Igbo Mass Readings for October 9 2026, Fraịde Izuụka nke Iri Abụọ na Asaa N’Oge Adanyeghị n’Emume.

Nke a bụ Igbo Mass Readings for October 9 2026, Fraịde Izuụka nke Iri Abụọ na Asaa N’Oge Adanyeghị n’Emume.

IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 3:7-14

Ihe ọgụgụ e wetara n’akwụkwọ Pọl dị asọ degaara ndi Galeshịa.

Ya bụ, ụnụ ahụla na ọ bụ ndị nwere okwukwe bụ ụmụ Abraham. Akwụkwọ Nsọ buru ụzọ hụ na Chineke ga-esite n’okwukwe gụọ ndị mba ọzọ na ndị eziomume.

N’ihi nke a, akwụkwọ Nsọ bur ụzọ zie Abraham oziọma sị, “Chineke ga-agọzi mba niile nke ụwa site n’aka gị.

N’otu aka ahụ, Chineke ga-agọzi ndị niile kwere dịka o si gọzie Abraham. Ndị niile tụkwasara obi n’ọrụ nke iwu bụ ndị a bụrụ ọnụ, n’ihina e dere ya n’akwụkwọ nsọ sị onye a bụrụ ọnụ ka ọ bụ, bụ onye anaghị emezu ihe e dere n’akwụkwọ iwu.

Ugbu a, o weela anya na Chineke anaghị agụ onye ọbụla n’onye eziomume site naanị n’idobe iwu, n’ihina Akwụkwọ Nsọ kwuru sị Onye Chineke si n’okwukwe ya gụọ n’onye eziomume ga-adị ndụ; mana ọ bụghị n’iwu ka okwukwe dabeere, kama Onye ọbụla na-emezu ihe ọbụla iwu kwuru ga-esite na ya dị ndụ.

Kristi agbapụtala anyị site n’ịbụ ọnụ nke iwu na-eweta, site n’ịbụ onye a bụrụ ọnụ maka anyị: n’ihina e dere sị, “onye a bụrụ ọnụ ka ọ bụ bụ onye koro n’elu osisi.”

Jesu Kristi mere nke a ka ngọzi ahụ Chineke nyere Abraham rute ndị mba ọzọ aka, o mekwara nke a ka anyị wee nweta nkwa nke Mmụọ Nsọ site n’okwukwe.

ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps. 111:1-2, 3-4, 5-6.

Azịza: Onyenweanyị ga-echeta ọgbụgbandụ ya ebeebe ebeebe.

1. Eji m obi m niile enye Onyenweanyị ekele,

n’ọgbakọ ndị eziomume.

Ọrụ Onyenweanyị niile dị ịtụnanya,

ndị niile ọ na-amasị kwesịrị ilekwasa ya anya.

Azịza: Onyenweanyị ga-echeta ọgbụgbandụ ya ebeebe ebeebe.

2. Ọrụ niile ọ na-arụ jupụtara n’otiti na ebube

eziomume ya enweghị ike ịgbanwe agbanwe

Ọ na-ekwe ka anyị na-echeta ọrụ ebube ya.

Onyenweanyị dị ebere dị obiọma.

Azịza: Onyenweanyị ga-echeta ọgbụgbandụ ya ebeebe ebeebe.

3. Ọ na-enye ndị na-atụrụ ya egwu nri

Ọ naghị echezọ ọgbụgbandụ ya.

Ọ na-echetara ndị nke ya ike ọ na-akpa

site n’inye ha oke mba ndịọzọ.

Azịza: Onyenweanyị ga-echeta ọgbụgbandụ ya ebeebe ebeebe.

MBEKU – Ps. 95:8

Alleluịa, Alleluịa:

Taa, Ọ bụrụ na ụnụ anụ olu ya, ụnụ akpọchila obi ụnụ.

Alleluịa.

OZIỌMA – 11:15:26

Ihe ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Luk dere.

Ugbu a, Jesu na-achụpụ otu ajọ mmụọ nke dara ogbi; mgbe mmụọ ọjọọ ahụ hapụrụ, nwoke ogbi ahụ kwuru okwu, nke a tụrụ ndị mmadụ n’anya.

Ma ụfọdụ n’ime ha kwur sị, “Ọ na-achụpụ ndị mmụọ ọjọọ site n’ike Belzebul, onyeisi ndị mmụọ ọjọọ,” ma ndịọzọ, iji nwalee ya chọọrọ n’aka ya ihe ama nke si n’igwe.

Ebe ọ bụ na Ọ ma ihe ha na-eche Ọ sịrị ha, “Alaeze ọbụla nke kewaranụ megide onwe ya ga-adakpọ, ụlọ ọbụla nke dagidere ibe ya na-adakpọ.

Ọ bụrụ na Ekwensu ekewakwa megide onwe ya, kedụ ka alaeze ya ga-esi kwụdo? Ụnụ na-asị na-ana m achụpụ ndị mmụọ ọjọọ site n’ike Belzebul.

Ọ bụrụ na m na-achụpụ ndị mmụọ ọjọọ site n’ike Belzebul, site n’ike onye ka ụmụ ụnụ na-achụpụ ha? Ya mere, ha ga-abụ ndị ikpe ụnụ.

Ma, ọ bụrụ na ọ bụ site na mkpisi aka nke Chineke ka m na-achụpụ ndị mmụọ ọjọọ, matanụ na alaeze Chineke abịakwasịla ụnụ.

Mgbe dike ji ngwaagha  na-eche obi ya, ọ dịghị mfe izute ihe o ji biri. Ma mgbe onye ka ya ike bịara megide ya, wee merie ya, ọ na-anara ya ihe agha ya niile, bụ ihe ntụkwasịobi ya, kesaara ndị otu ya ihe ọ kwatara n’ụlọ dike ahụ.

Onye na-anọnyereghị m, na-emegide m; onye ọbụla na-adịghị eso ekpokọta ekpokọta na-ekposa ekposa.

Mgbe mmụọ ọjọọ siri n’ime onye o ji pụọ, ọ na-akpagharị n’ala kpọrọ nkụ na-achọ ebe izuike.

Mgbe ọ chọchara ma ọ chọtaghị, ọ na-ekpebi n’obi ya sị, ‘Aga m alaghachi n’ụlọ m ebe m si pụta.’ Mgbe o chighatara, ọ hụ na a zachaala ụlọ ahụ dozie ya nke ọma.

Ọ na-apụ, kpọta ndị mmụọ ọjọọ asaa ọzọ ndị ka ya nwee obi ọjọọ, tinyere ya onwe ya, ha na-abata biri n’ebe ahụ. Ọnọdụ ikpeazụ nke onye ahụ adị njọ karịa nke mbụ.

Igbo Mass Readings for October 10 2026, Satọde Izuụka nke Iri Abụọ na Asaa N’Oge Adanyeghị n’Emume

Igbo Mass Readings for October 9 2026, Fraịde Izuụka nke Iri Abụọ na Asaa N’Oge Adanyeghị n’Emume.