Igbo Mass Readings for September 4 2026, Fraịde Izuụka nke Iri Abụọ na Abụọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.
Nke a bụ Igbo Mass Readings for September 4 2026, Fraịde Izuụka nke Iri Abụọ na Abụọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 4:1-5
Ihe Ọgụgụ e wetara n’akwụkwọozi nke Mbụ Pọl degaara ndị Kọrịnt
O kwesịrị ka ndị mmadụ na-ahụ anyị dịka ndị na-ejere Kristi ozi, na ndị nlekọta ihe omimi nke Chineke. Otu ọ dị, ihe a chọrọ n’aka ụmụodibo bụ ka ha kwesị ntụkwasịobi.
O nweghị ihe m ji ya kpọrọ ma ọ bụrụ na ụnụ, mọbụ ụlọikpe nke mmadụ guzobere e kpee m ikpe. Adịghị m ama onwe m ikpe.
Mmụọ m anaghị ata m ụta, ma o gosighị na abụ m onye ikpe amaghị. Kama onye nwe ikpe m ikpe bụ Onyenweanyị.
Ya bụ, amala onye ọbụla ikpe mgbe ụbọchị ikpe ahụ erubeghị mọbụ tupu ọbịbịa nke Onyenweanyị. Mgbe Dinwenụ bịara, ọ ga-ekpughe ihe niile ọchịchịrị zoro, meekwa ka izu nzuzo dị n’obi mmadụ pụta ihe. Mgbe ahụ ka onye ọbụla ga-anata otito kwesịrị ya n’aka Chineke.
ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps. 37:3-4, 5-6, 27-28, 39-40
Azịza: Nzọpụta nke ndị eziomume na-esi n’aka Onyenweanyị abịa.
1. Tụkwasịobi gị n’Onyenweanyị, mekwaa ezi ihe
ka I wee biri na-ala ebe obibi gị ma nwee udo.
Nwebe añụrị n’ime Onyenweanyị
Ka O wee nye gị ihe obi gị na-achọ.
Azịza: Nzọpụta nke ndị eziomume na-esi n’aka Onyenweanyị abịa.
2. Were ndụ gị nye Onyenweanyị n’aka
tụkwasa obi na ya, ka O nyere gị aka.
Ọ ga-eme ka eziomume gị na-amụkesị dịka ihe
mee kwa ka eziokwu gị na-acha dịka ehihie.
Azịza: Nzọpụta nke ndị eziomume na-esi n’aka Onyenweanyị abịa.
3. Zere njọ, ma mebe mma,
Ka i wee nweta ụlọ dị ebeebe
N’ihina Onyenweanyị hụrụ ihe ziri ezi n’anya.
Ọ naghị ahapụ ndị kwere na ya.
Ndị ajọomume ga-ebibicha
Otu mgbe a ga-achụpụcha ụmụ ha.
Azịza: Nzọpụta nke ndị eziomume na-esi n’aka Onyenweanyị abịa.
4. Nzọpụta nke ndị eziomume na-esi n’aka Onyenweanyị abịa,
Ọ na-echekwaba ha n’oge nsogbu;
Onyenweanyị na-enyere ha aka na-azọpụtakwa ha.
Ọ na-azọpụta ha n’ihina ọ bụ onye nchedo ha.
Azịza: Nzọpụta nke ndị eziomume na-esi n’aka Onyenweanyị abịa.
MBEKU – Ps. 130:5
Alleluia, Alleluia:
Ana m eche Onyenweanyị, na nkwa ya ka m nwere nchekwube.
Alleluia.
OZIỌMA – 5:33-39
Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Luk dere
Ụfọdụ mmadụ sịrị Jesu, “Ndị na-eso ụzọ Jọn na-ebu ọnụ ọtụtụ mgbe na-ekpe ekpere, otu a ka ndị na-eso ụzọ ndị Farisii na-emekwa, ma ndị nke gị nọ na-eri na-añụ.”
Jesu zara ha sị, “Ụnụ nwere ike ime ka ndị a kpọrọ n’oriri ọlụlụ nwunye bụọ ọnụ mgbe ha na onye na-alụ nwaanyị ọhụrụ nọ?
Oge na-abịa mgbe a ga-anapụ ha onye na-alụ nwunye ọhụrụ, mgbe ahụ ka ha ga-ebube ọnụ.” Jesu tụkwaara ha ilu sị, “Onweghị onye na-adọkara iberibe akwa ọhụrụ dụkwasa ya na nke ochie; e mee nke a, a ga-adọka nke ọhụrụ, iberibe akwa ọhụrụ ahụ agaghị amakọ n’akwa ochie.
O nweghị onye na-agbanye mmanya ọhụrụ n’ime udu akpụkpọ ochie, o mee otu a, mmanya ahụ ga-agbawa udu akpụkpọ ahụ, ha abụọ alaa n’iyi.
Kama a ga-etinye mmanya ọhụrụ n’ime udu ọhụrụ. O nweghị onye ọbụla ñụchara mmanya ochie na-enwe mmasị ịñụ nke ọhụrụ n’ihina ọ na-asị, Nke ochie dị mma.”
Igbo Mass Readings for September 5 2026, Satọde Izuụka nke Iri Abụọ na Abụọ N’Oge Adanyeghị n’Emume
Igbo Mass Readings for September 4 2026, Fraịde Izuụka nke Iri Abụọ na Abụọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.