Igbo Mass Readings for September 8 2025, Emume nke Ọmụmụ nke Vegin Marịa dị Ngọzi.

Nke a bụ Igbo Mass Readings for September 8 2025, Emume nke Ọmụmụ nke Vegin Marịa dị Ngọzi.

IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 5:1-4

Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ Onye Amụma Maịka

Ugbu a e jirila mgbidi gbaa gị gburugburu. Ha ebusola gị agha, ha ga-akụ onye ọchịchị nke Izrel mkpara igwe na ntị. Mana gị, Betlehem, Efreta, gị obodo kacha dị nta na Juda, site na gị ka onye ọchịchị nke Izrel n’ọdịniihu ga-esi pụta, ọ bụ onye dịịrị site na mgbe ochie, dịrịkwa site na mbụ.

Site ugbu a gaba, Chineke ga-ahapụ ha ruo mgbe nwaanyị ahụ nke ime na-eme ga-amụ nwa ya. N’oge ahụ ka ndị agbụrụ ya ka dị ndụ, ga-alaghachikwute ndị Izrel.

Ọ ga-ewere ọnọdụ ya, ma jiri ike na ebube aha nke Chineke zụọ ha. Ha ga-anọ n’udo, n’ihina ebube ya ga-agbasa ruo n’akụkụ obodo a niile site ugbu a gaba n’ihu.

MA Ọ BỤ:

IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 8:28-30

Ihe Ọgụgụ e wetara n’akwụkwọozi Pọl degaara ndị Rom

Anyị ma na Chineke na-eme ihe niile maka ọdịmma ndị niile hụrụ ya n’anya bụ ndị Ọ kpọrọ dịka O si chọọ.

N’ihina ndị O buru ụzọ mara, họpụtakwa, O kenyere ha oke dị iche inwe ụdị oyiyi Nwa ya, ka Nwa ya wee bụrụ onye e buru ụzọ mụọ n’etiti ọtụtụ ụmụnna.

Ndị ahụ Chineke buru ụzọ mara, ka Ọ kpọrọ, ndị ahụ Ọ kpọrọ ka Ọ gụrụ na ndị eziomume, ndị ahụ Ọ gụrụ na ndị eziomume ka O nyekwara otito.

ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps 13: 5, 5.

Azịza: Aga m enwe nukwu ọñụ n’ime Osebụrụwa.

1. Mana mụ onwe m nwere nchekwube n’ịhụnaanya gị,

Onyenweanyị ka mkpụrụobi m ñụrịa n’enyemaka nzọpụta gị.

Azịza: Aga m enwe nukwu ọñụ n’ime Osebụrụwa.

2. Aga m ekwere Onyenweayị ukwe

maka ihe ọma nke O meere m.

Azịza: Aga m enwe nukwu ọñụ n’ime Osebụrụwa.

MBEKU

ALLELUIA, ALLELUIA:

Atụrụ m na-anụ olu m, amakwaara m ha, ha na-esokwa m.

ALLELUIA

OZIỌMA – 1:1-16, 18-23.

Ihe Ọgụgụ e wetara n’Oziọma dị asọ nke Matiu dere

Nke a bụ usoro agbụrụ Jesu Kristi, nwa Devid onye si n’agbụrụ Abraham. Abraham mụrụ Aịzik, Aịzik amụta Jekọb, Jekọb wee mụta Juda na ụmụnne ya.

Juda mụtara Perez na Zera ndị nne ha bụ Tama, Perez amụta Hezrọn; Hezrọn wee mụta Ram, Ram mụtara Aminadab, Aminadab amụta Nashọn, Nashọn wee mụta Salmọn Salmọn mụtara Boaz onye nne ya bụ Rahab, Boaz amụta Obed onye nne ya bụ Rut, Obed wee mụta Jese, onye bụ nna eze Devid.

Devid mụtara Solomọn site n’aka nwunye ya Uria. Solomọn mụtara Rehoboam, Rehoboam amụta Abija, Abija wee mụta Asa. Asa mụtara Jehoshafat, Jehoshafat amụta Joram, Joram amụta Uziya, Uziya mụtara Jotam, Jotam amụta Ahaz, Ahaz wee mụta Hezekaya, Hezekaya mụtara Manase, Manase amụta Emọn, Emọn wee mụta Josaya, onye nke mụtara Jekonaya na ụmụnne ya, n’oge a dọkpụụrụ ụmụIzrel n’agha jee Babịlọn.

Mgbe a dọtachara ụmụIzrel n’agha jee Babịlọn, Jekonaya mụtara Shealtiel, Shealtiel wee mụta Zerubabel, Zerubabel mụtara Abiud, Abiud amụta Eliakim, Eliakim wee mụta Azọ.

Azọ mụtara Zadọk, Zadọk amụta Akim. Akim wee mụta Eliud, Eliud mụtara Elieza, Elieza amụta Matan, Matan wee mụta Jekọb, Jekọb mụtara Josef di Marịa bụ nne Jesu, onye a na-akpọ Kristi.

Otu a ka e siri mụọ Jesu Kristi: Mgbe ndị ikwunibe kwekọrịtara na Josef ga-alụ Marịa nne Jesu, a hụrụ na Marịa dị ime site na Mmụọ Nsọ tupu ha ebikọọ ọnụ.

Mana di ya bụ Josef, bụ anye eziomume, Ọ chọghị imenye ya ihere kama o kpebiri ịchụ ya na nzuzo. Mgbe ọ na-atụle ihe ndị a n’obi ya, mmụọọma nke Onyenweanyị bịakwutere ya na nrọ, sị ya, Josef, nwa Devid, atụla egwu ịkpọrọ Marịa nwunye gị, n’ihina nwa ọ dị ime ya sitere n’ike nke Mmụọ Nsọ.

Ọ ga-amụ nwa nwoke, ị ga-agụ ya Jesu, n’ihina ọ ga-azọpụta ndị nke ya na njọ ha niile.” Ihe niile ndị a mere iji mejupụta ihe Yahweh kwuru site n’olu onye amụma sị: “Lee, otu nwaaghọghọ na-amaghị nwoke ga-adị ime, mụta nwa nwoke. A ga-agụ ya Ịmanuel” (nke pụtara, Chineke nọnyeere anyị).

Igbo Mass readings for September 9 2025, Tuezde n’ime Izuụka nke Iri Abụọ na Atọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.

Igbo Mass Readings for September 8 2025, Emume nke Ọmụmụ nke Vegin Marịa dị Ngọzi.