Igbo Mass Readings for May 16 2025, Fraịde Izuụka nke Anọ n’oge Mbilite n’Ọnwụ Kristi
Nke a bụ Igbo Mass Readings for May 16 2025, Fraịde Izuụka nke Anọ n’oge Mbilite n’Ọnwụ Kristi.
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 13:26-33
Ihe Ọgụgụ ewetara n’Ọrụ Ndịozi
Mgbe Pọl ruru Antiọk nke dị n’ala Pisidia, Ọ banyere n’ụlọnzukọ ndị Juu kwuo sị: “Ụmụnne m, ndị si n’agbụrụ Abraham, na ndị niile na-atụ egwu Chineke nọ n’etiti ụnụ.
Ọ bụ anyị niile ka Chineke ziteere ozi nzọpụta nke a. Ndị bi na Jerusalem na ndị na-achị ha aghọtaghị na Jesu bụ onye nzọpụta. Ha aghọtaghị ihe ndị amụma kwuru nke a na-agụpụtara ha ụbọchị Sabat niile.
N’ihi ya, ha mezuru ihe ndị amụma kwuru site n’ịma ya ikpe ọnwọ. Ọ bụ eziokwu na o nweghị ihe kwesịrị ọnwụ o mere a ga-eji ma ya ikpe, ha rịọrọ Paịlet ka o gbuo ya.
Mgbe ha mezuru ihe niile e dere n’Akwụkwọ Nsọ banyere Jesu, ha siri n’elu obe wedata ya, lie ya. Ma Chineke mere ka o si n’ọnwụ bilie. O gosiri ndị na-eso ụzọ ya ndị si Galili soro ya ruo Jerusalem, onwe ya.
Ndị a bụzi ndị akaebe ya ugbu a n’ihu ndị mmadụ. Anyị bịara iwetara ụnụ oziọma na ịgwa ụnụ na ihe ahụ Chineke kwere nnanna anyị ha na nkwa, ka o mezurula anyị bụ ụmụ ha site n’ime ka Jesu si n’ọnwụ bilie, nke a bụ dịka e si dee ya n’Akwụkwọ Abụọma, n’isi nke abụọ sị, “Ị bụ nwa m. N’ụbọchị taa ka m mụtara gị!”
ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps. 2: 6-7, 8-9, 10-11.
Azịza: Ị bụ nwa m. N’ụbọchị taa ka m mụtara gị!”
1. Okwuru sị, “Nke a bụ eze
nke m kwụbara na Zayọn, ugwu nke m dị nsọ.
Aga m ekwupụta iwu nke Onyenweanyị;
n’ihina Onyenweanyị gwara m sị,
Ị bụ nwa m, taata A bụrụla m nna gị.”
Azịza: Ị bụ nwa m. N’ụbọchị taa ka m mụtara gị!”
2. Rịọ m arịrịọ, aga m enye gị mba niile ka ha bụrụ nke gị;
ka akụkụ ụwa niile bụrụ ebe ọchịchị gị.
Ị ga-eji mkpara igwe kụwaa ha,
ma kụrichaa ha dịka ite onye ọkpụ ite.
Azịza: Ị bụ nwa m. N’ụbọchị taa ka m mụtara gị!”
3. Ya bụ ugbu a, ụnụ ndị eze, mụtanụ akọ,
ndị ọchịchị nke ụwa, kpacharanụ anya.
Febenụ Yahweh, tụbanụ ya egwu;
maanụ jijiji n’ihu ya, ma susuo ụkwụ ya ọnụ.
Azịza: Ị bụ nwa m. N’ụbọchị taa ka m mụtara gị!”
MBEKU
ALLELUIA ALLELUIA:
Ọ dị mkpa na Kristi ga-ata ahụhụ, sikwa na ndị nwụrụ anwụ bilie, wee banye n’ọchịchị nke ebube ya.
ALLELUIA.
OZIỌMA – 14:1-6.
Ihe Ọgụgụ ewetara n’Oziọma dị asọ nke Jọn dere.
Jesu gwara ndị na-eso ụzọ ya sị: “Obi alọla ụnụ mmiri, kwerenụ na Chineke kwerekwanụ na m. N’ụlọ Nna m, e nwere ọtụtụ ebe obibi. Ọ bụrụ na ọ bụghị otu a, agara m agwa ụnụ na m na-aga ịkwadoro ụnụ ebe obibi?
Ọ bụrụ na mụ agaa dozichaara ụnụ ebe obibi, aga m abịaghachi ịkpọrọ ụnụ, ka ebe m nọ bụrụ ebe ụnụ ga-anọ. Ụnụ ma ụzọ ebe m na-ala.” Tọmọs asị ya, “Onyenweanyị, anyị amaghị ebe ị na-ala.
Olee otu anyị ga-esi mata ụzọ ahụ?” Jesu sịrị ya, “Mụ onwe m bụ ụzọ, eziokwu na ndụ. Ọ dịghị onye ọbụla ga-abịakwute Nna ma ọ bụghị site na m.”
Igbo Mass Readings for May 17 2025, Satọde Izuụka nke Anọ n’oge Mbilite n’Ọnwụ Kristi.
Igbo Mass Readings for May 16 2025, Fraịde Izuụka nke Anọ n’oge Mbilite n’Ọnwụ Kristi.