Igbo Mass Readings for June 24 2025, Nnukwu Emume nke Ọmụmụ Jọn Ome Mmirichukwu.

Nke a bụ Igbo Mass Readings for June 24 2025, Nnukwu Emume nke Ọmụmụ Jọn Ome Mmirichukwu.

IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 49:1-6

Ihe Ọgụgụ e wetara n’akwụkwọ onye Amụma Aịzaya

Geenụ m ntị, O, ala ndị dị n’akụkụ mmiri, ụnụ ndị bi ebe tere aka, geenụ ntị. Chineke họọrọ m site n’afọ nne m, ọ kpọrọ m aha tupu a mụọ m. O meela ọnụ m ọ dị nkọ ka mmagha.

O zoro m n’okpuru aka ya; o mere m ka m bụrụ akụ a pịrị nke ọma; ọ na-echekwa m n’ime ọbọ ya. Ọ sịrị m “Ị bụ nwaodibo m, Izrel, onye m ga-esi na ya nweta otito.

Maka ekwuru m sị, ataala m ahụhụ lara n’iyi, emefuola m ike m n’ihe na-abaghị uru; mana ihe nketa m dị n’Osebụrụwa. Ụgwọ ọrụ m dị na Chineke.

Ma ugbu a Yahweh, onye kpụrụ m n’ime afọ nne m, ka m bụrụ nwodibo ya, ka m kpọghachiri ya Jekọb azụ, ka m chịkọtara ya Izrel, maka na-enwere m nsọpụrụ n’ihi ya, onye bụ ike m, kwuru sị, “Ọ bụghị naanị na ị bụ nwodibo m ka i were kpọlite agbụrụ Jekọb kpọghachi ụmụ Izrel ndị fọdụrụnụ; Aga m eme gị ihe nke mba niile ka nzọpụta were ruo na nsọtụ nke ụwa.

ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps 139: 1-3, 13-14, 14-15

Azịza: Ana m ekele gị maka ihe ịtụnaanya dị n’okike I kere m.

1. Onyenweanyị I nyochaala m, marakwa m!

Ị ma mgbe m nọdụrụ ala na mgbe m kwụ ọtọ;

Ị na-anọ ebe dị anya mara ihe m bu n’uche,

Ị mazuru omume m niile,

mgbe m na-arụ ọrụ mọbụ mgbe m na-ezu ike.

Azịza: Ana m ekele gị maka ihe ịtụnaanya dị n’okike I kere m.

2. Ọ bụ gị kere mmụọ m,

Ọ bụkwa gị kpụrụ m n’afọ nne m,

Ana m ekele gị maka ihe omimi ndị a,

maka ihe ịtụnaanya dị n’okike I kere m,

nakwa ihe ebube dị n’aka ọrụ gị niile.

Azịza: Ana m ekele gị maka ihe ịtụnaanya dị n’okike I kere m.

3. Ị maara m nke ọma!

Ị maara otu ọkpụkpụ m miile siri dị oge a na-akpụ m na nzuzo,

oge a na-ejikọta m ọnụ n’afọ nne m.

Azịza: Ana m ekele gị maka ihe ịtụnaanya dị n’okike I kere m.

IHE ỌGỤGỤ NKE ABỤỌ – 13:22-26

Ihe Ọgụgụ e wetara n’Ọrụ Ndịozi

Pọl kwuru sị, mgbe Chineke wepụrụ Sọl na ọchịchi. Ọ kpọlitere Devid ka ọ bụrụ eze ha, onye ọ gbaara akaebe, sị, “Ahụla m Devid nwa Jese dịka ụdị mmadụ m chọrọ, onye ga-eme ihe niile bụ uche m.

Ọ bụ site n’ụmụụmụ nwoke a ka Chineke si wetara ụmụ Izrel onye nzọpụta dịka o si kwee na nkwa. Tupu ọbịbịa ya, Jọn ekwusaarala ndị Izrel banyere mmirichukwu nke nchegharị.

Na ngwụcha ọrụ Jọn, o kwuru sị, “Onye ka ụnụ chere na m abụ? Abụghị m onye ahụ ụnụ na-atụ anya ya. Kama leenụ! otu onye na-esochi m n’azụ, onye mụ etorughị ịtọpụ eriri akpụkpọụkwụ ya.

Ụmụnne m ndị si na agbụrụ Abraham, na ndị niile na-atụ egwu Chineke nọ n’etiti ụnụ, Ọ bụ anyị niile ka Chineke ziteere ozi nzọpụta nke a.

MBEKU

ALLELUIA, ALLELUIA:

Ma gị bụ nwa, ka m ga-akpọ onye amụma nke onye kacha elu; N’ihina Ị ga-aga n’ihu Dinwenụ idoziri ya ụzọ ya niile.

ALLELUIA.

OZIỌMA – 1:57-66, 80

Ihe Ọgụgụ e wetara n’Oziọma dị asọ nke Luk dere

Ugbu a, oge ruru mgbe Elizabet ga-eji mụọ nwa, o wee mụọ nwa nwoke. Mgbe ndị agbataobi na ndị ikwu na ibe ya nụrụ na Dinwenụ egosịla ebere ya n’ebe ọ nọ, ha sooro ya ñụrịa ọñụ.

N’ụbọchị nke asatọ ha zukọrọ ibi nwata ahụ ugwu, ha gaara akpọ ya Zakarịa, aha nna ya. Ma Elizabet zara sị, “Mba; a ga-akpọ ya Jọn.” Ha azaa ya sị, “O nweghị onye ọbụla n’ime ndị ikwu na ibe gị na-aza aha dị otu a.”

Ha meere nna ya akara ka ha mara aha ọ chọrọ ka a kpọọ nwa ya. O wee rịọ ka enye ya ihe eji ede akwụkwọ. O dere, “Aha ya bụ Jọn.” Nke a tụrụ ha niile n’anya.

Ozigbo ahụ ọnụ ya meghee, ire ya tọghepụ, ọ bịa kwube okwu, na-agọzi Chineke. Ụjọ tụrụ ndị agbataobi ha niile. Ndị mmadụ kwusara ihe ndị a n’obodo niile nke Judịa;

Ndị niile nụrụ ihe merenụ chebaara ihe ndị a echiche, na-ajụ sị, “Gịnị ka nwatakịrị a ga-abụ?” N’ihina ike nke Dinwenụ nọnyeere ya. Nwata ahụ toro, bịa dịkwa ike na mmụọ. Ọ nọrọ n’ime ọzara ruo ụbọchị ọ pụtara ihe n’ihu ụmụ Izrel.

Igbo Mass Readings for June 25 2025, Wenezde Izuụka nke Iri na Abụọ N’Oge Adanyeghị n’Emume

Igbo Mass Readings for June 24 2025, Nnukwu Emume nke Ọmụmụ Jọn Ome Mmirichukwu.