Igbo Mass Readings for February 6 2026, Fraịde n’ime Izuụka nke Anọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.

Nke a bụ Igbo Mass Readings for February 6 2026, Fraịde n’ime Izuụka nke Anọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.

IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 47: 2-11

Ihe Ọgụgụ ewetara n’Akwụkwọ Sịrak

Otu e si ahọpụta abụba iche ma a chụba aja nke udo, otu ahụ ka e siri họpụta Devid site n’ụmụ ndị Izrel. Devid na ọdụm gwuriri egwu ka a ga-asụ na ha bụ ụmụatụrụ. N’okorobịa ya, ọ bụ na ọ bụghị ya gburu odogwu ahụ gbafere dimkpa oke bụ Goliat?

Wee hichapụ ndị mmadụ ihere n’ihu, oge o tinyere okwute na ntụiche ya, tụdaa Goliat na ntumọnụ ya? Maka na ọ kpọkuru Onyenwaanyị, bụ Onyekachaelu, o nye ya ike n’aka nri ya iji gbuo nwoke a bụ dike n’agha, siri otu ahụ bulie ike nke ndị nke ya elu.

Ya mere ndị mmadụ jiri tobe ya oge ha kpuwere ya okpueze maka ọtụtụ puku ndịiro o gburu na maka ngọzi dị icheiche Onyenweanyị nyere ya. O gbuchapụ ndịiro ya n’akụkụ niile, kpochapụkwa ndị Filistia na-enye ya mmekpaahụ, kụdakwa ike ha n’ala ruo taa.

N’ọrụ ya niile, Devid nyere Onyekachaelu ekele, dokwaa ya ebube, ọ hụrụ onye kere ya n’anya wee were obi ya niile kweere ya ukwe otito. O tinyere ndị ukwe n’ụlọnsọ ka ha na-ekwe ukwe mara mma.

Ọ bụ ya nyere mmemme dị icheiche ebube ha, tinyechaa ha n’oge kwesịrị ha n’ime afọ; mee ka a na-eto aha dị nsọ nke Onyenweanyị na ka ụlọnso jupụta n’ụda nke otito bido n’ụzọ ụtụtụ.

Onyenweanyị gbaghaara ya mmehie ya niile, wee mee ka ike ya dị elu ebighịebi. O nyere ya ọgbụgbandụ nke ndịeze, nyekwa ya ocheeze dị ebube n’Izrel.

ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps. 18: 30,46,49,50

Azịza: Ibuli elu dịrị Chineke nke nzọpụta m.

1. Ụzọ Chineke enweghị ntụpọ ọbụla,

Nkwa nke Onyenweanyị na-emezu

Ọ bụ ya bụ onye ogbugbo ndị niile na-agbaba na ya.

Azịza: Ibuli elu dịrị Chineke nke nzọpụta m.

2. Osebụrụwa! dị ndụ! Ngọzi dịrị nkume m,

Ibuli elu dịrị Chineke nke nzọpụta m.

N’ihi nke a aga m eto gị n’etiti mba niile O! Osebụrụwa

Aga m ekwere aha gị ukwu otito.

Azịza: Ibuli elu dịrị Chineke nke nzọpụta m.

3. Ugboro ugboro ka Ọ na-azọpụta eze ya,

Ọ na-egosịpụta ịhụnaanya ya n’ebe onye nke o tere mmanụ nọ;

bụ Devid na ndị agbụrụ ya ruo ụwa ebighịebi.

Azịza: Ibuli elu dịrị Chineke nke nzọpụta m.

MBEKU – Ps. 95:8

Alleluia, Alleluia:

Taa, ọ bụrụ na ụnụ anụ olu ya, ụnụ akpọchila obi ụnụ.

Alleluia.

OZIỌMA – 6:14-29

Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Mak dere.

N’oge a Eze Herọd nụrụ akụkọ banyere Jesu, n’ihi na ude aha ya na akwụzu ebe niile. Nke a mere ụfọdụ mmadụ ji ekwu sị, “E meela ka Jọn onye na-eme mmirichukwu si n’ọnwụ bilie. Ọ bụ nke a mere o ji arụ ọrụ ebube niile ndị a.”

Ụfọdụ na-ekwukwa sị, “Ọ bụ Elaija” ndịọzọ kwuru sị, “Ọ dịka otu onye n’ime ndịamụma mgbe ochie”. Ma mgbe Herọd nụrụ nke a, o kwuru sị, “E kulitere Jọn onye m nyere ike ka e bepụ ya isi”. N’ihina Herọd nyere iwu ka e jide Jọn tinye ya n’ụlọmkpọrọ maka ihi Herọdịas nwunye nwanne ya nwoke Filip, onye ọ kpọọrọ dịka nwunye.

Jọn gwara Herọd sị, “O zighị ezi n’iwu na ị ga alụ nwunye nwanne gị”. Nke a mere Herọdịas ji buuru Jọn iwe n’obi na-achọ ụzọ ọ ga-esi gbuo ya. Ma o nweghị ike, n’ihina Herọd na-atụ Jọn egwu. Ọ maara na Jọn bụ ezigbo mmadụ na onye dị nsọ. N’ihi nke a o chekwabara ndụ ya.

Ọ bụ ezie na obi adịghị eru Herọd ala mgbe ọbụla ya na Jọn kparịtara ụka, ma ọ na-atọkwa Herọd ụtọ ige ntị n’ihe Jọn na-ekwu. E mechaa ohere adapụtara Herọdịas.

N’ụbọchị ncheta ọmụmụ Herọd, ọ kpọrọ oriri. Ọ kpọrọ ndị a maara aha ha n’obi eze, na ndị ọchịagha ya, na ndị mmadụ a ma ama na Galili ka ha bịa oriri ahụ.

N’oge ahụ, ada Herọdịas gbara egwu, mere ka obi tọọ Herọd na ndị ọ kpọrọ oriri ụtọ. Nke a mere ka eze Herọd gwa nwaagbọghọ ahụ sị, “Rịọ m ihe ọbụla ị chọrọ, aga m enye gị ya”. Ọ ñụkwara iyi maka nke a sị, “Ihe ọbụla ị rịọrịọ m, aga m enye gị ya, ọ bụladị ọkara alaeze m.

Nwaagbọghọ ahụ gara jụọ nne ya, sị, “Gịnị ka m ga-arịọ?” Nne ya sịrị ya, “Rịọ ka e nye gị isi Jọn onye na-eme mmirichukwu”. O wee gbaa ọsọ ngwangwa, bịakwute eze Herọd rịọ ya, sị, “Achọrọ m ka i nye m n’efere ugbu a ugbu a, isi Jọn onye na-eme mmirichukwu”.

Nke a wutere eze Herọd nke ukwuu, ma n’ihi iyi ọ ñụrụ n’ihu ndị ọbịa ya, ọ chọghị imebi okwu ya. Ngwangwa eze Herọd zipụrụ otu onyeagha nọ na nche, nyekwa ya ike ka o gbute isi Jọn onye na-eme mmirichukwu.

Onyeagha ahụ gara na mkpọrọ bepụ Jọn isi, bute ya n’efere, bunye ya nwaagbọghọ ahụ. Nwagbọghọ ahụ bunyere ya nne ya. Mgbe ndị na-eso ụzọ Jọn nụrụ maka ọnwụ ya, ha bịara buru ozu ya lie ya n’ili.

Igbo Mass Readings for February 7 2026, Satọde n’ime Izuụka nke Anọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.

Igbo Mass Readings for February 6 2026, Fraịde n’ime Izuụka nke Anọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.