Igbo Mass Readings for January 25 2025, Emume Ntọgha nke Pọl dị Asọ – Nwaazụ.
Nke a bụ Igbo Mass Readings for January 25 2025, Emume Ntọgha nke Pọl dị Asọ – Nwaazụ.
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 22:3-16
Ihe Ọgụgụ e wetara na Ọrụ Ndịozi
Pọl gwara ha sị, “Abụ m onye Juu. Amụrụ m n’obodo Tasus nke Silisia. Azụrụ m na Jerusalem n’ebe a. Agara m akwụkwọ n’okpuru onye nkuzi Iwu Mosis, bụ Gamaliel.
Anatara m ọzụzụ siri ike n’ime iwu nke nnanna anyị ha. Ejikwa m ịnụ ọkụ n’obi na efe Chineke dịka ụnụ niile si eme ta. Esoburu m hụ na e gburu ndị niile na-eso ụzọ nke a. Ejidere m ha, ụmụnwaanyị na ụmụnwoke, tụba ha n’ụlọmkpọrọ dị icheiche.
Onyeisi nchụaja, na nzukọ ndị okenye ndị Juu niile bụ ndị akaebe m, na anatara m ha ọtụtụ akwụkwọozi inye ndị Juu ibe anyị ndị bi na Damaskọs maka ịkpụta ndị na-eso ụzọ nke a, kee ha agbụ, kpụghachi ha na Jerusalem, ka ha taa ahụhụ kwesịrị ha.”
Mgbe m na aga, na-abịaru nso na Damaskọs, ihe dịka etiti ehihie, oke ihè siri n’eluigwe bịa na mberede, gbuo m amụma gburugburu. Adara m n’ala, nụ otu olu ka ọ na-asị m, Sọl! Sọl! Gịnị mere Ị na esogbu m?
Ajụrụ m ya sị, ‘Ị bụ onye Onyenweanyị? Ọ sịrị m ‘Abụ m Jesu onye Nazaret, onye Ị na esogbu. Ndị mụ na ha so n’ije hụrụ ihe ahụ n’eziokwu, ma ha anụghị olu onye ahụ nke na-agwa m okwu. Ajụrụ m sị: ‘Gịnị ka m ga-eme, Onyenweanyị?
Onyenweanyị sịrị m ‘Bilie, gaa banye Damaskọs, n’ebe ahụ ka a ga-agwa gị ihe niile Chineke kwadobere na Ị ga-eme. Ahụghị m ụzọ, n’ihi nke a, ndị mụ na ha so jidere m n’aka duru m bata Damaskọs.
Otu nwoke bi na Damaskọs, aha ya bụ Ananịyas, nwoke a bụ ezigbo onye na-ekpere Chineke dịka iwu Mosis si dị, onye ndị Juu niile bi na Damaskọs na-asọpụrụ. Nwoke a bịakwutere m guzoro n’akụkụ m sị: ‘Sọl, nwanne m, ka Chineke mee ka ị hụ ụzọ.
N’otu mgbe ahụ, asaghere m anya, hụ ya. Ọ sịrị m, ‘Chineke nke nnanna anyị ha ahọpụtala gị ka Ị mara uche ya, ka Ị hụ onye eziomume ahụ, nụ okwu sị n’ọnụ ya pụta.
N’ihina Ị ga-abụrụ ya onye akaebe n’ebe mmadụ niile nọ, ịgwa ha ihe niile ị hụrụ na nke Ị nụrụ. Ugbu a, gịnị ka Ị na-eche? Bilie, ka e mee gị mmirichukwu, ka a sachapụkwa mmehie gị niile, site n’ịkpọku aha ya.’
MA Ọ BỤ:
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 9:1-22
Ihe Ọgụgụ e wetara na Ọrụ ndịozi
Ugbu a, Sọl ka nọ na-aba mba na ọ ga-egbu ndị na-eso ụzọ Onyenweanyị. Ọ gakwuuru onyeisi nchụaja rịọ ya ka o denye ya akwụkwọ maka ụlọnzukọ ndị Juu nọ na Damaskọs, ka o wee nwee ike ịkpụrụ ụmụnwoke na ụmụnwaanyị niile ọ ga-ahụ na eso ụzọ ahụ, kpụga Jerusalem.
Ka ọ na-abịaru Damaskọs nso, oke amụma gburu, ihè dị egwu achakwasị ya. Ọ dara n’ala, nụ otu olu ka ọ na-asị ya, “Sọl! Sọl! Gịnị mere i ji ebuso m agha?” Sọl ajụọ sị, “Onye ka Ị bụ Onyenweanyị?”
Ọ zaghachiri sị, “Abụ m Jesu, onye ị na-ebuso agha! Bilie, banye n’ime obodo ebe a ga-agwa gị ihe Ị ga-eme.” Ihe a riri ndị ha na Sọl so aga ọnụ. Ha nụrụ olu ahụ ma ha ahụghị onye kwuru ya.
Sọl si n’ala bilie, saghee anya ya, o nweghịkwa ike ịhụ ihe ọbụla. N’ihi nke a, ha sekpụụrụ ya n’aka dubata ya na Damaskọs. Ọ hụghị ụzọ ụbọchị atọ. O righị ihe ọbụla nke ọ na-añụ ihe ọñụñụ.
