Igbo Mass Readings for October 17 2025, Fraịde Izuụka nke Iri Abụọ na Asatọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.
Nke a bụ Igbo Mass Readings for October 17 2025, Fraịde Izuụka nke Iri Abụọ na Asatọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 4:1-8
Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọozi Pọl degaara Ndị Rom
Ka anyị were nnanna anyị Abraham dịka ihe ọmụmaatụ. A sị na a gụrụ ya dịka onye eziomume site n’ọrụ aka ya, ọ gaara enwe ihe ọ ga-eji anya isi, mana ọ bụghị n’ihu Chineke.
N’ihi Akwụkwọ Nsọ kwuru sị, “Abraham kwenyere n’ihe Chineke gwara ya; n’ihi okwukwe ya, e wee gụnye ya n’onye eziomume. N’ebe onye na-arụ ọrụ nọ, ụgwọ ọrụ ya abụghị afọọma e meere ya kama ọ bụ oke ruuru ya.
Ma onye enweghị ọrụ ma tụnye okwukwe ya na Chineke, bụ onye na-agụnye ndị ajọomume na ndị eziomume, a ga-eji okwukwe ya gụnye ya na ndị eziomume.
Devid n’onwe ya kwukwara banyere ngọzi dịịrị onye ọbụla Chineke gụrụ n’onye eziomume n’agbanyeghị ọrụ ya: “Ngọzi dịịrị ndị Chineke gbagharala njọ ha niile, ndị o kpuchikwara mmehie ha niile! Ọ dị ngọzi bụ onye Chineke na-anaghị agụrụ mmehie ya!”
ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps 32: 1-2, 5, 11
Azịza: Gị bụ ebe mgbaba m, Ị na-echebe m n’oge nsogbu, I ji ukwe nzọpụta agba m gburugburu.
1. Ngọzi na-adịrị onye nke a gbaghaara njọ ya;
Onye nke e kpochapụrụ mmehie ya
Ngọzi dịrị onye ahụ Onyenweanyị amaghị ikpe,
Onye aghụghọ adịghị n’ime obi ya.
Azịza: Gị bụ ebe mgbaba m, Ị na-echebe m n’oge nsogbu, I ji ukwe nzọpụta agba m gburugburu.
2. N’ikpeazụ, ekwere m na m mere njọ
anakwaghị ezo njọ m ezo
Asịrị m: Aga m ekwupụtara Onyenweanyị njọ m
I wee gbaghara m njọ m niile.
Azịza: Gị bụ ebe mgbaba m, Ị na-echebe m n’oge nsogbu, I ji ukwe nzọpụta agba m gburugburu.
3. Ụnụ ndị eziomume, nwebenụ añụrị n’Onyenweanyị,
Tiwenụ mkpu ọñụ ụnụ ndị obi ha kwụọtọ.
Azịza: Gị bụ ebe mgbaba m, Ị na-echebe m n’oge nsogbu, I ji ukwe nzọpụta agba m gburugburu.
MBEKU – Ps. 119:18
Alleluịa, Alleluịa:
Meghee anya m, ka m wee hụ ihe ịtụnanya dị n’iwu gị.
Alleluịa.
OZIỌMA – 12:1-7
Ihe ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Luk dere.
N’oge ahụ, mgbe ọtụtụ puku ndị mmadụ gbakọtara ọnụ nke mere ka ha na-azọgbu ibe ha, Jesu buru ụzọ gwa ndị na-eso ụzọ ya sị, “Zerenụ ihe na-eko achịcha nke ndị Farisii, nke bụ ihu abụọ.
Ọ dịghị ihe ọbụla e kpuchiri ekpuchi nke a na-agaghị ekpughe, mọbụ nke e zoro ezo nke mmadụ na-agaghị ama.
Ihe ọbụla ụnụ kwurula n’ọchịchịrị, a ga-anụ ya n’ihe, ihe ụnụ takwụnyeerela mmadụ na ntị n’ime ụlọ, a ga-ekwusa ya n’elu ụlọ.”
Agwa m ụnụ ndị enyi m, ụnụ atụla egwu ndị na-egbu anụ ahụ ha gbuchaa ya, o nweghị ihe ọzọ nke ha pụrụ ime.
Kama, aga m adọ ụnụ aka na ntị onye ụnụ ga-atụ egwu: tụọnụ ya egwu bụ onye ahụ nke nwere ike ịtụba mkpụrụobi ụnụ n’ọkụmmụọ ka o gbuchara anụ ahụ, ee agwa m ụnụ tụọnụ ya egwu!
Ọ bụ na ọ bụghị peni abụọ ka a na-ere ụmụnnụnụ ise? Ma Chineke anaghị echefu otu n’ime ha. Ọ bụladị ntụtụisi ụnụ a gụrụ ha niile ọnụ. Ụnụ atụla egwu; ụnụ dị oke ọnụ karịa ọtụtụ ụmụnnụnụ.”
Igbo Mass Readings for October 18 2025, Emume Ncheta Luke dị Asọ – Ode Oziọma.
Igbo Mass Readings for October 17 2025, Fraịde Izuụka nke Iri Abụọ na Asatọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.