa okwu Kristi. Ka m jụọ: Ọ bụ na ha anụbeghị okwu Chineke? N’ezie, ha anụla ya. Dịka Akwụkwọ Nsọ si kwuo, “Ụdaolu ha agazuola ụwa niile, okwu ha eruola nsọtụ ụwa niile.

ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps. 19:1-2, 3-4.

Azịza:  Ozi ha na-eru nsọtụ ụwa niile.

1.Eluigwe na-ekwupụta ebube Chineke

Ihe niile dị na mbara Eluigwe na-ekwupụta ọrụ aka ya,

Ụbọchị niile na-ekwupụta ya,

Abalị ọbụla na-egosịpụta amamiihe nke Chineke. Azịza.

2. Ha anaghị ekwu okwu nke ha na-eme ụzụ nke mmadụ ga-anụ,

Mana olu ha na-agazu ụwa niile.

Ozi ha na-eru nsọtụ ụwa niile. Azịza.

MBEKU

Alleluịa, Alleluịa:

“Sonụ m! Aga m eme ụnụ ndị ọkụ mmadụ.

Alleluịa.

Oziọma – Matiu 4:18-22.

Ihe ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Matiu dere.

Ka Jesu na-aga n’akụkụ osimiri Galili, ọ hụrụ ụmụnne abụọ, Saịmọn onye a na-akpọ Pịta na Andru nwanne ya, ka ha na-awụnye ụgbụ ha na mmiri n’ihina ha bụ ndị ọkụ azụ.

Ọ sị ha, “Sonụ m! Aga m eme ụnụ ndị ọkụ mmadụ” Ozigbo ahụ, ha hapụ ụgbụ ha sobe ya. Mgbe Jesu si ebe ahụ na-aga, ọ hụrụ ụmụnne abụọ ọzọ bụ Jemis na Jọn ụmụ Zebedi, ka ha na nna ha nọ n’ụgbọ mmiri na-emezi ụgbụ ha.

Jesu kpọrọ ha. Ozigbo ahụ ha hapụrụ ụgbọmmiri ha na nna ha sobe ya.

Igbo Mass Readings for December 1 2024, Ụka nke Mbụ N’oge Olileanya Onye Nzọpụta – Afọ Nke Atọ

Igbo Mass Readings for November 30 2024, Emume Ncheta Andru Dị Nsọ, Onye Apostụl

Igbo Mass Readings for November 30 2024, Emume Ncheta Andru Dị Nsọ, Onye Apostụl
Igbo Mass Readings for November 30 2024, Emume Ncheta Andru Dị Nsọ, Onye Apostụl