Igbo Mass Readings for November 7 2025, Fraịde Izuụka nke Iri Atọ na Otu N’Oge Adanyeghị n’Emume.
Nke a bụ Igbo Mass Readings for November 7 2025, Fraịde Izuụka nke Iri Atọ na Otu N’Oge Adanyeghị n’Emume.
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 15: 14-21
Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọozi Pọl degaara Ndị Rom
O were m anya, ụmụnna m, na ụnụ jupụtara n’obiọma. Ụnụ jupụtara n’ihe ọmụma dị icheiche. Ụnụ nwekwara ike ikuziri ibe ụnụ ihe. N’akwụkwọozi nke a, eji m nkwuwa okwu, n’ezoghị ọnụ, na-echetara ụnụ ọkpụrụkpụ okwu ụfọdụ.
Eji m ikikere Chineke nyere m ịbụ onye na-ejere Jesu Kristi ozi n’etiti ndị mba ọzọ. Ana m arụkwa ọrụ onye nchụaja n’izisa oziọma Chineke, ka ofufe ndị mba ọzọ bụrụ aja Chineke ga-anara nke ọma, nke Mmụọ Nsọ dokwara nsọ.
N’ime Jesu Kristi ekwesịrị m ịkpa nganga n’ihi ozi m na-ejere Chineke. Agaghị m anwa anwa kwuo ihe ọzọ karịa ihe ndị ahụ Kristi si n’aka m wee rụọ, ime ka ndị mba ọzọ nwee nrubeisi site n’okwu na n’omume.
E mekwara ka ha gee Chineke ntị site n’ike nke ihe ịrịbaama na ọrụ ebube dị icheiche, sitekwa n’ike nke Mmụọ Nsọ. N’ihi nke a, agara m ogologo ije, site na Jerusalem ruo Ilirikum, kwusazukwaa oziọma banyere Kristi.
Ihe m bu n’obi mgbe ọbụla bụ ka m kwusaruo oziọma ahụ ebe ọbụla ndị mmadụ anụbeghị maka Kristi nọ. Ana m eme nke a ka m ghara izi oziọma nke m ebe onye ọbụla burula ụzọ zisaa na mbụ.
E dere ya n’Akwụkwọ Nsọ sị. “Ndị enwebeghị onye gwara ha maka ya ga-ahụ ya, Ndị anụbeghị maka ya ga-aghọta ya.”
ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps. 98: 1, 2-3, 3-4
Azịza: Onyenweanyị egosila mba niile ike nzọpụta ya
1. Kweere Onyenweanyị ukwe ọhụrụ,
n’ihina ọ rụrụ ọrụ ebube
aka nri na aka ya dị nsọ
eweterela ya mmeri.
Azịza: Onyenweanyị egosila mba niile ike nzọpụta ya
2. Onyenweanyị egosila ike nzọpụta ya,
o meela ka mba niile mata eziomume ya.
O chetala ịhụnaanya ya na ịkwụdosiike ya
n’ebe ezinụụlọ Izrel nọ.
Azịza: Onyenweanyị egosila mba niile ike nzọpụta ya
3. Akụkụ ụwa niile ahụla nzọpụta nke Chineke anyị.
Ụwa niile tijerenụ Onyenweanyị mkpu ọñụ,
werenụ ukwe na mkpu ọñụ too ya.
Azịza: Onyenweanyị egosila mba niile ike nzọpụta ya
MBEKU – Ps. 119:34.
Alleluịa, Alleluịa:
Nye m nghọta ka m wee mata iwu gị Onyenweanyị, wee nwee ike iji obi m niile dobe iwu gị.
Alleluịa.
OZIỌMA – 16: 1-8.
Ihe ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Luk dere.
Jesu gwara ndị ụmụazụ ya sị: “Ọ dị otu ọgaranya nke nwere onye na-elekọtara ya ezinụụlọ ya.
A na-ewetara ya ọtụtụ ebubo na onye nlekọta a na-emefusị akụnụụba ya. Ọ kpọrọ onye nlekọta ahụ, jụọ yua sị: ‘Gịnị bụ ihe a m na-anụ banyere gị?
Kọwaara m otu i si arụ ọrụ gị, n’ihina ị gaghịkwa abụ onye nlekọta ezinụụlọ m ọzọ.’ Onye nlekọta ahụ jụrụ onwe ya sị: ‘Gịnị ka m ga-eme, ebe ọ bụ na nna m ukwu na-achọ ịnapụ m ọrụ nke a?
Adighị m ike ịrụ ọrụ ugbo; ihere ga-emekwa m ị rịọ arịrịọ. Amatala m ihe mm ga-eme ka ndị mmadụ nwee ike ịnabata m n’ụlọ ha mgbe ọ chụpụrụ m ọrụ nlekọta a.’
N’ihi nke a ọ kpọrọ ndị niile ji nna ya ukwu ụgwọ n’otu n’otu. Ọ jụrụ onye nke mbụ sị, ‘Ụgwọ ite mmanụ ole ka i ji Nna m ukwu?’
Ọ zara ya sị, ‘Ọ bụ narị ite mmanụ.’ Ọ gwara ya sị, ‘Werenụ akwụkwọ ụgwọ gị, nọrọ ala ozigbo ka I dee iri ise.’ Ọ jụkwara onyeọzọ sị, ‘Ụgwọ akpa ọka ole ka i ji?’
Ọ zaa ya sị, ‘Otu narị akpa ọka.’ Onye nlekọta ahụ agwa ya sị, ‘Were akwụkwọ ụgwọ gị, dee iri asatọ.’
Nnaukwu ahụ toro onye nlekọta a na-ekwesịghị ntụkwasịobi n’ihi akọnuuche ya, n’ihina ụmụ nke ụwa a ji akọnuuche na-eso ndị ọgbọ ha karịa ụmụ nke ihe.”
Igbo Mass Readings for November 8 2025, Satọde Izuụka nke Iri Atọ na Otu N’Oge Adanyeghị n’Emume.
Igbo Mass Readings for November 7 2025, Fraịde Izuụka nke Iri Atọ na Otu N’Oge Adanyeghị n’Emume.