Enwere otu onye na-eso ụzọ Jesu bi na Damaskọs a na-akpọ Ananịyas. Onyenweanyị kpọrọ ya oku n’ọhụ sị, “Ananịyas!” Ọ zaa ya sị, “Lee m, Onyenwe m!” Onyenweanyị sịrị ya, “Bilie, gaa n’ama ahụ a na-akpọ ụzọ kwụ ọtọ.
Ị garuo jụọ n’ụlọ nwoke a na-akpọ Judas, maka otu nwoke onye Tasọs, aha ya bụ Sọl. Ọ nọ ebe ahụ ugbu a na-ekpe ekpere, ọ hụrụ ọhụ ebe otu nwoke a na-akpọ Ananịyas batara, bikwasa ya aka n’isi ka ọ hụbakwa ụzọ.”
Ananịyas zara sị, “Onyenweanyị, ọtụtụ mmadụ akọọrọla m ọtụtụ ihe maka nwoke a, banyere ihe ọjọọ na arụrụ ala ọ rụrụ n’ebe ndị nsọ gị na Jerusalem nọ.
Ugbu a, ọ natara ike n’aka ndịiisi nchụaja iji jide ndị niile na-akpọku aha gị.” Onyenweanyị zara ya sị, “Gaba! N’ihina ahọpụtala m ya ka ọ bụrụ ngwaọrụ m, onye ga-ebugara mba ndị amaghị Chineke, ndị eze na ụmụ Izrel aha m.
Aga m egosi ya na ọ ga-atarịrị ahụhụ n’ihi aha m. Ananịyas gabara, banye n’ụlọ ahụ, bikwasa Sọl aka n’isi sị, “Sọl, nwanne m! Onyenweanyị Jesu, onye mere ka ị hụ ya anya n’ụzọ I si bịa, zitere m, ka m mee ka Ị hụkwa ụzọ ọzọ, jupụtakwa na Mmụọ Nsọ.”
Ozigbo ahụ, ihe dịka mkpekere azụ siri ya n’anya dapụ. Ọ hụbakwa ụzọ ọzọ, o bilizie mee ya mmirichukwu. O rie nri, nwetakwa ume. Sọl nọnyeere ndị na-eso ụzọ Jesu ụbọchị olemaole na Damaskọs.
N’atụfụghị oge, ọ gagharịrị n’ụlọ nzukọ niile nke ndị Juu na-ekwusa maka Jesu na-asị, “Ọ bụ Nwa nke Chineke.” Ọ gbara ndị niile nụrụ okwuchukwu Sọl gharịị, nke na ha jụrụ sị, “Ọ bụ na ọ bụghị nwoke a bụ onye ahụ na-emekpa ndị niile na kpọku aha a ahụ na Jerusalem?
Ọ bụ maka nke a ka o ji bịa ebe a ịkpụrụkwa ha kpụgara ndịisi nchụaja.” Sọl dịwanyere ike n’okwuchukwu ya; ụzọ pụrụ iche o si egosi na Jesu bụ Kristi ahụ, gbara ndị Juu bi na Damaskọs gharịị.
ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps. 117: 1,2.
Azịza: Gaanụ na mba niile, gbaasa oziọma nke Onyenweanyị
1. Toonụ Onyenweanyị, mba niile,
Toonụ ya, ndị mmadụ niile.
Azịza: Gaanụ na mba niile, gbaasa oziọma nke Onyenweanyị
2. N’ihina ịhụnaanya ya siri ike,
nkwụdosiike ya na-adị ọkpụ.
Azịza: Gaanụ na mba niile, gbaasa oziọma nke Onyenweanyị
MBEKU
ALLELUIA, ALLELUIA:
Ọ bụghị ụnụ họọrọm, kama a họọrọ m ụnụ; wepụtakwa ụnụ iche ka ụnụ gaa mịa ọtụtụ mkpụrụ: mkpụrụ nke ga-anọgide.
ALLELUIA.
OZIỌMA – 16:15-18.
Ihe Ọgụgụ e wetara n’Oziọma dị asọ nke Mak dere
Jesu bịakwutere ụmụazụ iri na otu sị ha: “Gaanụ n’ụwa niile, kwusaaranụ ihe niile e kere eke oziọma. Onye nke kwerenụ, e mekwaa ya mmirichukwu, ka a ga-azọpụta, ma onye nke na-ekwenyeghị ka a ga-ama ikpe.
Ihe ịrịbaama ndị a ga-esokwa ndị kwerenụ: ha ga-achụpụ ajọ mmụọ n’aha m; ha ga ekwu okwu n’asụsụ dị icheiche. Ọ bụrụ na ha achịrị agwọ n’aka, mọbụ ñụọ ihe ọbụla na-eweta ọnwụ, ọ gaghị emerụ ha ahụ. Ha ga-ebikwasakwa ndị ọrịa aka, ahụ ha adịkwa ha mma.”
Igbo Mass Readings for January 26 2025, Ụka nke Atọ n’Oge Na-Adanyeghị N’Emume – Afọ nke Atọ
Igbo Mass Readings for January 25 2025, Emume Ntọgha nke Pọl dị Asọ – Nwaazụ.