Igbo Mass Readings for March 21 2025, Fraịde Izuụka nke Abụọ n’Oge Ncheta Ahụhụ Kristi
Nke a bụ Igbo Mass Readings maka March 21 2025, Fraịde Izuụka nke Abụọ n’Oge Ncheta Ahụhụ Kristi.
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 37:3-4,12-13, 17-28
Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ Mbido (Jenesis)
Izrel hụrụ Josef n’anya karịa ụmụnwoke ndị ọzọ niile ọ mụtara maka na ọ bụ nwa ọ mụtara n’agadi; Ọ kwaara Josef uwe mwụda nke nwere aka ogologo.
Ma mgbe ụmụnne Josef hụrụ ka nna ha siri hụ ya, n’anya karịa ha, o wutere ha nke ukwuu, ha wee kpọ ya asị. Ha anaghị agwa ya okwu ọma. Ụmụnne ya gara ịzụ atụrụ nna ha na Shekem.
Izrel agwa Josef sị, “Ụmụnne gị gara ịzụ atụrụ na Shekem. Bịa ka m ziga gị ebe ahụ.” Ya mere Josef chọọrọ ụmụnne ya gaba, chọta ha na Dọtan. Mgbe ha hụrụ ya ka ọ na-abịa n’ebe dị anya, ha gbakọọ, gbaa izu ka ha ga-esi gbuo ya.
Ha kwuru sị: “Lee onye ọrọnrọ ka ọ na-abịa. Bịanụ ka anyị gbuo ya tụnye ya n’olulu mmiri. Anyị nwere ike ikwu na anụ-ọhịa tagburu ya. Ka anyị marazie ka nrọ ndị ahụ ọ rọrọ ga-esi wee mee.
Mana ka Ruben nụrụ izu a, ọ gbara mbọ hụ na ha egbughị Josef. Ọ gwara ha sị, “Anyị agaghị egbu ya. Ụnụ akwafula ọbara, kama tụnyenụ ya n’ime olulu mmiri a dị n’ịkpa, mana ụnụ egbukwala ya.”
Ihe o ji nye ha ndụmọdọ a bụ e mechaa, ka ọ kpọrọ Josef kpọgara nna ha. Ya mere ka Josef rutere n’ebe ụmụnne ya nọ, ha jidere ya yipụ ya uwe aka ogologo ya tụnye ya n’olulu mmiri adịghị.
Ha wee nọdụzie ala malite iri nri. Mgbe ha letịrị anya, ha hụrụ ndị Ishmel si obodo Giled alọta, ịnyịnyaibu ha bu: ụda, mgbọrọgwụ osisi na-eso osisi na-esi isi ụtọ na-aga ljipt.
Juda wee gwa ụmụnne ya sị, “Kedụ uru anyị ga-erite ma anyị gbuo nwanne anyị kpuchie ọbara ya? Ngwanụ ka anyị kpụrụ ya resị ndị Ishmel kama ime ya ihe ọjọọ.
Matakwanụ na ọ bụ nwanne anyị onye anyị na ya bụ otu ahụ.” Ha wee kwere n’ihe o kwuru. Ugbu a e nwere ndị mgbere ahịa Midian na-agafeta. Ha adọpụta Josef resị ya ndị Ishmel. Ha rere ya iri ọlaọcha abụọ. Ndị ahụ akpụrụzie Josef gaba ljipt.
ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps. 105: 16-17, 18-19, 20-21.
Azịza: Chetanụ ọrụ ebube niile Onyenweanyị rụrụ.
1. Mgbe o mere ka ụganị daa n’ala ha,
mee ka nri ha niile gwụ,
o zipụrụ otu nwoke tupu ha eruo,
Josef, onye nke e erere dịka ohu.
Azịza: Chetanụ ọrụ ebube niile Onyenweanyị rụrụ.
