Igbo Mass Readings for July 22 2025, Emume Ncheta Meri Magdalin dị Asọ.
Nke a bụ Igbo Mass Readings for July 22 2025, Emume Ncheta Meri Magdalin dị Asọ.
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 3:1-4
Ihe Ọgụgụ e wetara n’akwụkwọ Abụ ka Abụ (Song of Solomon)
Elere m anya onye ahụ m hụrụ n’anya n’elu akwa m n’abalị. Achọrọ m ya ma ahụghị m ya. Akpọrọ m ya oku ma ọ zaghị. Aga m ebilite gagharịa n’ime obodo, gaa n’ụzọ ya niile na n’ebe ọgbakọ ya niile.
Aga m achọ ya bụ onye ahụ dị m n’obi. Achọrọ m ya ma ahụghị m ya. Ezutere m ndị nche ka ha na-agagharị n’obodo na-arụ ọrụ ha, m jụọ ha sị, Ụnụ ahụla onye ahụ m hụrụ n’anya?
O teghị aka m hapụchara ha, m chọta onye ahụ dị m n’obi. Ejisiri m ya ike, ekweghị m ahapụ ya ruo mgbe m kpọọrọ ya rute n’ụlọ nne m banye n’ime ụlọ onye mụrụ m.
MA Ọ BỤ
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 5:14-17
Ihe Ọgụgụ e wetara n’akwụkwọozi nke abụọ Pọl degaara ndị Kọrịnt
Ọ bụ ịhụnaanya Kristi na-edu anyị n’ihina anyị kwere na otu onye nwụrụ maka mmadụ niile; nke pụtara mmadụ niile anwụọla. Ọ nwụrụ maka mmadụ niile, ka ndị na-adị ndụ ghara ịdị ndụ maka naanị onwe ha, kama maka onye ahụ nwụrụ n’ihi ha ma sikwa n’ọnwụ kulie.
Bido ugbu a gaba, anyị adịghị elekwasị onye ọbụla anya dịka mmadụ nkịtị. Ọ bụ ezie n’anyị na-ahụ Kristi dịka mmadụ nkịtị na mbụ, ma anyị adịghị ahụ ya otu ahụ ọzọ.
Otu ọ dị, ọ bụrụ na onye ọbụla amalite ịdị ndụ n’ime Kristi, ọ ghọọla onye e kere ọhụrụ, ihe ochie agala, nke ọhụrụ wee nọchie.
ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps: 63: 1, 2-3, 4-5, 7-8.
Azịza: Akpịrị na-akpọ mkpụrụobi m nkụ maka gị, Dinwenụ m na Chineke m.
1. O Chineke, Ị bụ Chineke m, ana m achọ gị,
akpịrị na-akpọ mkpụrụobi m nkụ maka gị,
anụahụ m na-achọ gị.
dịka ala kpọrọ nkụ na-enweghị mmiri.
Azịza: Akpịrị na-akpọ mkpụrụobi m nkụ maka gị, Dinwenụ m na Chineke m.
2. Ọ na-agụ m agụụ ikiri gị n’ebe nsọ gị
na ịhụ ike na otito gị.
ịhụnaanya gị ka mma karịa ndụ n’onwe ya,
ọnụ m ga-ekwupụta otito gị.
Azịza: Akpịrị na-akpọ mkpụrụobi m nkụ maka gị, Dinwenụ m na Chineke m.
3. Aga m eto gị na ndụ m niile,
n’aha gị aga m achili aka m elu;
Mkpụrụobi m ga-enwe nnukwu oriri,
Egwu ọñụ ga-adị n’ọnụ m.
Azịza: Akpịrị na-akpọ mkpụrụobi m nkụ maka gị, Dinwenụ m na Chineke m.
4. N’ihi Ị na-enyere m aka oge niile
ana m ekwe ukwe ọñụ n’okpuru nku gị,
Mkpụrụobi m na-atapara na gị
aka nri gị na-akwado m.
Azịza: Akpịrị na-akpọ mkpụrụobi m nkụ maka gị, Dinwenụ m na Chineke m.
MBEKU
ALLELUIA, ALLELUIA:
Meri, gwa anyị, gịnị ka Ị hụrụ n’ụzọ? Ahụrụ m ebube mbilite n’ọnwụ Kristi na okpokoro ili ya.
ALLELUIA.
OZIỌMA – 20: 1-2, 11-18.
Ihe Ọgụgụ e wetara n’Oziọma dị asọ nke Jọn dere
N’isi ụtụtụ n’ụbọchị mbụ nke izuụka mgbe chi na-abọchabeghị, Meri Magdalin gbara ụzọ bịa n’ili, hụ na e bupụla okwute nke e jiri mechie ọnụụzọ. Ọ gbaara ọsọ bịakwute Saịmọn Pita na nwaazụ ahụ Jesu hụrụ n’anya sị ha, “Ha ebupụla Onyenweanyị n’ili, anyị amaghịkwa ebe ha dotere ya”.
Meri kwụ n’akụkụ ili ahụ, na-ebe akwa. Ka Ọ na-ebe akwa, o hulatara ala leba anya n’ime ili ahụ. Ọ hụrụ ndị Mmụọọma abụọ yi akwa ọcha, ka ha nọdụrụ ala, otu n’isi, nke ọzọ n’ụkwụ, n’ebe ahụ e dotere ozu Jesu.
Ha jụrụ ya sị, “Nwaanyị, gịnị mere i ji ebe akwa?” Ọ zara ha sị, “Ha ebupụla Onyenwe m, ma amaghị m ebe ha dọbara ya. Mgbe o kwuchara nke a, Ọ tụgharịrị hụ Jesu ka ọ kwụ.
Ma ọ maghị na ọ bụ Jesu. Jesu sịrị ya, “Nwaanyị, gịnị mere I ji ebe akwa? Onye ka Ị na-achọ? “Nwaanyị ahụ chere na ọ bụ onye ọrụ ubi wee jụọ ya sị, “Nna m ukwu, ọ bụrụ gị bupụrụ ya, gwa m ebe I dobere ya, ka m gaa buru ya.
Jesu akpọọ ya sị, “Meri” Nwaanyị ahụ atụgharịa zaa ya na Hibru sị “Raboni!” nke pụtara, Onye nkuzi” Jesu gwara ya sị, “E metụkwala m aka, n’ihina arịgokwubeghị m Nna m.
Gakwuru ụmụnna m gwa ha sị, Ana m alakwuru Nna m na Nna ụnụ, Chukwu m na Chukwu ụnụ.” Meri Magdalin bịara gwa ndị na-eso ụzọ Jesu sị, “Ahụla m Onyenweanyị.” Ọ kọọrọ ha na ọ gwara ya ihe ndị a.
Igbo Mass readings for July 23 2025, Wednezde n’ime Izuụka nke Iri na Isii N’Oge Adanyeghị n’Emume.
Igbo Mass Readings for July 22 2025, Emume Ncheta Meri Magdalin dị Asọ.