Igbo Mass Readings for February 25 2028, Fraịde Izuụka nke Asaa N’Oge Adanyeghị n’Emume.
Nke a bụ Igbo Mass Readings for February 25 2028, Fraịde Izuụka nke Asaa N’Oge Adanyeghị n’Emume.
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 5:9-12
Ihe Ọgụgụ ewetara n’Akwụkwọozi Jemis
Ụnụ atamula megide onwe ụnụ, ụmụnna m ka Chineke ghara ikpe ụnụ ikpe. Lee, onye ọkaikpe anyị, bụ Chineke, guzo n’ọnụụzọ. Ụmụnna m chetanụ ndịamụma ochie ndị buru amụma n’aha Onyenweanyị.
Werenụ ha mere ihe ilere anya maka inwe ndidi na ogologo ntachịobi n’oge ahụhụ. Lee anyị na-akpọ ha ndị a gọziri agọzi n’ihi nkwụdosiike ha.
Ụnụ anụla maka ogologo ntachịobi nke Job nwere n’ọnwụnwa. Ụnụ ahụkwala nzube Chineke n’ebe ọ nọ, na otu o si nyere ya aka n’ikpeazụ. N’ihina Onyenweanyị jupụtara n’ebere na ọmịiko.
Ma nke kachasinụ ụmụnna m! Ụnụ añụla iyi ọbụla mgbe ụnụ na-ekwe nkwa. Ụnụ ejikwala eluigwe mọbụ ala mọbụ ihe ịñụ iyi ọbụla ọzọ ñụọ iyi, kama ka ee ụnụ bụrụ ee ka mba ụnụ bụrụkwa mba ka ụnụ ghara ịdaba n’ikpe ọmụma nke Chineke.
ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps. 103:1-2, 3-4, 8-9, 11-12
Azịza: Osebụrụwa dị ebere na ịhụnaanya
1. Gọzie Onyenweanyị mkpụrụobi m,
gọzie aha ya dị nsọ, ihe niile dị n’ime m!
Gọzie Onyenweanyị mkpụrụobi m
echezọkwala obi ebere ya niile.
Azịza: Osebụrụwa dị ebere na ịhụnaanya
2. Ọ na-agbaghara njọ gị niile,
ma gwọọ ọrịa gị niile,
Ọ na esi n’olulu azọpụta ndụ gị,
ọ na eji ịhụnaanya na obi ebere kpube gị okpueze.
Azịza: Osebụrụwa dị ebere na ịhụnaanya
3. Osebụrụwa dị ebere na ịhụnaanya,
ọ naghị ewe iwe ngwa ngwa, ịhụnaanya ya dị ukwuu;
Iwe ya anaghị adị ebeebe,
ịkpọ asị ya na-adị sọ nwa ntịntị oge.
Azịza: Osebụrụwa dị ebere na ịhụnaanya
4. Dịka eluigwe siri dị elu n’ebe ụwa dị,
Otu ahụ ka ịhụnaanya ya siri dị ukwuu
n’ebe ndị na-atụrụ ya egwu nọ.
Ọ na-ewepụ njọ anyị n’ebe anyị nọ
karịa otu ọwụwaanyanwụ si dị anya n’ọdịda ya.
Azịza: Osebụrụwa dị ebere na ịhụnaanya
MBEKU – 1 Pita 1:25
Alleluia, Alleluia:
Ma okwu nke Onyenweanyị ga-adịgide ruo mgbe ebighịebi. Okwu a bụkwa oziọma ahụ nke a gbasaara ụnụ.
Alleluia.
OZIỌMA – 10:1-12
Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Mak dere
Jesu si n’ebe ahụ bilie, garuo ala Judia; sikwa n’ebe ahụ ruo ala dị n’ofe ọzọ nke osimiri Jọdan. Oke igwe mmadụ zukọrọ n’ebe ọ nọ. Ọ malitere ọzọ ịkụziri ha ihe, dịka o si eme.
Ụfọdụ ndị Farisii bịakwutere ya, iji nwalee ya, ha jụrụ ya sị, “O ziri ezi n’iwu ka nwoke gbaa nwunye ya alụkwaghị m?” Jesu zara ha sị, “Gịnị ka Mosis nyere ụnụ n’iwu?”
Ha zara sị, “Mosis kwenyere ka nwoke dee akwụkwọ alụkwaghị m nye nwunye ya, wee chụlaa ya”. Ma Jesu gwara ha sị, “Ọ bụ n’ihi ekweghị ekwe ụnụ ka Mosis ji deere ụnụ iwu dị otu a.
Ma site na mbido okike, Chineke mere ha nwoke na nwaanyị. N’ihi nke a ka nwoke ga-eji hapụ nna ya na nne ya gakwuru nwunye ya, ha abụọ abụrụ otu. Ya bụ ha abụghịkwa mmadụ abụọ ọzọ kama otu.
Ihe Chineke jikọrọ ọnụ mmadụ ọbụla ekewakwala ya”. N’ime ụlọ, ndị na eso ụzọ ya jụrụ ya ọzọ ihe banyere okwu a.
Ma ọ zara ha sị, “Onye ọbụla gbara nwunye ya alụkwaghị m lụrụ nwaanyị ọzọ na-akwa iko megide ya. Ma ọ bụrụkwa na nwaanyị agbaa dị ya alụkwaghị m lụrụ di ọzọ ọ na-akwakwa iko.”
Igbo Mass Readings for February 26 2028, Satọde Izuụka nke Asaa N’Oge Adanyeghị n’Emume.
Igbo Mass Readings for February 25 2028, Fraịde Izuụka nke Asaa N’Oge Adanyeghị n’Emume.