Igbo Mass Readings for May 14 2025, Emume Ncheta Matịas dị Asọ – Nwaazụ.
Nke a bụ Igbo Mass Readings for May 14 2025, Emume Ncheta Matịas dị Asọ – Nwaazụ.
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 1:15-17, 20-26
Ihe Ọgụgụ e wetara n’Ọrụ Ndịozi
Mgbe ụbọchị olemaole gachara ụmụnna n’ime Kristi ihe ha ka otu narị mmadụ na iri abụọ zukọtara. Pita kwụụrụ n’etiti ha sị, “Ụmụnna m n’ime Kristi, ihe e dere n’Akwụkwọ Nsọ aghaghị imezu, nke Mmụọ Nsọ siri n’ọnụ Devid kwuo n’oge gara aga, banyere Judas Iskarịọt, onye mechara bụrụ onyendu nke ndị jidere Jesu.
Ụnụ maara nke ọma na ọ bụ onye otu anyị, na mbụ o nweburu oke n’ije ozi anyị. E dere ya n’Akwụkwọ Abụọma sị, “Ka ụlọ ya tọgbọrọ n’efu, Ka mmadụ ọbụla ghara ibi na ya.”
E dekwara sị, “Ka onye ọzọ were ọnọdụ ya.” Ya bụ, otu onye n’ime ndị anyị na ha nọ oge niile Jesu nọ n’etiti anyị, bido n’oge Jọn na-eme mmirichukwu ruo ụbọchị Jesu si n’etiti anyị rịgoro n’eluigwe – otu onye n’ime ndị a ga-eso anyị bụrụ onye akaebe nke mbilite n’ọnwụ ya.”
Ha họpụtara mmadụ abụọ Josef onye a na-akpọ Basabas, (nke aha nna ya bụ Jọstus), na Matiyas. Ha ekpee ekpere sị, “Onyenweanyị gị onye maara echiche mmadụ niile, gosị anyị onye Ị họpụtara n’ime mmadụ abụọ ndị a ịnọchi ọnọdụ ije ozi nke a, na ịbụ onye ozi, nke Judas Iskarịọt hapụrụ gaba ebe ọnọdụ kwesịrị ya.”
Ha feere mmadụ abụọ ndị a nza. Nza ahụ mara Matiyas. Ọ banye n’otu ndịozi iri na otu ahụ imezu ọnụ ọgụgụ ha.
ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps:113: 1-2, 3-4, 5-6, 7-8.
Azịza: Onyenweanyị ga enye ha ọnọdụ n’etiti ụmụ ndị eze, ụmụ ndị eze bụ ndị nke ya.
1. Too, ụmụodibo nke Chineke,
too aha nke Onyenweanyị,
Ngọzi dịrị aha nke Chineke,
bido ugbu a ruo mgbe ebighịebi.
Azịza: Onyenweanyị ga enye ha ọnọdụ n’etiti ụmụ ndị eze, ụmụ ndị eze bụ ndị nke ya.
2. Bido n’ọwụwa anyanwụ ruo na odịda ya
otito dịrị aha nke Osebụrụwa!
Onyenweanyị dị elu karịcha ụwa niile,
otito ya karịchakwara eluigwe niile.
Azịza: Onyenweanyị ga enye ha ọnọdụ n’etiti ụmụ ndị eze, ụmụ ndị eze bụ ndị nke ya.
3. Onye dịka Onyenweanyị bụ Chineke anyị?
ocheeze ya dị n’elu,
mana ọ na-eledata anya n’eluigwe na ụwa.
Azịza: Onyenweanyị ga enye ha ọnọdụ n’etiti ụmụ ndị eze, ụmụ ndị eze bụ ndị nke ya.
4. Ọ na-esi n’aja ebuli ndị ogbenye,
ọ na-esikwa na ntụ ewelite ndị enweghị ka ọ dị ha.
Ka o nye ha ọnọdụ n’etiti ụmụ ndịeze,
ụmụ ndị eze bụ ndị nke ya.
Azịza: Onyenweanyị ga enye ha ọnọdụ n’etiti ụmụ ndị eze, ụmụ ndị eze bụ ndị nke ya.
MBEKU
ALLELUIA, ALLELUIA:
Ọ bụghị ụnụ họọrọ m, kama ahọọrọ m ụnụ; wepụtakwa ụnụ iche ka ụnụ gaa mịa ọtụtụ mkpụrụ, mkpụrụ nke ga-anọgide.
ALLELUIA.
OZIỌMA – 15: 9-17.
Ihe Ọgụgụ e wetara n’Oziọma dị asọ nke Jọn dere
Jesu gwara ndị na-eso ụzọ ya sị, “Otu Nna m si hụ m n’anya, ka m si hụ ụnụ n’anya. Nọgidenụ n’ịhụnaanya m. Ọ bụrụ na ụnụ edobe iwu m niile, ụnụ ga-anọgide n’ịhụnaanya m, dịka m si dobe iwu niile nke Nna m, wee nọgide n’ịhụnaanya ya.
Ihe ndị a ka m gwara ụnụ, ka ọñụ ụnụ wee zuo oke. Nke a bụ iwu m nyere ụnụ: ka ụnụ hụrịta onwe ụnụ n’anya, dịka m si hụ ụnụ n’anya. Ọ dịghị onye ọbụla nwere ịhụnaanya karịrị nke a: Na mmadụ ga-atụfu ndụ ya n’ihi ndị enyi ya.
Ụnụ bụ ndị enyi m, ma ọ bụrụ na ụnụ edobe iwu m nyere ụnụ. Anaghị m akpọkwa ụnụ ndị odibo ọzọ, n’ihina odibo anaghi ama ihe Nna ya ukwu na-eme.
Kama ana m akpọzi ụnụ ndị enyi, n’ihina agwala m ụnụ ihe niile m nụrụ n’ọnụ Nna m. Ọ bụghị ụnụ họọrọ m, kama ahọọrọ m ụnụ; wepụtakwa ụnụ iche ka ụnụ gaa mịa ọtụtụ mkpụrụ, mkpụrụ nke ga-anọgide.
Nke a ga-eme ka Nna m nye ụnụ ihe ọbụla ụnụ rịọrọ ya n’aha m. Ya bụ, nke a ka m na-enye ụnụ n’iwu, Hụrịtanụ onwe ụnụ n’anya.”
Igbo Mass Readings for May 15 2025, Tọọzde n’ime Izuụka nke Anọ n’oge Mbilite n’Ọnwụ Kristi
Igbo Mass Readings for May 14 2025, Emume Ncheta Matịas dị Asọ – Nwaazụ.