Igbo Mass Readings for October 2 2026, Fraịde Izuụka nke Iri Abụọ na Isii N’Oge Adanyeghị n’Emume.
Nke a bụ Igbo Mass Readings for October 2 2026, Fraịde Izuụka nke Iri Abụọ na Isii N’Oge Adanyeghị n’Emume.
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 38:1,12-21; 40:3-5
Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ nke Job
Yahweh siri n’oke ifufe za Job sị: “Ka mgbe nne jiri mụọ gị ị nyela ụtụtụ iwu, mọbụ mee chi ọbụbọ ka o mara ọnọdụ ya, ka chi ofufo bịakwasị ụwa, wee kposaa ndị ajọomume?”
Nke a na-enye ụwa akara ịrịbaama, dịka akara e gburu n’ụrọ, meekwa ya ọ dịka akwa e jiri agwa dị icheiche chọọ mma. Ọ na-anapụ ndị ajọ mmadụ ihe, ma na akụjikwa ha aka.
Ị banyela n’ebe nsọpụta mmiri oke osimiri dị, ma garuo n’ime ala nke osimiri. Ekpugheerela gị ọnụụzọ nke ọnwụ, ka ị hụla ọnụụzọ nke oke ọchịchịrị? Ị ghọtala obosara niile nke ụwa?
Gwa m, ọ bụrụ na ị ma ihe ndị a niile. Olee ụzọ gara ebe ihe bi, mọbụ nke gara ebe ọchịchịrị bi, kpọlaa ha ebe obibi ha ma chọpụtakwa ụzọ gawara n’ụlọ ha?
O doro m anya na ị maara n’ihina a mụọla gị tupu ha ebido, ị gbakwaala ọtụtụ afọ. Job wee zaa Yahweh sị, N’ezie abụghị m ihe ọbụla n’ihu gị, gịnị ka m ga-azakwanụ gị? Emechiela m ọnụ. Ekwuchaalam ka ọ ha m n’ọnụ, o nweghịkwa ihe ọzọ m nwere ikwu.
ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps.139:1-3,7-8,9-10,13-14
Azịza: Onyenweanyị dube m n’ụzọ nke ndụ ebeebe.
1. Onyenweanyị, i nyochaala m marakwa m!
Ị ma mgbe m nọdụrụ ala na mgbe m kwụ ọtọ
ị na-anọ ebe dị anya mara ihe m bu n’uche
Ị mazuru omume m niile
mgbe m na-arụ ọrụ mọbụ mgbe m na-ezu ike.
Azịza: Onyenweanyị dube m n’ụzọ nke ndụ ebeebe.
2. Olee ebe m nwere ike ịga iji gbalahụ gị,
ebee ka m ga-agbaga wee pụọ n’ihu gị?
Ọ bụrụ na m agbagoo n’eluigwe ị nọ ebe ahụ!
Ọ bụrụ na m agaa n’ala mmụọ ị nọkwa ebe ahụ!
Azịza: Onyenweanyị dube m n’ụzọ nke ndụ ebeebe.
3. Ọ bụrụ na m efegaa n’ọwụwa anyanwụ;
mọbụ biri n’ọdịda ya na ngafe osimiri,
aka gị nọkwa ebe ahụ na-edu m;
aka nri gị na-ejidesị m ike.
Azịza: Onyenweanyị dube m n’ụzọ nke ndụ ebeebe.
4. Ọ bụ gị kere mmụọ m
Ọ bụkwa gị kpụrụ m n’afọ nne m
Ana m ekele gị maka ihe omimi ndị a
maka ihe ịtụnaanya dị n’okike i kere m
nakwa ihe ebube dị n’aka ọrụ gị niile.
Azịza: Onyenweanyị dube m n’ụzọ nke ndụ ebeebe.
MBEKU – Ps. 111:8
Alleluia, Alleluia:
Onyenweanyị iwu gị dị ntụkwasịobi n’ụzọ niile, nke a mere ka ọ dị ebeebe ebeebe.
Alleluia
OZIỌMA – 10:13-16
Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Luk dere
Jesu kwuru sị, “Ahụhụ ga-adịrị gị Korazin! Ahụhụ ga-adịrị gị Betsaịda! N’ihina a sị na ọrụ niile dị ike nke a rụrụ n’ime ụnụ, na a rụrụ ha na Taịa na Sidọn, ha garala echegharị ogologo mgbe, nọdụ n’akwa mkpe na ntụ.
Mana a ga-egosi Taịa na Sidọn ebere n’ụbọchị ikpe karịa ụnụ. Ma ngị Kapanaum, ị na-atụ anya na a ga-ebuli gị n’eluigwe? A ga-eweda gị n’olulu ọkụ alammụọ.”
Jesu wee gwa ndị na-eso ụzọ ya sị, “Onye ọbụla na-anụ okwu ụnụ na-anụ okwu m; onye ọbụla jụrụ ụnụ ajụla m, onye ọbụla nke jụrụ m jụkwara onye ahụ nke zitere m.”
Igbo Mass Readings for October 3 2026, Satọde Izuụka nke Iri Abụọ na Isii N’Oge Adanyeghị n’Emume
Igbo Mass Readings for October 2 2026, Fraịde Izuụka nke Iri Abụọ na Isii N’Oge Adanyeghị n’Emume.