Igbo Mass Readings for August 24 2026, Emume Ncheta Bartholomew dị Asọ – Nwaazụ.
Nke a bụ Igbo Mass Readings for August 24 2026, Emume Ncheta Bartholomew dị Asọ – Nwaazụ.
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 21:9-14
Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ Mkpughe
Mgbe ahụ, otu na ime mmụọọma asaa ndị bu ọkwa asaa ahụ jupụtara n’ihe ntaramahụhụ asaa nke ikpeazụ bịakwute m gwa m sị, “Bịa, aga m egosi gị nwaanyị ahụ nke bụ nwunye Nwatụrụ ahụ.
O buuru m n’ime mmụọ buga m na nnukwu ugwu. O gosikwara m obodo nsọ ahụ bụ Jerusalem mgbe o si n’eluigwe ebe Chineke nọ na-agbadata. O jupụtara n’ebube Chineke, na-enwu, na-amụke dịka nkume dịkarịchara oke ọnụ a na-eyi n’olu, dịka nkume Jaspa na-achake dịka nkume enyo Kristal.
Obodo ahụ nwekwara mgbidi dị oke elu, nke nwere ọnụụzọama iri na abụọ; O nwekwara ndị mmụọọma iri na abụọ na-eche ọnụụzọ ama iri na abụọ ahụ nche.
E dekwara aha agbụrụ iri na abụọ nke ụmụ Izrel n’ọnụụzama iri na abụọ ahụ, N’akụkụ ọwụwa anyanwụ nke mgbidi ahụ, ọnụụzọ atọ dị, n’akụkụ ọdịda anyanwụ, ọnụụzọ atọ dịkwa, na akụkụ mgbago ugwu, ọnụụzọ atọ dị, n’akụkụ nke ndịda, ọnụụzọ atọ dịkwa.
E wuru mgbidi obodo ahụ n’elu nkume ntọala iri na abụọ. E dekwara aha ndịozi iri na abụọ nke Nwaatụrụ ahụ n’elu nkume iri na abụọ ahụ.
ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps: 145: 10-11, 12-13, 17-18.
Azịza: Ka mmadụ niile mata ọrụ ịtụnaanya gị niile, na ebube dị elu nke alaeze gị
1. Onyenweanyị, ihe niile i kere ga-ekele gị,
ndị kwere na gị ga-agọzi gị.
Ha ga-ekwupụta ebube nke alaeze gị
ma kwupụtakwa ịdị ike gị.
Azịza: Ka mmadụ niile mata ọrụ ịtụnaanya gị niile, na ebube dị elu nke alaeze gị
2. Ka mmadụ niile mata ọrụ ịtụnaanya gị niile,
na ebube dị elu nke alaeze gị.
Alaeze gị ga-adị ebeebe, ọchịchị gị na-adị na ndụdụgandụ niile,
Onyenweanyị dị ntụkwasịobi n’okwu ya niile,
omume ya niile jupụtara n’obi ebere.
Azịza: Ka mmadụ niile mata ọrụ ịtụnaanya gị niile, na ebube dị elu nke alaeze gị
3. Onyenweanyị dị mma n’ụzọ ya niile,
ọrụ aka ya niile na-egosi ịhụnaanya,
Onyenweanyị nọ ndị niile na-akpọku ya nso,
ndị ji ezi obi na-akpọku ya.
Azịza: Ka mmadụ niile mata ọrụ ịtụnaanya gị niile, na ebube dị elu nke alaeze gị
MBEKU
ALLELUIA, ALLELUIA:
“Rabaị (onyenkuzi), Ị bụ nwa Chineke! Ị bụkwa eze nke Izrel!”
ALLELUIA.
OZIỌMA – 1:45-51.
Ihe Ọgụgụ e wetara n’Oziọma dị asọ nke Jọn dere
Filip chọtara Nataniel sị ya, “Anyị achọtala onye ahụ Mosis dere maka ya n’akwụkwọ iwu, na onye ndị amụma dere banyere, ya bụ Jesu onye Nazaret, nwa Josef.”
Nataniel jụrụ ya sị, “O nwere ihe ọma ọbụla nwere ike isi na Nazaret pụta?” Filip zara ya sị, “Bịa ka Ị hụrụ.” Mgbe Jesu hụrụ Nataniel ka ọ na abịakwute ya, o kwuru maka ya sị, “Lee ezigbo onye Izrel, onye aghụghọ ọbụla na-adịghị n’ime ya!”
Nataniel jụrụ ya sị, “Olee ebe Ị nọ mara m?” Jesu azaa ya sị, “Tupu Filip akpọọ gị mgbe Ị nọ n’okpuru osisi fiig, a hụrụ m gị. Nataniel zara ya sị, “Rabaị (Onyenkuzi), Ị bụ nwa Chineke! Ị bụkwa eze nke Izrel!”
Jesu zara ya sị, “Ọ bụ n’ihina m gwara gị na m hụrụ gị n’okpuru osisi fiig ka I ji kwere? Ị ga-ahụ ihe ịtụnaanya karịrị ndị a.” Ọ sịrị ya, “N’ezie, n’ezie, agwa m gị, Ị ga-ahụ eluigwe ka o meghere, hụkwa ndị Mmụọọma nke Chineke ka ha na-arịgo na-arịdatakwa n’ahụ nwa nke mmadụ.
Igbo Mass Readings for August 24 2026, Emume Ncheta Bartholomew dị Asọ – Nwaazụ.