Igbo Mass Readings for December 16 2033, Fraịde Izuụka nke Atọ n’oge Olileanya Onye Nzọpụta anyị.
Nke a bụ Igbo Mass Readings maka December 16 2033, Fraịde Izuụka nke Atọ n’oge Olileanya Onye Nzọpụta anyị.
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 56:1-3, 6-8
Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ onye amụma Aịzaya
Lee ọ bụ Yahweh na-ekwu: kpebe ikpe ziri ezi, mebe eziomume, maka nzọpụta m na-abịa n’oge na-adịghị anya, a ga-egosịkwa mgbapụta m. Ngọzi dịrị onye ọbụla na-eme nke a, na edobe iwu Sabat, na-anaghị emebi ya, na-ewepụ aka n’ime ihe ọjọọ ọbụla.
Ka onye ọbịa ọbụla wepụtarala onwe ya ife Chineke gharakwa ikwu sị, ‘N’ezie Osebụrụwa ga-ekewapụ m n’ebe ndị nke ya nọ.” Ka onye onozi ọbụla gharakwa ikwu sị, “Lee, abụ m osisi kpọnwụrụ akpọnwụ.”
Ma ndị ọbịa wepụtara onwe ha ife Chineke, ịgara ya ozi, ịhụ aha ya n’anya, na ịbụ ndị odibo ya, onye ọbụla na-edobe iwu Sabat, na-anaghị emebi ya, bịakwa kwụdosie ike n’ọgbụgbandụ m, Ndị a ka m ga-akpọgote n’elu ugwu m dị nsọ, mee ka ha nwee añụrị n’ụlọ ekpere m; a ga-anara aja nsureọkụ na onyinye ha niile ka n’ebe nchụaja m, n’ihi a ga-akpọ ụlọ m ụlọ ekpere maka mmadụ niile.
Osebụrụwa Chineke onye na-akpọkọta ndị Izrel gbasachara na mba ndị iche iche kwuru sị: e nwekwara ndị ọzọ m ga-akpọkọta na-agunyeghị ndị a kpọkọtara.
ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps: 67: 2-3, 5, 7-8.
Azịza: O Chineke ka mba niile too gị.
1. Ka Chineke gosi anyị obiọma ya ma gọzie anyị,
ka o mee ka ihu ya chakwasị anyị,
n’ihi n’oge ahụ ka ụwa ga-ekwupụta ụzọ gị niile,
mba nille ga-amatakwa ike nke nzọpụta gị.
Azịza: O Chineke ka mba niile too gị.
2. Ka mba niile tie mkpu ọñụ ma kweekwa ukwe añụrị.
n’ihi na Ị na ekpe ụwa ikpe ziri ezi;
I ji ikpe nkwụmọtọ na-ekpe ndị mmadụ ikpe,
Ị na-achị mba niile dị n’ụwa.
Azịza: O Chineke ka mba niile too gị.
3. Ala amịtala mkpụrụ ya,
Osebụrụwa Chineke anyị agọziela anyị.
Ka Chineke gọzie anyị,
ka a tụọrọ ya egwu ruo na ngwụcha ụwa niile.
Azịza: O Chineke ka mba niile too gị.
MBEKU
ALLELUỊA ALLELUỊA:
Lee, Eze ga-abịa, onye kere ụwa: Ọ ga-eme ka anyị nwere onwe anyị.
ALLELUỊA.
OZIỌMA – 5:33-36
Ihe Ọgụgụ e wetara n’Oziọma dị asọ nke Jọn dere.
Jesu gwara ndị Juu sị: Ụnụ zigara Jọn ndị ozi, o wee gbaara eziokwu ahụ akaebe. Ọ bụghị na akaebe ahụ, a na-agbara m site n’aka mmadụ, kama ana m agwa ụnụ ihe ndị a, ka e wee gbapụta ụnụ.
Jọn dịka mpanaka nke a mụnyere na-enwu, na-amụkekwa. Ụnụ chọkwara ịñụrị ọñụ n’ihe ya nwatakịrị oge. Ma akaebe nke m nwere karịrị nke Jọn gbara m, n’ihi na ọrụ niile m na-arụ bụ ọrụ Nna m nyere m ka m rụọ, bụ ihe m na-agbara akaebe, na-egosịkwa na Nna m zitere m.
Igbo Mass Readings for December 17 2033 – Satọde
Igbo Mass Readings for December 16 2033, Fraịde Izuụka nke Atọ n’oge Olileanya Onye Nzọpụta anyị.