Igbo Mass Readings for June 16 2023, Nnukwu Emume nke Obi dị Asọ nke Jesu – Afọ nke Mbụ.

Nke a bụ Igbo Mass Readings for June 16 2023, Nnukwu Emume nke Obi dị Asọ nke Jesu – Afọ nke Mbụ.

IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 7:6-11

Ihe Ọgụgụ e wetara n’akwụkwọ Deuterọnọmi

N’ihina ụnụ bụ ndị dị nsọ nke Yahweh, bụ Chineke ụnụ, O siri n’etiti mba niile nke ụwa họpụta ụnụ ka ụnụ bụrụ ndị nke ya pụrụ iche. Ọ bụghị na ụnụ ka mba niile n’ụbara mmadụ, ka Yahweh jiri hụ ụnụ n’anya, wee họpụta ụnụ.

Mba!, ụnụ dịkarịchara nta n’etiti mba niile nke ụwa. Ọ bụ maka na Chineke hụrụ ụnụ n’anya, na ka o mezuo nkwa ahụ O kwere nnanna ụnụ ha, ka O ji were ike aka ya gbapụta ụnụ n’aka Fero nke ljipt ebe ụnụ bụ ndị ohu.

Ya mere, maranụ na Yahweh, bụ Chineke ụnụ, bụ Chineke n’ezie! Chineke nke na-edobe ọgbụgbandụ ya na ịhụnaanya ya n’ebe ndị niile hụrụ ya n’anya, na-edobekwa iwu ya nọ ruo na puku kwuru puku ọgbọ ha.

Ma Ọ naghị ala azụ inye ndị kpọrọ ya asị ntaramahụhụ. Ya mere, ụnụ ga-akpachara anya na-edobe iwu niile m nyere ụnụ taa.

ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps. 103:1-2, 3-4, 6-7, 8, 10

Azịza: Ịhụnaanya nke Onyenweanyị n’ebe ndị na-atụrụ ya egwu nọ n’adị ebeebe.

1. Gozie Onyenweanyị, mkpụrụobi m,

gozie aha ya dị nsọ, ihe niile dị n’ime m!

Gọzie Onyenweanyị, mkpụrụobi m,

echezọkwala obi ebere ya niile. Azịza.

2. Ọ na-agbaghara njọ gị niile,

ma gwọọ ọrịa gị niile,

ọ na-esi n’olulu azọpụta ndụ gị,

ọ na-eji ịhụnaanya na obi ebere kpube gị okpueze. Azịza.

3. Osebụrụwa dị ebere na ịhụnaanya,

ọ naghị ewe iwe ngwa ngwa,

ịhụnaanya ya dị ukwuu.

Ọ naghị emeso anyị, ọ naghị ata anyị ahụhụ,

dịka amamikpe anyị na njọ anyị si dị. Azịza.

IHE ỌGỤGỤ NKE ABỤỌ – 4:7-16

Ihe Ọgụgụ e wetara n’akwụkwọozi Jọn nke mbụ

Ndị m hụrụ n’anya, ka anyị hụrịtanụ onwe anyị n’anya, n’ihina ịhụnaanya si na Chineke pụta. Onye ọbụla nwere ịhụnaanya bụ nwa nke Chukwu. Ọ makwaara Chukwu.

Onye na-enweghị ịhụnaanya amaghị Chukwu, n’ihina Chukwu bụ ịhụnaanya. Otu a ka ịhụnaanya Chineke si pụta ihè n’ebe anyị nọ, na o zitere naanị otu Nwa ya n’ụwa ka anyị nwee ndụ site na ya.

N’ụdị a ka ịhụnaanya dị: Ọ bụghị na anyị ahụla Chineke n’anya, kama, ọ hụrụ anyị n’anya ma zite Nwa ya, ka ọ bụrụ onye a ga-esi n’aka ya gbaghara njọ anyị.

Ndị m hụrụ n’anya, ebe ọ bụ na Chineke hụrụ anyị n’anya otu a, anyị kwesịkwara ịhụrịta onwe anyị. O nwebeghị onye hụrụla Chineke. Ọ bụrụ na anyị hụrịta onwe anyị n’anya, Chineke na-anọgide n’ime anyị, ma na-emekwa ka ịhụnaanya ya zuo oke n’ime anyị.

Otu a ka anyị ga-esi mara na anyị bi n’ime ya, ya onwe ya ebiri n’ime anyị n’ihina o nyela anyị Mmụọ ya. Anyị ahụla, na-agbakwa akaebe na Nna ezitela Nwa ya ka ọ bụrụ onye nzọpụta nke ụwa.

Onye ọbụla na-ekwupụta na Jesu bụ nwa Chineke, Chineke na-ebi n’ime ya, ya onwe ya na-ebikwa n’ime Chineke. Anyị maara, ma kwerekwa n’ịhụnaanya Chineke nwere n’ebe anyị nọ.

Chineke bụ ịhụnaanya, onye ọbụla na-anọgide n’ịhụnaanya na-anọgide na Chineke, Chineke na-anọgidekwa n’ime ya.

MBEKU – Matiu 11:29

Alleluia, Alleluia:

Nyaranụ ịnyagba nke m n’olu ụnụ, n’ihina adị m nwaayọ dịkwa obi umeala.

Alleluia

OZIỌMA – 11:25-30

Ihe Ọgụgụ e wetara n’Oziọma dị asọ nke Matiu dere

N’oge ahụ Jesu kwuru sị,” Ana m ekele gị Nna Dinwenụ nke eluigwe na ụwa, n’ihina i kpugheere ụmụntakịrị ihe ndị a i zonahụrụ ndị amamihe na ndị okemmụta.

Ee, Nna, otu a ka o siri masị gị. Nna m ahanyela m ihe niile n’aka, o nweghị onye ọbụla maara Nwa ahụ ma e wezuga Nna. Ọ dịghịkwa onye ọbụla maara Nna ma e wezuga Nwa, ya na onye ọbụla Nwa ahụ chọrọ ka ọ mara ya.

Bịakwutenụ m ụnụ niile ndị na-adọgbu onwe ụnụ n’ọrụ na ndị e boro ibu dị arọ, aga m enye ụnụ ezumike. Nyaranụ ịnyagba nke m n’olu ụnụ; mụtakwanụ ihe n’omume m, n’ihina adị m nwaayọ dịkwa obi umeala.

Ụnụ mee otu a, obi ụnụ ga-enweta ezumike. N’ihina ịnyagba m dị mfe, ibu m adịghịkwa arọ.

Igbo Mass readings for June 17 2023, Satọde n’ime Izuụka nke Iri N’Oge Adanyeghị n’Emume MAỌBỤ Ncheta Obi Marịa na-ebughị Atụtụ Njọ.

TO ALL OUR READERS

Please don’t scroll past this. If you donate just ₦2000, or whatever you can, Online Catholic Lectionary could keep thriving for years. Take a minute to donate. Show the world that access to Online Catholic Lectionary matters to you and saves you from frequent buying of printed bulletin. Thank you.

Igbo Mass Readings for June 16 2023, Nnukwu Emume nke Obi dị Asọ nke Jesu – Afọ nke Mbụ.