Igbo Mass Readings for June 29 2025, Nnukwu Emume Pita na Pọl dị Asọ – Ụmụazụ.

Nke a bụ Igbo Mass Readings for June 29 2025, Nnukwu Emume Pita na Pọl dị Asọ – Ụmụazụ.

IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 12:1-11

Ihe Ọgụgụ e wetara n’Ọrụ Ndịozi

N’oge a, Eze Herọd malitere ịkpagbu ụfọdụ n’ime ndị otu Kristi. O jiri mmaagha gbuo Jemis nwanne Jọn. Mgbe ọ hụrụ na ihe o mere tọrọ ndị Juu ụtọ, Ọ gara n’ihu jide Pita.

Nke a mere n’oge ndị Juu na-eme Emume Achịcha Ekoghịeko. Ka o jidechara ya, o tinyere ya n’ụlọ mkpọrọ, mee ka ndị agha iri na isii na-eche ya, anọ anọ na otu oge.

Herọd bu n’obi ịkpọpụta ya ka e kpee ya ikpe n’ihu ndị mmadụ oge Emume Ngabiga gachara. Ka Pita nọ na mkpọrọ, nzukọ Kristi niile nọsiri ike na ekpere n’arịọ Chineke ka a hapụ Pita.

N’abalị ga-abụ ụbọchị Herọd na-ezube ịkpọpụta ya ka e kpee ya ikpe, Pita nọ na-arahụ ụra n’etiti ndị agha abụọ. E ji mkpọrọ igwe abụọ kee ya n’ụkwụ.

Ndị nche nọkwa na nche n’ọnụụzọ ụlọmkpọrọ. Na mberede, Mmụọọma nke Chineke bịakwutere ya, ihe wee dị n’ụlọ mkpọrọ ahụ, Mmụọọma ahụ kpatụrụ Pita aka n’akụkụ, kpọtee ya sị, “Bilie ọsọọsọ!” mkpọrọ igwe e kere ya n’aka abụọ dapụrụ, mmụọọma ahụ sịrị ya, “Yiri akwa gị na akpụkpọ ụkwụ gị.”

O mere nke a. Ọ gwara ya ọzọ sị, “Yirikwa uwe ukwu gị, sobe m!” Pita sooro ya pụta n’ụlọ mkpọrọ. O chere na Ọ na-ahụ ọhụ, ọ mataghị na ihe Mmụọọma ahụ na-eme bụ ezie.

Mgbe ha gafechara onye nche nke mbụ na nke abụọ, ha rutere n’ọnụụzọ ama igwe nke e si abanye n’ime obodo. Ọnụụzọ igwe ahụ ji aka ya meghee n’onwe ya.

Ha gafere pụta n’otu ụzọ nta, Mmụọọma ahụ ahapụ ya ozigbo. Pita matara onwe ya, kwuo sị, “Ugbu a, o weela m anya na Onyenweanyị zitere mmụọọma ya ka Ọ zọpụta m n’aka Herọd na n’ihe niile ndị Juu na-atụ anya ya”.

ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps: 34: 1-2, 3-4, 5-6, 7-8.

Azịza: Mmụọọma nke Onyenwwanyị na-eche ndị na-atụ ya egwu nche; Ọ na-azọpụta ha.

1. Aga m eto Onyenweanyị oge niile,

otito ya ga-adị n’egbugbere ọnụ m mgbe ọbụla,

Mkpụrụobi m na-egori n’Onyenweanyị.

ka ndị umeala nụrụ ma ñụrịa.

Azịza: Mmụọọma nke Onyenwwanyị na-eche ndị na-atụ ya egwu nche; Ọ na-azọpụta ha.

2. Soronụ m kwupụta ịdịukwu nke Onyenweanyị.

Soronụ m too aha ya,

akpọturu m Onyenweanyị, Ọ zaam,

Ọ zọpụtara m n’egwu niile na-atụ m.

Azịza: Mmụọọma nke Onyenwwanyị na-eche ndị na-atụ ya egwu nche; Ọ na-azọpụta ha.

