Igbo Mass Readings for February 7 2025, Fraịde n’ime Izuụka nke Anọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.
Nke a bụ Igbo Mass Readings for February 7 2025, Fraịde n’ime Izuụka nke Anọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 13:1-8
Ihe Ọgụgụ Ewetara N’akwụkwọozi E Degaara Ndị Hibru
Ka ịhụnaanya nwanne na nwanne dịrị na-aga n’ihu n’etiti ụnụ. Ụnụ echezọla ile ndị ọbịa nke ọma. Ụfọdụ mmadụ siri n’ụzọ dị otu a lee ndị mmụọọma ọbịa n’amaghị ama.
Chetakwanụ ndị nọ na mkpọrọ dịka a ga-asị na ụnụ soro ha nọrọ na ya; ya na ndị a na-emegbu emegbu ebe ụnụ onwe ụnụ ka nọkwa n’ụdị anụ ahụ. Ka ịlụ di na nwunye bụrụ ihe a na-asọpụrụ n’etiti ụnụ. Ka akwa di na nwunye bụrụkwa ihe a na emerụghị site n’ịkwaiko.
Chineke ga-ekpe ndị ajọomume na ndị na akwaiko ikpe. Wezuganụ ndụ ịhụ ego n’anya, ka ihe ụnụ were zuoro ụnụ, n’ihina Chineke kwuru sị, “Agaghị m emejọ ụnụ mọbụ leghara ụnụ anya”.
Ya bụ, anyị ga-eji ntụkwasịobi kwuo sị, “Onyenweanyị bụ onye enyemaka m agaghị m atụ egwu, gịnị ka mmadụ ga-eme m?” Chetanụ ndịndu ụnụ, ndị gwara ụnụ okwu Chineke n’oge gara aga.
Tụleenụ otu ndụ ha siri dị. Na-eñomikwanụ okwukwe ha. Otu Kristi dị ụnyaahụ, ka ọ dị taa, otu a ka ọ ga-adịgidekwa ebeebe.
ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps.: 27:1, 3, 5, 8-9.
Azịza: Dinwenụ bụ ihè na nzọpụta m, onye ka m ga-atụ egwu?.
1. Dinwenụ bụ ihè na nzọpụta m
onye ka m ga-atụ egwu?
Dinwenụ bụ ide nke ndụ m,
onye ga-eyi m egwu.
Azịza: Dinwenụ bụ ihè na nzọpụta m, onye ka m ga-atụ egwu?.
2. Ọ bụrụgodu na igwe ndịagha agbaa m gburugburu,
egwu ọbụla agaghị atụ m,
Ọbụladị na e busoro m agha,
okwukwe m ka siri ike.
Azịza: Dinwenụ bụ ihè na nzọpụta m, onye ka m ga-atụ egwu?.
3. N’ihina Ọ na-echekwa m n’okpuru ya,
mgbe ọbụla m nọ na nsogbu,
Ọ na-ezo m n’ebe obibi ya,
Ọ na-akwụba m n’elu nkume.
Azịza: Dinwenụ bụ ihè na nzọpụta m, onye ka m ga-atụ egwu?.
4. Onyenweanyị, ana m achọ ihu gị.
ezonarịla m ihu gị.
ejila iwe chụpụ nwodibo gị.
Ọ bụ gị bụ onye enyemaka m. Ahapụla m.
Azịza: Dinwenụ bụ ihè na nzọpụta m, onye ka m ga-atụ egwu?.
MBEKU – Ps. 95:8
Alleluia, Alleluia:
Taa, ọ bụrụ na ụnụ anụ olu ya, ụnụ akpọchila obi ụnụ.
Alleluia.
OZIỌMA – 6:14-29
Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Mak dere.
N’oge a Eze Herọd nụrụ akụkọ banyere Jesu, n’ihi na ude aha ya na akwụzu ebe niile. Nke a mere ụfọdụ mmadụ ji ekwu sị, “E meela ka Jọn onye na-eme mmirichukwu si n’ọnwụ bilie. Ọ bụ nke a mere o ji arụ ọrụ ebube niile ndị a.”
Ụfọdụ na-ekwukwa sị, “Ọ bụ Elaija” ndịọzọ kwuru sị, “Ọ dịka otu onye n’ime ndịamụma mgbe ochie”. Ma mgbe Herọd nụrụ nke a, o kwuru sị, “E kulitere Jọn onye m nyere ike ka e bepụ ya isi”.
N’ihina Herọd nyere iwu ka e jide Jọn tinye ya n’ụlọmkpọrọ maka ihi Herọdịas nwunye nwanne ya nwoke Filip, onye ọ kpọọrọ dịka nwunye. Jọn gwara Herọd sị, “O zighị ezi n’iwu na ị ga alụ nwunye nwanne gị”.
Nke a mere Herọdịas ji buuru Jọn iwe n’obi na-achọ ụzọ ọ ga-esi gbuo ya. Ma o nweghị ike, n’ihina Herọd na-atụ Jọn egwu. Ọ maara na Jọn bụ ezigbo mmadụ na onye dị nsọ. N’ihi nke a o chekwabara ndụ ya.
Ọ bụ ezie na obi adịghị eru Herọd ala mgbe ọbụla ya na Jọn kparịtara ụka, ma ọ na-atọkwa Herọd ụtọ ige ntị n’ihe Jọn na-ekwu. E mechaa ohere adapụtara Herọdịas.
N’ụbọchị ncheta ọmụmụ Herọd, ọ kpọrọ oriri. Ọ kpọrọ ndị a maara aha ha n’obi eze, na ndị ọchịagha ya, na ndị mmadụ a ma ama na Galili ka ha bịa oriri ahụ. N’oge ahụ, ada Herọdịas gbara egwu, mere ka obi tọọ Herọd na ndị ọ kpọrọ oriri ụtọ.
Nke a mere ka eze Herọd gwa nwaagbọghọ ahụ sị, “Rịọ m ihe ọbụla ị chọrọ, aga m enye gị ya”. Ọ ñụkwara iyi maka nke a sị, “Ihe ọbụla ị rịọrịọ m, aga m enye gị ya, ọ bụladị ọkara alaeze m. Nwaagbọghọ ahụ gara jụọ nne ya, sị, “Gịnị ka m ga-arịọ?”
Nne ya sịrị ya, “Rịọ ka e nye gị isi Jọn onye na-eme mmirichukwu”. O wee gbaa ọsọ ngwangwa, bịakwute eze Herọd rịọ ya, sị, “Achọrọ m ka i nye m n’efere ugbu a ugbu a, isi Jọn onye na-eme mmirichukwu”.
Nke a wutere eze Herọd nke ukwuu, ma n’ihi iyi ọ ñụrụ n’ihu ndị ọbịa ya, ọ chọghị imebi okwu ya. Ngwangwa eze Herọd zipụrụ otu onyeagha nọ na nche, nyekwa ya ike ka o gbute isi Jọn onye na-eme mmirichukwu.
Onyeagha ahụ gara na mkpọrọ bepụ Jọn isi, bute ya n’efere, bunye ya nwaagbọghọ ahụ. Nwagbọghọ ahụ bunyere ya nne ya. Mgbe ndị na-eso ụzọ Jọn nụrụ maka ọnwụ ya, ha bịara buru ozu ya lie ya n’ili.
Igbo Mass Readings for February 8 2025, Satọde n’ime Izuụka nke Anọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.
Igbo Mass Readings for February 7 2025, Fraịde n’ime Izuụka nke Anọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.