Igbo Mass Readings for January 30 2026, Fraịde n’ime Izuụka nke Atọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.
Nke a bụ Igbo Mass Readings for January 30 2026, Fraịde n’ime Izuụka nke Atọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 11:1-4, 5-10, 13-17
Ihe Ọgụgụ ewetara n’Akwụkwọ abụọ nke Samuel
N’isi ngwụcha afọ, n’oge ndịeze na-apụ ibu agha, Devid zipụrụ Joab na ndịagha ya, na ndịagha Izrel niile. Ha meriri ndị Amọn, chebichikwa obodo Raba n’agha. Ma Devid n’onwe ya nọdụrụ na Jerusalem. Otu ụbọchị, n’oge mgbede, Devid siri n’akwa ya bilie, rịgoro n’elu ụlọ ya ilegharị anya.
O wee si n’elu ụlọ ya hụ otu nwaanyị ka ọ na-asa ahụ. Nwanyị ahụ mara mma nke ukwu. Ọ jụrụ ajụjụ banyere nwaanyị ahụ. Ha kọọrọ ya na nwaanyị ahụ bụ Batsheba, ada Eliam, bụ nwunye Uria onye Het. Devid zijere ndịozi ka ha kpọta ya. Ha kpọtaara ya Batsheba.
Ya na ya wee dina. (Mgbe ahụ Batsheba ka si na mwụcha nsọ ya pụta). O mechara laghachi n’ụlọ ya. Nwaanyị ahụ wee tụrụ ime, zie Devid na ya adịla ime. Ya mere, Devid ziri Joab ozi, sị, “Zitere m Uria onye Het.” Joab wee zijere Devid Uria.
Mgbe Uria bịaruru, Devid jụrụ ya maka Joab na ndịagha Izrel, na otu agha si aga. Ọ sịkwara Uria, “Laruo ụlọ, jee zuru ike.” Ozigbo Uria si na ụlọ eze pụọ, Devid zijeere ya ihe oriri. Ma Uria ekweghị ala n’ụlọ ya. Kama, o dinara n’ọnụụzọ ama obieze, ya na ndị nche ụlọ nna ya ukwu bụ Devid.
Mgbe Devid nụrụ na Uria ekweghị ala n’ụlọ ya. Ọ jụrụ ya, sị, ịka siri n’ije lọta; gịnị mere ị chọghị iru ụlọ? Devid kpọrọ ya oriri n’anyasị, mee ka ọ ñụfee mmanya oke.
Ma ọ laghị n’ụlọ ya. Kama, ọ pụrụ dinara n’akwa, ya na ndịnche eze. N’ụtụtụ ya, Devid dere akwụkwọozi nye ya Uria ka o nye Joab. O dere n’akwụkwọozi ahụ, sị, “Dobe Uria n’ihu agha, ebe agha siri ike nke ukwu. Laghachitụnụ azụ, ka ndịiro sụgbuo ya, ka o wee nwụọ”
N’ihi nke a, mgbe Joab nọchibidoro obodo ahụ gburugburu, o zijere Uria ebe o maara na ndịiro ha na-alụ agha siri ike nọ. Ndịagha obodo ahụ pụtara buso Joab agha, gbuo ụfọdụ n’ime ndịagha Devid. Uria, onye Het sokwa na ndị e gburu egbu.
ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps. 51: 3-4, 5-6, 10-11.
Azịza: Meere anyị ebere O Chineke, n’ihi na anyị emehiela
1. Meere m ebere O Chineke site n’ịhụnaanya gị,
Site na nnukwu obi ebere gị hichapụ njọ m niile;
Sachapụ mmehie m niile,
wụchapụ m na njọ m.
Azịza: Meere anyị ebere O Chineke, n’ihi na anyị emehiela
2. N’ihina amarala m mmehie m niile,
njọ m nọ m ihu oge niile,
ọ bụ sọ gị, naanị gị ka m mere njọ megide,
ihe dị njọ n’ihu gi ka m mere.
Azịza: Meere anyị ebere O Chineke, n’ihi na anyị emehiela
3. Ya bụ ikpe amaghị gị n’ikpe i kpere m,
ụta adịghịrị gị ma ị ma m ikpe
I maara na a mụrụ m n’ime njọ,
Abụ m onye njọ site na mgbe a tụrụ ime m.
Azịza: Meere anyị ebere O Chineke, n’ihi na anyị emehiela
4. Mee ka m jupụta n’ añụrị na ọñụ,
ka ọkpụkpụ m ị gbarịsịrị nwee ike ịdị ndụ ọzọ
Elekwala anya na njọ m
Ma hichapụ mmehie m niile.
Azịza: Meere anyị ebere O Chineke, n’ihi na anyị emehiela
MBEKU
Alleluia, Alleluia:
N’ihe ọbụla ụnụ na-eme, mọbụ okwu, mọbụ omume, meenụ ha niile n’aha nke Dinwenụ Jesu. Na-enyekwanụ Chukwu Nna ekele site na ya.
Alleluia.
OZIỌMA – 4:26-34
Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Mak dere.
Jesu gwara oke igwe mmadụ ahụ gbara ya gburugburu sị, “Alaeze Chineke dịka mkpụrụ nke mmadụ ghara n’ubi, wee rahụ ụra tetekwa, abalị na ehihie, mkpụrụ ahụ na-epupụta, tolitekwa, ma ọ maghị otu o siri mee.
Ala n’onwe ya na-eme ka mkpụrụakụkụ bu ụzọ pupụta ome, e mechaa o nwee ogbe, mkpụrụ kara aka esi n’ogbe ya pụta. Mgbe mkpụrụ ha kachara, onye nwe ubi na-ebido owuwe ihe ubi n’ihina oge owuwe ihe ubi eruola”. Jesu jụkwara sị, “Kedụ ihe anyị ga-eji atụnyere Alaeze Chineke?
Olee ụdị ụkabụilu anyị ga-eji akọwa ya? Ọ dịka mkpụrụ osisi a na-akpọ mọstad, nke dị ntakịrị karịa mkpụrụ osisi niile, mgbe a kụrụ ya n’ala.
Ma mgbe a kụchara ya, ọ na-eto karịa mkpụrụ osisi niile a na-akụ n’ubi. Ọ na-awapụta alaka buru ibu, nke mere ụmụnnụnụ ji enwe ike ịrụ akwụ na ya”.
Jesu jikwa ọtụtụ ụkabụilu gwa ndị mmadụ okwu Chukwu, otu ha ga-enwe ike ịghọta; ọ gwaghị ha okwu ọbụla n’ejighi ụkabụilu. Ma mgbe naanị ya na ndị na-eso ụzọ ya nọ, ọ na-akọwara ha ihe niile.
Igbo Mass Readings for January 31 2026, Satọde n’ime Izuụka nke Atọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.
Igbo Mass Readings for January 30 2026, Fraịde n’ime Izuụka nke Atọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.