Igbo Mass Readings for April 4 2025, Fraịde Izuụka nke Anọ n’Oge Ncheta Ahụhụ Kristi
Nke a bụ Igbo Mass Readings maka April 4 2025, Fraịde Izuụka nke Anọ n’Oge Ncheta Ahụhụ Kristi.
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 2:1,12-22
Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ Amamihe
N’ihina ndị na-amaghị Chineke na-eche echiche n’ụzọ n’ezighị ezi, ha na-agwa onwe ha sị, “Ndụ anyị dị nke-nke, bịa jupụta n’uru, mgbe ndụ a gwụchara, ọ gaghị ekwe mmezi ọzọ; nke ọzọ, o nwebeghị onye sirila n’ala mmụọ laghachi azụ.
Ngwanụ ka anyị cherenụ ezigbo mmadụ n’ihina ọ na-akpasu anyị iwe, na-emegide usoro anyị si ebi ndụ, na-eche anyị mmehie anyị n’ihu, n’ihina anyị na-emebi iwu, na-ata anyị ụta na anyị anaghị eso usoro ndụ e jiri zụpụta anyị.
Ọ na-egosi na ya maara Chineke, bịa na-akpọ onwe ya nwa nke Yahweh. Ọ kwụchiiri anyị ụzọ, bụrụ ihe ụta n’ebe usoro echiche anyị dị. Naanị ịhụ ya anya na-eme ka obi jụọ anyị oyi.
Usoro ndụ ya adịghị ka nke ndị ọzọ, ụzọ o si ebi ndụ dị iche na nke ndị ọzọ. Ọ na-eleda anyị anya dịka ihe rụrụ arụ na-asọkwa ụzọ anyị si ebi ndụ. Ọ na-akọwapụta na njedebe ndụ onye eziomume na-abụ sọ añụrị; na-etu ọnụ na Chineke bụ nna ya.
Ka anyị nwakelenụ ya mara ma ihe ọ na-ekwu ọ bụ eziokwu. Ka anyị hụ ka njedebe ndụ ya ga-adị. Ọ bụrụ na onye eziomume bụ nwa nke Chineke n’ezie, Chineke n’onwe ya ga-enyere ya aka, ma zọpụta ya n’ọnya niile nke ndịiro ya.
Ka anyị werenụ imesi ike na ahụhụ nwalee ya, ka anyị chọpụta nke ọma ụdị umeala ya nke a, ka anyị tinyenụ ndidi ya n’ime ọnwụnwa. Ka anyị manụ ya ikpe ọnwụ ihere, ebe ọ bụ na o kwuru na a ga-echekwaba ya.”
Otu a ka ha si eche echiche, kama echiche ha ezighị ezi. Omume ọjọọ ha mechiri ha anya. Ha enwekwaghị ike ịmata ihe nzuzo niile nke Chineke, ma ọ bụ hụ ụgwọ dịịrị ibi ndụ dị asọ. Ma ọ bụ kwenye na ụgwọ mmụọ na-enweghị ntụpọ na-erite.
ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps. 34:17-18,19- 20, 21, 23.
Azịza: Onyenweanyị na-anọ ndị obi loghara elogha nso.
1. Onyenweanyị na-agbarụ ihu n’ebe ndị ajọomume nọ,
Ọ na-eme ka a ghara ichetakwa ha n’ụwa.
Ndị eziomume kpọkuru Onyenweanyị, Ọ za ha,
wee zọpụta ha na nsogbu ha niile.
Azịza: Onyenweanyị na-anọ ndị obi loghara elogha nso.
2. Onyenweanyị na-anọ ndị obi loghara elogha nso,
na-enyere ndị dara mba na mmụọ aka.
Ọ bụ eziokwu na nsogbu onye eziomume karịrị akarị,
mana Onyenweanyị na-esi na ha niile zọpụta ya.
Azịza: Onyenweanyị na-anọ ndị obi loghara elogha nso.
3. Ọ na-echekwaba ọkpụkpụ ya niile;
O nweghị nke ọbụla n’ime ha ga-agbaji agbaji.
Onyenweanyị na-azọpụta ndụ ndị odibo ya,
ndị niile gbabara na ya agaghị akwụ ụgwọ ọbụla.
Azịza: Onyenweanyị na-anọ ndị obi loghara elogha nso.
MBEKU – Jọn 3:16.
R/ Otito na ebube dịrị Gị, O Dinwenụ, Jesu Kristi.
N’ihi na Chineke hụrụ ụwa n’anya otu a, nke na o nyere sọ otu nwa ya ka onye ọbụla nke kwere na ya ghara ịla n’iyi.
R/ Otito na ebube dịrị Gị, O Dinwenụ, Jesu Kristi.
OZIỌMA – 7:1-2, 10, 25-30
Ihe Ọgụgụ e wetara n’Oziọma dị asọ nke Jọn dere.
Mgbe nke a gachara Jesu gagharịrị na Galili. Ọchọghị ịgagharị na Judia n’ihina ndịisi ndị Juu na-achụ ụzọ igbu ya. Emume Tabanakụl ndị Juu adịla nso.
Mgbe ụmụnne ya jebechara Jerusalem maka Emume ahụ, Jesu n’onwe ya jebekwara. O meghị ka ndị mmadụ mara, Kama o jebere na nzuzo. Ụfọdụ n’ime ndị obodo Jerusalem na-ajụ sị, “Ọ bụghị nwoke a bụ onye ha na-achọ igbu?
Leenụ ebe ọ nọ na-ekwu okwu n’ihu ọha ma ọdịghị ihe ọbụla ha sịrị ya. Ọ ga-abụ na ndịisi amarala n’ezie na onye a bụ Kristi ahụ? Ma otu ọ dị, anyị ma ebe nwoke a si pụta, ma mgbe Kristi ga-abịa ọ dịghị onye ga-ama ebe o si pụta.
Jesu wee kwuwapụta, mgbe ọ na-akụzi nkuzi n’ụlọnsọ sị: “Ụnụ ma m, marakwa ebe m si pụta? Abịaghị m n’ike aka m, onye nke zitere m bụ onye eziokwu ahụ, ụnụ amaghị onye ọ bụ, Mụ onwe m ma ya, n’ihi na esi m na ya bịa, Ọ bụ ya onwe ya zitere m.”
Ha chọrọ ijide ya, ma ọ dịghị onye ọbụla metụrụ ya aka n’ihina oge ya erubeghị.
Igbo Mass Readings for April 5 2025, Satọde Izuụka nke Anọ n’Oge Ncheta Ahụhụ Kristi.
Igbo Mass Readings for April 4 2025, Fraịde Izuụka nke Anọ n’Oge Ncheta Ahụhụ Kristi.