Igbo Mass Readings for May 9 2025, Fraịde Izuụka nke Atọ n’oge Mbilite n’Ọnwụ Kristi

Nke a bụ Igbo Mass Readings for May 9 2025, Fraịde Izuụka nke Atọ n’oge Mbilite n’Ọnwụ Kristi.

IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 9:1-20

Ihe Ọgụgụ ewetara n’Ọrụ Ndịozi

Ugbu a, Sọl ka nọ na-aba mba na ọ ga-egbu ndị na-eso ụzọ Onyenweanyị. Ọ gakwuuru onyeisi nchụaja rịọ ya ka o denye ya akwụkwọ maka ụlọ nzukọ ndị Juu nọ na Damaskọs, ka o wee nwee ike ịkpụrụ ụmụnwoke na ụmụnwaanyị niile ọ ga-ahụ na-eso ụzọ ahụ, kpụga Jerusalem.

Ka ọ na-abịaru Damaskọs nso, oke amụma gburu, ihè dị egwu achakwasị ya. Ọ dara n’ala, nụ otu olu ka ọ na-asị ya, “Sọl! Sọl! Gịnị mere iji ebuso m agha?” Sọl ajụọ sị, “Onye ka ị bụ Onyenweanyị?”

Ọ zaghachiri sị, “Abụ m Jesu, onye Ị na-ebuso agha! Bilie banye n’ime obodo ebe a ga-agwa gị ihe ị ga-eme.” Ihe a riri ndị ha na Sọl so aga ọnụ. Ha nụrụ olu ahụ ma ha ahụghị onye kwuru ya.

Sọl si n’ala bilie, saghee anya ya, o nweghịkwa ike ịhụ ihe ọbụla. N’ihi nke a, ha sekpụụrụ ya n’aka dubata ya na Damaskọs. Ọ hụghị ụzọ ụbọchị atọ. O righị ihe ọbụla nke ọ na-añụ ihe ọñụñụ.

E nwere otu onye na-eso ụzọ Jesu bi na Damaskọs a na-akpọ Ananịyas. Onyenweanyị kpọrọ ya oku n’ọhụ sị, “Ananịyas!” Ọ zaa ya sị, “Lee m, Onyenwe m!”

Onyenweanyị sịrị ya, “Bilie gaa n’ama ahụ a na-akpọ ‘Ụzọ kwụ ọtọ’. Ị garuo jụọ n’ụlọ nwoke a na-akpọ Judas, maka otu nwoke onye Tasọs, aha ya bụ Sọl. Ọ nọ ebe ahụ ugbu a na-ekpe ekpere, ọ hụrụ ọhụ ebe otu nwoke a na-akpọ Ananịyas batara, bikwasa ya aka n’isi ka ọ hụbakwa ụzọ.’

Ananịyas zara sị, “Onyenweanyị, ọtụtụ mmadụ akọọrọla m ọtụtụ ihe maka nwoke a banyere ihe ọjọọ na arụrụala ọ rụrụ n’ebe ndị nsọ gị na Jerusalem nọ.

Ugbu a, ọ natara ike n’aka ndịisi nchụaja iji jide ndị niile na-akpọku aha gị.” Onyenweanyị zara ya sị, “Gaba! N’ihi na ahọpụtala ya ka ọ bụrụ ngwaọrụ m, onye ga-ebugara mba ndị amaghị Chineke, ndịeze na ụmụ Izrel aha m.

Aga m egosi ya na ọ ga-atarịrị ahụhụ n’ihi aha m. Ananịyas gabara banye n’ụlọ ahụ, bikwasa Sọl aka n’isi sị, “Sọl, nwanne m! Onyenweanyị Jesu onye mere ka ị hụ ya anya n’ụzọ i si bịa, zitere m ka m mee ka ị hụkwa ụzọ ọzọ, jupụtakwa na Mmụọ Nsọ.”

Ozigbo ahụ ihe dịka mkpekere azụ siri ya n’anya dapụ. Ọ hụbakwa ụzọ ọzọ, o bilizie mee ya mmirichukwu. O rie nri, nwetakwa ume. Sọl nọnyere ndị na-eso ụzọ Jesu ụbọchị olemaole na Damaskọs.

N’atụfughị oge, ọ gagharịrị n’ụlọ nzukọ niile nke ndị Juu na-ekwusa maka Jesu, na-asị, “Ọ bụ Nwa nke Chineke.

ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps. 117:1, 2.

Azịza: Gaanụ na mba niile, kwusabanụ oziọma.

1. Toonụ Onyenweanyị, mba niile,

Toonụ ya, ndị mmadụ niile.

Azịza: Gaanụ na mba niile, kwusabanụ oziọma.

2. N’ihi na ịhụnaanya ya siri ike,

nkwụdosiike ya na-adị ọkpụ.

Azịza: Gaanụ na mba niile, kwusabanụ oziọma.

MBEKU

ALLELUIA ALLELUIA:

Kristi ebiliela ma chakwasịkwa anyị, ndị oji ọbara ya wee gbapụta.

ALLELUIA.

OZIỌMA – 6:52-59.

Ihe Ọgụgụ ewetara n’Oziọma dị asọ nke Jọn dere.

Ndị Juu malitere ịrụrịta ụka n’etiti onwe ha na-asị: “Olee otu nwoke a ga-esi nye anyị ahụ ya ka anyị rie?” Jesu wee sị ha, “Ọ bụrụ na ụnụ erighị ahụ nwa nke mmadụ, Ọ bụrụkwa na ụnụ añụghị ọbara ya, ụnụ agaghị enwe ndụ n’ime ụnụ.

Onye na-eri ahụ m na-añụkwa ọbara m nwere ndụ ebeebe. Aga m akpọlite ya n’ọnwụ n’ụbọchị ikpeazụ. N’ihi na ahụ m bụ nri n’ezie, ọbara m bụkwa ihe ọñụñụ n’ezie.

Onye ọbụla nke na-eri ahụ m, nke na-añụkwa ọbara m, na-anọgide n’ime m, mụ onwe m n’ime ya. Dịka Nna ahụ dị ndụ siri zite m, m site na ya na-adị ndụ, otu ahụ ka onye na-eri m ga-esite na m na-adị ndụ.

Nke a bụ nri ahụ nke si n’eluigwe rịdata. Ọ bụghị ụdị nri ahụ nke nna ụnụ ha riri ma nwụọ. Kama onye na-eri nri a ga-adị ndụ ruo mgbe ebighịebi.” Jesu kwuru ihe ndị a n’ụlọ nzukọ mgbe ọ na-akuzi ihe na Kapanaum.

Igbo Mass Readings for May 10 2025, Satọde Izuụka nke Atọ n’oge Mbilite n’Ọnwụ Kristi.

Igbo Mass Readings for May 9 2025, Fraịde Izuụka nke Atọ n’oge Mbilite n’Ọnwụ Kristi.