Igbo Mass Readings for March 28 2025, Fraịde Izuụka nke Atọ n’Oge Ncheta Ahụhụ Kristi
Nke a bụ Igbo Mass Readings maka March 28 2025, Fraịde Izuụka nke Atọ n’Oge Ncheta Ahụhụ Kristi.
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 14:1-9
Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ onye amụma Hoseya
Izrel lọghachikwutenụ Yahweh Chineke ụnụ; n’ihi na ọ bụ njọ ụnụ wetaara ụnụ ịsọ ngọngọ. Lọghachinụ azụ n’ebe Yahweh nọ; ma gwa ya sị, “Gbaghaara anyị njọ anyị niile, nabata ihe dị mma, anyị ga-ejikwa ọnụ anyị kwupụta otito gị.”
Asiria enweghị ike ịzọpụta anyị, anyị agaghịkwa agba ịnyịnya ọzọ, ma ọ bụ kpọọ ihe aka anyị mere Chineke anyị. Na gị ka ndị enweghị nne na nna na-enweta ebere.”
Aga m agwọ enweghị okwukwe ha. Aga m eji obi m niile hụ ha n’anya, maka na iwe m esila n’ebe ha nọ pụọ. Aga m adakwasị Izrel ka igirigi, ọ ga-achawapụ dịka okooko lili, gbasapụkwa mgbọrọgwụ dịka osisi Sida nke Lebanọn.
Ọ ga-epupụta ome ọhụrụ, maa mma dịka osisi Oliv, ọ ga-enwe isiọma dịka osisi nke Lebanọn. Ha ga-alọghachi azụ biri na ndo m, ha ga-abawanye dịka ọka a kụrụ n’ugbo.
Ha ga-achawapụta dịka osisi Vaịn, nweekwa, isiọma dịka mmanya nke Lebanọn. Gịnị ọzọkwa ka Ifrem ga-eji ụmụ arụsị mee ebe ọ bụ m na-aza ekpere ya, na-elekọta ya anya?
Adị m ka osisi Saịpres anaghị agbụ akwụkwọ. Ọ bụ m na-enye ya mkpụrụ ọ na-amịta. Ka onye ma ihe ghọta okwu ndị a. Ka onye nwere uche ghọta ihe ha pụtara, maka na ụzọ nke Yahweh ziri ezi, ndị eziomume na-aga na ha, mana ndị ome njọ na-asọ ngọngọ.
ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps. 81: 6-7, 8-9, 10-11, 14, 17.
Azịza: Abụ m Osebụrụwa Chineke ụnụ, nụrụnụ olu m.
1. Anụrụ m olu mụ amazighị ka ọ na-asị:
“Ebupụụrụ m ụnụ ibu arọ ụnụ bu n’ubu.
Anapụrụ m ụnụ ọrụ ndị ahụ ụnụ na-arụ.”
Mgbe ụnụ nọ na nsogbu, ụnụ kpọkuru m,
m zọpụta ụnụ.
Azịza: Abụ m Osebụrụwa Chineke ụnụ, nụrụnụ olu m.
2. Esi m n’ebe m zoro n’egbeigwe zaa ụnụ,
anwara m ụnụ na mmiri nke Meriba.
Geenụ ntị, ndị nke m, ka m dọọ ụnụ aka na ntị!
O Izrel, ọ bụrụ na ụnụ ga-ege m ntị!
Azịza: Abụ m Osebụrụwa Chineke ụnụ, nụrụnụ olu m.
3. Ụnụ enwela chi ọzọ n’etiti ụnụ;
ụnụ esekpurula chi ndị mba ọzọ.
Abụ m Osebụrụwa Chineke ụnụ,
onye dupụtara ụnụ n’ala Ijipt.
Azịza: Abụ m Osebụrụwa Chineke ụnụ, nụrụnụ olu m.
4. Asị na ndị nke m ga-ege m ntị;
a sị na Izrel ga-eso ụzọ m!
Aga m eji ọka dị mma zụọ ụnụ nri,
were mmanụ añụ si n’okwute nyejuo ụnụ afọ.”
Azịza: Abụ m Osebụrụwa Chineke ụnụ, nụrụnụ olu m.
MBEKU – Jọn 6:64,69.
R/ Otito na ebube dịrị Gị, O Dinwenụ, Jesu Kristi.
Okwu gị bụ mmụọ, bụrụkwa ndụ, ọ bụ gị ji ozi nke ndụ ebighịebi.
R/ Otito na ebube dịrị Gị, O Dinwenụ, Jesu Kristi.
OZIỌMA – 12:28-34
Ihe Ọgụgụ e wetara n’Oziọma dị asọ nke Mak dere.
Ma otu onye odeakwụkwọ bịarutere nụ ka ha na Jesu na-arụrịta ụka. Mgbe ọ hụrụ na Jesu zara ajụjụ ndị Sadusii nke ọma, ọ jụrụ ya sị, “Olee iwu kacha n’ime iwu Chineke niile?
Jesu zara ya sị, “Nke mbụ bụ nke a: ‘Nụrụnụ, ụmụ Izrel, Osebụrụwa Chineke anyị bụ otu. Ị ga-eji obi gị niile, mmụọ gị niile, uche gị niile na ike gị niile hụ Chineke n’anya.
Nke abụọ bụ: ‘Ị ga-ahụ mmadụ ibe gị n’anya ka i si hụ onwe gị n’anya. Ọ dịghị iwu ọzọkwa ka ndị a. Onye odeakwụkwọ ahụ zara ya sị, “Onye nkuzi, ị zara nke ọma, i kwuru n’ezie na Onyenweanyị bụ Chineke dị otu, na ọ dịghị Chineke ọzọ dị ma e wepụ ya;
I ji obi gị niile, nghọta, na ike gị niile, hụ ya n’anya na ịhụkwa mmadụ ibe gị n’anya ka onwe gị ka mkpa karịa aja nsureọkụ na aja ndịọzọ a na-achụrụ Chineke.
Mgbe Jesu hụrụ na ọ zara nke ọma, ọ gwara ya sị, “Ị nọteghị aka n’ala eze nke Chineke.” Mgbe nke a mechara egwu ekwekwaghị onye ọbụla jụọ ya ajụjụ.
Igbo Mass Readings for March 29 2025, Satọde Izuụka nke Atọ n’Oge Ncheta Ahụhụ Kristi.
Igbo Mass Readings for March 28 2025, Fraịde Izuụka nke Atọ n’Oge Ncheta Ahụhụ Kristi.