Igbo Mass Readings for March 19 2025, Nnukwu Emume Ncheta Joseph dị Asọ – Di Marịa dị Ngọzi.

Nke a bụ Igbo Mass Readings for March 19 2025, Nnukwu Emume Ncheta Joseph dị Asọ – Di Marịa dị Ngọzi.

IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 7:4-5, 12-14, 16

Ihe Ọgụgụ e wetara n’akwụkwọozi abụọ nke Samuel

Yahweh ziri Natan sị, “Jee gwa odibo m, bụ Devid, na m sị ya, Ọ bụ gị ga-arụrụ m ụlọ ebe m ga ebi? Mgbe Ị nwụrụ, elie gị ebe e liri nna gị ha, aga m eme ka otu n’ime ụmụ gị ndị nwoke bụrụ eze.

Aga m emekwa ka alaeze ya guzosie ike. Ya onwe ya bụkwa onye ga-ewuru m ụlọnsọ. Aga m emekwa ka ọchịchị ya dị ebeebe. Aga m abụ nna ya; Ọ ga-abụ kwa nwa m.

Mgbe ọbụla ọ mere ihe ọjọọ, aga m enye ya ahụhụ dịka nna sị adụ nwa ya ọdụ site n’inye ya ahụhụ. Ezinụụlọ gị na alaeze gị ga-adị ebeebe. Aga m akwụdosi ocheeze gị ike ebeebe.”

ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps: 89: 1-2, 3-4, 26, 28.

Azịza: Ọchịchị Nwa nke Devid ga-adị ebeebe ebeebe.

1. Aga m eji ukwe kwupụta ịhụnaanya nke Onyenweanyị ebeebe ebeebe,

bido na ndụdụgandụ ruo na ndụdụgandụ aga m na-ekwupụta ntụ kwasịobi gị.

N’ihina ịhụnaanya gị ga-adị ebeebe,

ikwesi ntụkwasịobi gị ga-akwụdosike dịka igwe.

Azịza: Ọchịchị Nwa nke Devid ga-adị ebeebe ebeebe.

2. Gị kwuru sị, “Mụ na onye m họọrọ agbala ndụ,

añụọrọla m Devid nwodibo m iyi.

Aga m eme ka ọchịchị gị dị ebeebe,

Aga m emekwa ka ocheeze gị digide ruo na ndụdụgandụ niile.

Azịza: Ọchịchị Nwa nke Devid ga-adị ebeebe ebeebe.

3. Ọ ga ebeku m sị, “Ịbụ nna m,

Chineke m na onye enyemaka m.

Aga m ahụ ya n’anya ebeebe,

ọgbụgbandụ mụ na ya ga-adị ọkpụ.

Azịza: Ọchịchị Nwa nke Devid ga-adị ebeebe ebeebe.

IHE ỌGỤGỤ NKE ABỤỌ – 4:13, 16-18

Ihe Ọgụgụ e wetara n’akwụkwọozi Pọl degaara ndị Rom

Nkwa Chineke kwere Abraham na agbụrụ ya na ha ga-eketa ụwa abụghị site n’idebe iwu, kama ọ bụ site n’okwukwe. N’ihi nke a, Chineke mere ka nkwa ahụ dabere n’okwukwe, ka o wee bụrụ ihe mmadụ ga-enweta site n’amara, ka o rutechaa agbụrụ Abraham niile, Ọ bụghị sọ ndị na -edebe iwu, kama ndị niile nwere ụdị okwukwe Abraham, onye bụ nna anyị n’okwukwe.

Dịka Akwụkwọ Nsọ si kwuo; “Emeela m gị nna nke ọtụtụ mba,” n’ihu Chineke, Abraham bụ nna anyị n’okwukwe, onye o tinyere okwukwe ya na ya, onye na-enye ndị nwụrụ anwụ ndụ, na-emekwa ka ihe adịghị adị dịrị.

