Igbo Mass Readings for October 16 2026, Fraịde Izuụka nke Iri Abụọ na Asatọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.
Nke a bụ Igbo Mass Readings for October 16 2026, Fraịde Izuụka nke Iri Abụọ na Asatọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 1:11-14
Ihe ọgụgụ e wetara n’akwụkwọ Pọl dị asọ degaara ndi Efesọs.
N’ime ya, dịka nzube nke ya bụ onye ahụ na-emejupụta ihe niile si dị, nakwa ka ntụpụta nke obi ya siri dị, anyị bụ ndị buuru ụzọ chekwube na Kristi.
Ndị e merela, họpụtakwa ka ha bie ndụ maka otito nke ebube ya. N’ime ya kwa ka ụnụ ndị nụrụla okwu nke eziokwu, oziọma nke nzọpụta, ma kwerekwa nay a ka e jirila Mmụọ Nsọ nke e kwere na nkwa kaa akara ịrịbaama.
Mmụọ Nsọ a bụkwa onye ga-ahụ na ihe nketa anyị niile dịịrị anyị ruo mgbe anyị nwetara ha, maka otito nke ebube ya.
ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps. 33: 1-2, 4-5, 12-13.
Azịza: Añụrị na-adịrị mba Chineke họọrọ dịka ndị nke ya.
1. Tierenụ Chineke mkpu ọụ ndị eziomume,
n’ihina otito kwesịrị ndị obi ha kwụ ọtọ
Werenụ ụbọ akwara too Chineke,
Werenụ une kụọrọ ya egwu.
Azịza: Añụrị na-adịrị mba Chineke họọrọ dịka ndị nke ya.
2. N’ihina okwu nke Onyenweanyị bụ eziokwu
Ọ na-akwụdosiike n’ọrụ ya niile.
Ọ hụrụ eziomume na ikpe nkwụmọtọ n’anya,
ịhụnaanya ya jupụtara n’ụwa.
Azịza: Añụrị na-adịrị mba Chineke họọrọ dịka ndị nke ya.
3. Añụrị na Ngọzi na-adịrị mba Chineke bụ Chukwu ha,
ndị nke ọ họọrọ dịka ndị nke ya.
Chineke si n’eluigwe eledata anya
Ọ na-ahụ ụmụ mmadụ niile.
Azịza: Añụrị na-adịrị mba Chineke họọrọ dịka ndị nke ya.
MBEKU – Ps. 119:18
Alleluịa, Alleluịa:
Meghee anya m, ka m wee hụ ihe ịtụnanya dị n’iwu gị.
Alleluịa.
OZIỌMA – 12:1-7
Ihe ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Luk dere.
N’oge ahụ, mgbe ọtụtụ puku ndị mmadụ gbakọtara ọnụ nke mere ka ha na-azọgbu ibe ha, Jesu buru ụzọ gwa ndị na-eso ụzọ ya sị, “Zerenụ ihe na-eko achịcha nke ndị Farisii, nke bụ ihu abụọ.
Ọ dịghị ihe ọbụla e kpuchiri ekpuchi nke a na-agaghị ekpughe, mọbụ nke e zoro ezo nke mmadụ na-agaghị ama.
Ihe ọbụla ụnụ kwurula n’ọchịchịrị, a ga-anụ ya n’ihe, ihe ụnụ takwụnyeerela mmadụ na ntị n’ime ụlọ, a ga-ekwusa ya n’elu ụlọ.”
Agwa m ụnụ ndị enyi m, ụnụ atụla egwu ndị na-egbu anụ ahụ ha gbuchaa ya, o nweghị ihe ọzọ nke ha pụrụ ime.
Kama, aga m adọ ụnụ aka na ntị onye ụnụ ga-atụ egwu: tụọnụ ya egwu bụ onye ahụ nke nwere ike ịtụba mkpụrụobi ụnụ n’ọkụmmụọ ka o gbuchara anụ ahụ, ee agwa m ụnụ tụọnụ ya egwu!
Ọ bụ na ọ bụghị peni abụọ ka a na-ere ụmụnnụnụ ise? Ma Chineke anaghị echefu otu n’ime ha. Ọ bụladị ntụtụisi ụnụ a gụrụ ha niile ọnụ. Ụnụ atụla egwu; ụnụ dị oke ọnụ karịa ọtụtụ ụmụnnụnụ.”
Igbo Mass Readings for October 17 2026, Satọde Izuụka nke Iri Abụọ na Asatọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.
Igbo Mass Readings for October 16 2026, Fraịde Izuụka nke Iri Abụọ na Asatọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.