Igbo Mass Readings for December 8 2025, Nnukwu Emume Ịtụ Ime Marịa dị Ngọzi N’Ejighị Njọ.

Nke a bụ Igbo Mass Readings for December 8 2025, Nnukwu Emume Ịtụ Ime Marịa dị Ngọzi N’Ejighị Njọ.

IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 3:9-15, 20

Ihe Ọgụgụ e wetara n’akwụkwọ Mbido (Jenesis)

Ma Yahweh Chineke kpọrọ nwoke ahụ jụọ ya sị, “Olee ebe ị nọ?” Ọ zara ya sị, “Anụrụ m ụda ụkwụ gị n’ime ogige, ụjọ jidere m n’ihina agba m ọtọ, m wee zoo onwe m.”

Ọ jụrụ ya sị, “Onye gwara gị na ị gba ọtọ? Ị taala mkpụrụ osisi ahụ m nyere gị iwu ka ị ghara ịta?” Nwoke ahụ azaa ya, “Ọ bụ nwaanyị a ị kpọnyere m ka mụ na ya biri, o nyere m mkpụrụ osisi ahụ m taa.”

N”oge a ka Yahweh Chineke jụrụ nwaanyị ahụ, “Gịnị bụ ihe nke a i mere?” Nwaanyị ahụ zara ya, “Agwọ ahụ rafuru m, mụ ataa ya.” Mgbe ahụ ka Yahweh Chineke sịrị agwọ ahụ, “N’ihina i mere ihe nke a, a bụọla gị ọnụ karịa ụmụ anụmaanụ niile dị n’ọhịa na nke dị n’ụlọ; Ị ga-eji afọ gị na-aga ije bịa na-ata aja ụbọchị niile nke ndụ gị.

Aga m eme ka iro dịrị n’etiti gị na nwaanyị a, na n’etiti ụmụ gị na nke ya; ọ ga-azọpịa gị isi ma ị ga-ata ya n’ụkwụ. Nwoke ahụ gụrụ nwunye ya Eve n’ihina ọ bụ nne ndị niile dị ndụ.

ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps. 98: 1, 2-3, 3-4.

Azịza: Kweere Onyenweanyị ukwe ọhụrụ, n’ihina ọ rụrụ ọrụ ebube

1. Kweere Onyenweanyị ukwe ọhụrụ,

n’ihina ọ rụrụ ọrụ ebube,

aka nri ya na aka ya dị nsọ e weterela ya mmeri.

Azịza: Kweere Onyenweanyị ukwe ọhụrụ, n’ihina ọ rụrụ ọrụ ebube

2. Onyenweanyị egosila ike nzọpụta ya,

O meela ka mba niile mata eziomume ya.

O chetala ịhụnaanya ya na ịkwụdosiike ya,

n’ebe ezinụụlọ Izrel nọ.

Azịza: Kweere Onyenweanyị ukwe ọhụrụ, n’ihina ọ rụrụ ọrụ ebube

3. Akụkụ ụwa niile ahụla nzọpụta nke Chineke anyị.

Ụwa niile tijerenụ Onyenwanyị mkpu ọñụ,

werenụ ukwe na mkpu ọñụ too ya.

Azịza: Kweere Onyenweanyị ukwe ọhụrụ, n’ihina ọ rụrụ ọrụ ebube

IHE ỌGỤGỤ NKE ABỤỌ – 1:3-6, 11-22

Ihe Ọgụgụ e wetara n’akwụkwọozi Pọl degaara ndị Efesus

Ngọzi dịrị Chineke na Nna nke Dinwenụ anyị Jesu Kristi, onye sitere n’eluigwe were ngọzi niile nke mmụọ gọzie anyị n’ime Kristi. Ọ họọrọ anyị, n’ime Kristi tupu a tọọ ntọala ụwa, ka anyị dịrị ya nsọ n’enweghị ntụpọ ọbụla n’ihu ya.

O jiri ihụnaanya nye anyị ọnọdụ; ka anyị bụrụ ụmụ ya site na Jesu Kristi dịka ọchịchọ nke uche ya siri dị. Ọ bụ maka mbuli elu nke ngọzi ya dị otito, nke o nyere anyị n’efu n’ime Nwa ya ọ hụrụ n’anya.

N’ime ya, dịka nzube nke ya bụ onye ahụ na-emejupụta ihe niile si dị, nakwa ka ntụpụta nke obi ya siri dị, anyịnwa bụ ndị buru ụzọ chekwube na Kristi. Ndị e merela, họpụtakwa ka ha bie ndụ maka otito nke ebube ya.

MBEKU

ALLELUIA, ALLELUIA:

“Ekele, I jupụtara na grasịa, Osebụrụwa nọnyeere gị. Ị dị ngọzi n’etiti ikporo niile.

ALLELUIA.

OZIỌMA – 1:26-38

Ihe Ọgụgụ e wetara n’Oziọma dị asọ nke Luk dere

N’ọnwa nke isii, Chineke zigara Mmụọọma Gebrel ka ọ gaa n’obodo Galili a na-akpọ Nazaret; ka ọ gakwuru otu nwaagbọghọ na amaghị nwoke, onye ikwunibe ya kwekọrịtara na otu nwoke aha ya bụ Josef, nke si n’agbụrụ Devid ga-alụ.

Aha nwaagbọgbọ ahụ bụ Marịa. Mmụọọma ahụ bịakwute Marịa sị ya, “Ekele, I jupụtara na grasịa, Osebụrụwa nọnyere gị!” Obi lọrọ ya mmiri nke ukwuu n’ụdị ekele a, nke mere na ọ malitere ịtụle n’uche ya ihe ụdị ekele a pụtara.

Mmụọọma ahụ sịrị ya, “Atụla egwu, Marịa, n’ihina Ị natala ngọzi n’aka Chineke. Lee Ị ga-adị ime, mụta nwa nwoke; aha Ị ga-akpọ ya bụ Jesu. Ọ ga-adị ukwuu, a ga-akpọkwa ya nwa onye kacha elu.

Dinwenụ Chineke ga-enye ya ocheeze nna ya Devid. Ọ ga-achị ezinụụlọ Jekọb ebeebe; alaeze ya agaghị enwe ọgwụgwụ.” Marịa jụrụ Mmụọọma ahụ sị, “Olee otu nke a ga-esi mee ebe ọ bụ amaghị m nwoke.”

Ma Mmụọọma ahụ zara ya sị, “Mmụọ Nsọ ga-abịakwasa gị; ike nke onye kacha elu ga-ekpuchi gị. N’ihi nke a, a ga-akpọ nwa ahụ Ị ga-amụ, Onye nsọ, nwa Chineke.

Lee, Elizabet onye ikwu gị, onye ndị mmadụ na-akpọ nwaanyị aga, atụrụla ime n’agadị ya; ugbu a ọ dị ime ọnwa isii. N’ihina ebe Chineke nọ, o nweghị ihe nyịrị omume.”

Marịa kwuru sị, “Lee, abụ m odibo nwaanyị nke Osebụrụwa, ka o reere m ka i siri kwu.” Mmụọọma ahụ wee si n’ebe ọ nọ pụọ.

Igbo Mass readings for December 9 2025, Tuzde Izuụka nke Abụọ n’oge Olileanya Onye Nzọpụta anyị

Igbo Mass Readings for December 8 2025, Nnukwu Emume Ịtụ Ime Marịa dị Ngọzi N’Ejighị Njọ.