Igbo Mass Readings for September 18 2026, Fraịde Izuụka nke Iri Abụọ na Anọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.

Nke a bụ Igbo Mass Readings for September 18 2026, Fraịde Izuụka nke Iri Abụọ na Anọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.

IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 15:12-20

Ihe Ọgụgụ e wetara n’akwụkwọozi nke Mbụ Pọl degaara ndị Kọrịnt

Ma ọ bụrụ na a na-ekwusa na Chineke mere ka Kristi si n’ọnwụ bilie, gịnị mere ụfọdụ n’ime ụnụ ji ekwu na mbilite n’ọnwụ nke ndị nwụrụ anwụ adịghị?

Ọ bụrụ na mbilite n’ọnwụ nke ndị nwụrụ anwụ adịghị, ọ pụtara na Chineke emebeghị ka Kristi si n’ọnwụ bilie.

Ọ bụrụ na Chineke emeghị ka Kristi si n’ọnwụ bilie, ihe anyị na-ekwusa bụ ihe efu; okwukwe ụnụ bụkwa ihe efu.

Ọ bụrụ na ọ bụ eziokwu na Chineke adịghị eme ndị nwụrụ anwụ ka ha si n’ọnwụ bilie, ndị mmadụ ga-ahụ anyị dịka ndịamụma ụgha megide Chineke, n’ihina anyị gbara akaebe na O mere ka Kristi ahụ si n’ọnwụ bilie.

N’ihina ọ bụrụ na e meghị ka ndị nwụrụ anwụ si n’ọnwụ bilie, Chineke emebeghị ka Kristi si n’ọnwụ bilie. Ọ bụrụ na Chineke emeghị ka Kristi si n’ọnwụ bilie, okwukwe ụnụ na Kristi bụ ihe efu, ụnụ ka ga-anwụ na mmehie ụnụ.

Mgbe ahụ ndị nwụrụ anwụ n’ime Kristi lara n’iyi. Ọ bụrụ na olileanya anyị nwere n’ime Kristi bụ naanị na ndụ a, anyị kwesịrị imere ebere karịchaa n’etiti ụmụ mmadụ.

Ma otu ọ dị, Chineke emeela ka Kristi si na ndị nwụrụ anwụ bilie, bụrụ onye mbụ sirila n’ọnwụ bilie.

ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps. 17:1, 6-7, 8, 15

Azịza: Onyenweanyị, ọñụ m ga-ezu oke mgbe ebube gị chawapụtara

1. Onyenweanyị nụrụ arịrịọ m na arịọ maka ikpe ziri ezi,

Gee ntị n’arịrịọ m

Chee ntị nụrụ ekpere m

n’ihina o nweghị asị ọbụla dị n’ọnụ m.

Azịza: Onyenweanyị, ọñụ m ga-ezu oke mgbe ebube gị chawapụtara

2. Ana m akpọku gị Chineke, ma ị na-azakwa m,

Chee ntị nụrụ ihe m na-ekwu.

Gosipụta nnukwu ọrụ ịhụnaanya gị,

gị onye nzọpụta ndị gbapụrụ n’ala ha!

Azịza: Onyenweanyị, ọñụ m ga-ezu oke mgbe ebube gị chawapụtara

3. Chekwa m dịka ọkụkọ si echekwa ụmụ ya,

Ma mụ onwe m ụgwọ ọrụ eziomume m ga-abụ ịhụ ihu gị;

aga m ejupụta n’añụrị ị hụ ihu gị.

Azịza: Onyenweanyị, ọñụ m ga-ezu oke mgbe ebube gị chawapụtara

MBEKU – Ps. 119:27

Alleluia, Alleluia:

Mee ka m ghọta ihe iso ụzọ gị pụtara, ka m wee nwee ike ịchịgharị ọrụ ịtụnaanya gị n’obi m.

Alleluia

OZIỌMA – 8:1-3

Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Luk dere

Ka o mechara ntakịrị, Jesu gagharịrị n’obodo ukwu na ọnụmara dị icheiche, na-ekwusa oziọma nke alaeze Chineke.

Mmadụ iri na abụọ ndị na-eso ụzọ ya sokwa ya, na ụmụnwaanyị ụfọdụ ndị a chụpụrụ mmụọ ọjọọ n’ime ha, na ndị Ọ gwọrọ nrịanrịa ha sokwa ya.

Meri nke a kpọrọ Magdalini, onye mmụọ ọjọọ asaa si n’ime ya pụọ, na Joana nwunye Chuza, onye na-elekọta ihe dị n’ụlọ Herọd na Susana na ọtụtụ ụmụnwaanyị ndị ọzọ, ndị sitere n’ihe ha nwere na-enyere Jesu na ndị na-eso ụzọ ya aka.

Igbo Mass Readings for September 19 2026, Satọde n’ime Izuụka nke Iri Abụọ na Anọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.

Igbo Mass Readings for September 18 2026, Fraịde Izuụka nke Iri Abụọ na Anọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.