Esekpuoro m Gị, Chukwu dị na Nzuzo [Complete Hymn with Lyrics]

The hymn entitled ‘Esekpuoro m Gị, Chukwu dị na Nzuzo‘ is one of the popular Igbo Hymns which is used in Christian communities during worship. Catholic faithful use this hymn as one of the Communion Hymns for Mass and other liturgical celebrations. You will find below the lyrics of this hymn.

Esekpuoro m Gị Lyrics (Key D 4/4)

d:-:d:m/s:-:s:-/l:s:f:m/r:-:d:-/s:-

:l:t/d’:-:s:-/d’:t:l:t/l:-:s:-/s:-

:f:m/l:-:s:-/m:r:m:f/s:-:s:-/d:-

:r:f/m:-:r:-/d:-:-:-//

1. Esekpuoro m Gị, Chukwu dị na nzuzo,

Onye nọ ezie n’ụdị Sacramenti,

Eji m obi m kwere n’ihe omimi nke a

Nke ka uche mmadụ.

2. Aka, ọnụ, n’anya enwegh’ike ịgwa anyị,

Eziokwu dị na Sacramenti dị asọ;

Ọ bụ ntị na-anụ okwu Jesu, kwere,

Maka n’ọbụ Chukwu.

3. N’elu obe sọsọ ụdị Chukwu zoro,

N’elu Altar, ụdị nke mmadụ zokwara

Ma esorola m onye ohi logharanụ,

Na-akpọ Gị “Dinwenụ m”.

4. Ahụbeghi m ọnya Gị, dịka Thọmas,

Ma ana m ekwupụta n’ịbụ Chukwu nke m,

Mee k’okwuke, nchekwube, n’ịhụnanya

N’ebuwanye n’obi m.

5. Ihe ncheta aja achụrụ n’elu obe;

Achịcha dị ndụ, na-enye mmadụ ezi ndụ;

Mee ka obi m si na Gị na-enweta ndụ ya

Ka ọ hụ n’ịdị ụtọ.

6. Dịka nnụnụ nii a na-akpọ Pelikan,

N’eji ọbara ya n’azụ ụmụ Ya nile;

O Jesu, sachaa njọ m n’ime ọbara Gị,

Nke iji gbapụta ụwa.

7. O Jesu, Onye nọ na nzuzo n’ihu m,

Ana m arịọ Gị, nye m onyinye m chọrọ,

Ya bụ ka mụ na Gị hụ ihu na ihu,

Na otito nke eligwe.

Other Igbo Communion Hymns

Other Catholic Hymns