Abraham nọgidere n’okwukwe na olile anya, ọ bụladị mgbe olile anya adịghị, o wee site na nke a ghọọ “Nna nke ọtụtụ mba.” N’ihina otu a ka a gwara ya n’Akwụkwọ Nsọ, sị, “Ụmụ si n’agbụrụ gị ga-adị ọtụtụ.” N’ihi nke a ka Chineke ji site n’okwukwe “gụọ Abraham n’onye eziomume.”

MBEKU

ALLEUIA, ALLELUIA:

Ha bụ ndị agọziri agọzi, ndị bi n’ụlọ gị na-ekwere gị ukwe otito oge niile.

ALLELUIA.

OZIỌMA – 1:16, 18-21.

Ihe Ọgụgụ e wetara n’Oziọma dị asọ nke Matiu dere

Jekọb mụtara Josef di Marịa bụ nne Jesu, onye a na-akpọ Kristi. Otu a ka esiri mụọ Jesu Kristi: Mgbe ndị ikwunibe kwekọrịtara na Josef ga-alụ Marịa nne Jesu, a hụrụ na Marịa dị ime site na Mmụọ Nsọ tupu ha ebikọọ ọnụ.

Mana di ya bụ Josef, bụ onye eziomume, ọ chọghị imenye ya ihere kama o kpebiri ịchụ ya na nzuzo. Mgbe ọ na-atule ihe ndị a n’obi ya, mmụọọma nke Onyenweanyị bịakwutere ya na nrọ, sị ya, “Josef, nwa Devid, atụla egwu ịkpọrọ Marịa nwunye gị, n’ihina nwa ọ dị ime ya sitere n’ike nke Mmụọ Nsọ. Ọ ga-amụ nwa nwoke, Ị ga-agụ ya Jesu, n’ihina ọ ga-azọpụta ndị nke ya na njọ ha niile.

MA Ọ BỤ

OZIỌMA – 2:41-51

Ihe Ọgụgụ e wetara n’Oziọma dị asọ nke Luk dere

Kwa afọ, nne na nna Jesu na-aga Jerusalem n’oge emume ngabiga. Mgbe Jesu gbara afọ iri na abụọ, ya na nne ya na nna ya soro gaa dịka omenaala si dị; Oge e mechara emume ahụ, ka ha na-alaghachi, nwata ahụ bụ Jesu nọdụrụ na Jerusalem.

Nne na nna ya amataghị. Ha chere na o sonyere n’etiti ndị mmadụ. Ha gara ije otu ụbọchị tupu ha bido chọba ya n’etiti ndị ikwunibe ha na ndị ha maara. Mgbe ha na-achọtaghị ya, ha laghachiri azụ na Jerusalem na-achọgharị ya.

Mgbe ụbọchị atọ gachara, ha hụrụ ya n’ime ụlọnsọ Chineke, ka ọ nọ n’etiti ndị nkuzi na-ege ha ntị na-ajụkwa ha ajụjụ. Nghọta na ọgụgụ isi o ji aza ajụjụ tụrụ ndị niile nụrụ okwu ya n’anya.

Mgbe nne na nna ya hụrụ ya ọ tụrụ ha n’anya. Nne ya wee sị ya, “Nwa m, gịnị mere i ji mee mụ na nna gị otu a? Lee, mụ na nna gị na-achọgharị gị kamgbe.”

Ma ọ zara ha sị, “Gịnị ka ụnụ na-achọgharịrị m, ọ bụ na ụnụ amaghị na-aga m anọrịrị n’ụlọ nna m.” Ha aghọtaghị okwu ọ gwara ha. O soro ha laghachi na Nazaret, na-erubekwara ha isi, nne ya dobere okwu ndị a niile n’obi ya.

Igbo Mass readings for March 20 2025, Tọọzde Izuụka nke Abụọ n’Oge Ncheta Ahụhụ Kristi.

Igbo Mass Readings for March 19 2025, Nnukwu Emume Ncheta Joseph dị Asọ – Di Marịa dị Ngọzi.