2. Ha ji agbụ merụsịa ụkwụ ya ahụ,
ha were igwe nyanye ya n’olu;
Mgbe oge ruru, amụma Josef mere ka o siri kwuo,
okwu nke Onyenweanyị gbaara ya aka ebe.
Azịza: Chetanụ ọrụ ebube niile Onyenweanyị rụrụ.
3. Eze wee nye iwu ka a tọhapụ ya.
Onye nke na-achị mba niile wee zọpụta ya,
o mere ya ọ bụrụ onye isi ezinụụlọ ya,
onye na-elekọta akụ na ụba ya anya.
Azịza: Chetanụ ọrụ ebube niile Onyenweanyị rụrụ.
MBEKU – Amọs 5,14
R/ Otito na ebube dịrị Gị, O Dinwenụ, Jesu Kristi.
Chọba ezi ihe kama ajọ ihe, ka ụnụ wee dị ndụ, ka Yahweh nke igwe ndị agha wee nọnyere ụnụ.
R/ Otito na ebube dịrị Gị, O Dinwenụ, Jesu Kristi.
OZIỌMA – 21:33-43
Ihe Ọgụgụ e wetara n’Oziọma dị asọ nke Matiu dere.
Jesu gwara ndị nchụ-aja na ndị okenye ọha mmadụ ahụ sị, “Nụrụnụ ụkabụilu ọzọ. O nwere otu onye nwere ezinụụlọ. Ọ kọrọ ugbo Vaịn, gbaa ya ogige gburugburu, bịa wuo ụlọ elu nche maka ugbo ya.
Ọ hanyere ya n’aka ndị nlekọta, were gaa n’obodo ọzọ. Mgbe oge ịghọ mkpụrụ ruru, nwoke ahụ zigara ụmụ odibo ya ka ha gaa natara ya ndị nlekọta ubi ya mkpụrụ si n’ugbo ya.
Ha jidere ụmụ odibo nwoke ahụ, tie otu ihe, gbuo nke ọzọ ma tụọkwa nke ọzọ okwute. Ọzọkwa, o zigara ụmụ odibo dị ọtụtụ karịa ndị nke mbụ, ma ndị nlekọta ahụ mekwara ha otu ha si mee ndị nke mbụ.
E mechaa o zigara ha nwa ya nwoke sị, ‘Ha ga-asọpụrụ nwa m. Ma mgbe ndị nlekọta ọrụ ubi ahụ hụrụ nwa ya, ha gbarịtara izu sị, “Onye a bụ onye ga-anọchị anya ya, bịanụ ka anyị gbuo ya ka akụ na ụba nna ya bụrụ nke anyị.’
Ha jidere ya, kpọpụ ya n’ubi Vaịn ahụ wee gbuo ya. Mgbe onye nwe ubi ahụ bịara, ole ihe ụnụ chere na ọ ga-eme ndị nlekọta a? Ha zara ya sị, ‘Ọ ga-ala ndị ọjọọ ahụ n’iyi bịa nyefee ubi ahụ n’aka ndị nlekọta ọzọ, ndị ga-enye ya mkpụrụ ya’ mgbe oge ruru.
Jesu jụrụ ha sị, “Ọ bụ na ụnụ agụtabeghị ihe e dere n’ime Akwụkwọ Nsọ: Okwute nke ndị na-ewu ụlọ jụrụ ajụ abụrụla ide ji ụlọ. Nke a bụ akaọrụ nke Onyenweanyị, Ọ tụrụ anyị n’anya.” Ya bụ agwa m ụnụ, a ga-anapụ ụnụ alaeze Chineke were ya nyefee n’aka mba ga-amịpụta ezi mkpụrụ.
Igbo Mass Readings for March 22 2025, Satọde Izuụka nke Abụọ n’Oge Ncheta Ahụhụ Kristi.
Igbo Mass Readings for March 21 2025, Fraịde Izuụka nke Abụọ n’Oge Ncheta Ahụhụ Kristi.