3. Ihu ọbụla chere na-ebe Onyenweanyị  na-amụke amụke,

Ihere anaghị eme ya ma ọlị

Onyenweanyị na-anụ nkpu akwa nwa ogbenye,

Ọ na-enyekwara ya aka na nsogbu ya niile.

Azịza: Mmụọọma nke Onyenwwanyị na-eche ndị na-atụ ya egwu nche; Ọ na-azọpụta ha.

4. Mmụọọma nke Onyenweanyị na-eche ndị na-atụ ya egwu nche;

Ọ na-azọpụta ha;

Detụ ire ka ị hụ ka Onyenweanyị si dị mma!

Añụrị na-adịrị onye gbabara n’Onyenweanyị.

Azịza: Mmụọọma nke Onyenwwanyị na-eche ndị na-atụ ya egwu nche; Ọ na-azọpụta ha.

IHE ỌGỤGỤ NKE ABỤỌ – 4:6-8, 17-18

Ihe Ọgụgụ e wetara n’akwụkwọozi nke abụọ Pọl degaara Timoti

Adị m njikere ruo n’iji m chụọ aja, oge ụla m ezuola. Alụọla m ezigbo ọgụ, agbaruola m ọsọ ahụ n’isi, akwụdosiela m ike n’okwukwe. Site ugbu a e doberela m okpu eze nke eziomume, nke Onyenweanyị, ezi onye ọkaikpe ga-enye m n’ụbọchị ahụ.

Ọ bụghị naanị m ka Ọ ga-enye okpu eze ahụ, Ọ ga-enyekwa ya ndị niile ji ịhụnaanya na-eche ọbịbịa ya. Ma Onyenweanyị nọnyeere m, nye m ike ikwusa oziọma ahụ n’uju, ka ndị mba ọzọ nụ ya.

Ma Chineke zọpụtara m n’ọnụ ọdụm. Onyenweanyị ga-anapụta m n’ihe ọjọọ niile ma zọpụtakwa m maka alaeze eluigwe ya. Ka otito dịrị aha ya ebeebe ebeebe. Amen.

MBEKU

ALLELUIA, ALLELUIA:

Ngị bụ Pita, n’elu okwute a ka m ga-arụkwasị nzukọ m, ọnụụzọ ọkụmmụọ agaghị emerinata ya.

ALLELUIA.

OZIỌMA – 16: 13-19.

Ihe Ọgụgụ e wetara n’Oziọma dị asọ nke Matiu dere

Mgbe Jesu bịaruru n’obodo Sizeria Filipi, Ọ jụrụ ndị na-eso ụzọ ya sị, “Onye ka ndị mmadụ na-ekwu na Nwa nke mmadụ bụ?” Ha sịrị ya, “ụfọdụ na-ekwu na ọ bụ Jọn onye na-eme mmirichukwu.

Ndịọzọ na-ekwu na ọ bụ Elaija. Ma ndịọzọ na-ekwu na ọ bụ Jeremaya mọbụ otu onye n’ime ndị amụma. Ma Ọ jụrụ ha sị, “Onye ka ụnụ na-ekwu na m bụ?”

Saịmọn Pita zara ya sị, “Ị bụ Kristi, nwa nke Chukwu dị ndụ.” Jesu wee zaa ya sị, “Ị bụ onye a gọziri agọzi Saịmọn nwa Jona! N’ihina ọ bụghị mmadụ kpugheere gị eziokwu nke a, kama ọ bụ Nna m nke bi n’eluigwe.

Ya bụ, agwa m gị, ngị bụ Pita, n’elu okwute a ka m ga-arụkwasị nzukọ m, ọnụụzọ ọkụmmụọ agaghị emerinata ya. Aga m achịnye gị mkpịsịigodo nke Alaeze eluigwe.

Ihe ọbụla nke Ị ga-eke agbụ n’elu ụwa, a ga-ekekwa ya n’eluigwe, ihe ọbụla Ị ga-atọpụ agbụ n’elu ụwa, a ga-atọpụkwa ya n’eluigwe.

Igbo Mass readings for June 30 2025, Mọnde n’ime Izuụka nke Iri na Atọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.

Igbo Mass Readings for June 29 2025, Nnukwu Emume Pita na Pọl dị Asọ – Ụmụazụ.