Igbo Mass Readings for June 26 2026, Fraịde Izuụka nke Iri na Abụọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.

Nke a bụ Igbo Mass Readings for June 26 2026, Fraịde Izuụka nke Iri na Abụọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.

IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 25:1-12

Ihe Ọgụgụ ewetara n’Akwụkwọ nke Abụọ nke Ndịeze

N’afọ nke itoolu n’ime ọchịchị Zedekaya, mgbe ọnwa nke iri gbara mkpụrụ ụbọchị iri, Nebukadneza eze Babịlọn na ndịagha ya niile busoro Jerusalem agha.

Ọ nọ na mpụta obodo were ndịagha ya gbaa ya gburugburu, were ruo n’afọ nke iri na otu n’ime ọchịchị Zedekaya. Mgbe ọnwa nke anọ gbara mkpụrụ ụbọchị itoolu, ụnwụ dara n’obodo a nke mere na o nweghịkwa nri nke ndị mmadụ ga-eri.

N’etiti abalị ụbọchị ahụ, Zedekaya na ndịagha ya tipuru mgbidi obodo ahụ, bido ịgba ọsọ. Ha si ọnụụzọ dị n’etiti mgbidi abụọ dị nso n’ubi eze; ha gbaara gaba ụzọ Araba n’agbanyeghị na ndị Kaldịa gbara obodo ahụ gbururgburu.

Ma ndịagha Kaldịa chụwara eze ahụ, wee gafee ya n’obosara ala Jeriko. Ndịagha ya wee gbasasịa. Ha wee jide eze kpụgara ya eze Babịlọn na Ribla onye nke mara ya ikpe.

Ha gbuchara ụmụ Zedekaya n’ihu ya. Ha ghụpụrụ ya anya, were tụọ ya ịga n’aka, kpụga ya Babịlọn.

Na mkpụrụ ụbọchị asaa nke ọnwa ise n’ime afọ nke iri na itoolu nke ọchịchị Nebukadneza, eze Babịlọn, Nebuzaradan, onyeisi ọchịagha ndị na-eche nche bịaara na Jerusalem.

O tinyere ọkụ n’ụlọnsọ Yahweh, ụlọ onyeeze na ụlọ niile dị na Jerusalem. Ndịagha Kaldịa niile nọ n’okpuru ọchịagha a were kụtuo mgbidi niile gbara Jerusalem gburugburu.

Nebuzaradan onye ọchịagha were bukọrọ ndị niile fọrọ n’obodo na ndị mmadụ niile na ndị gbakwurula eze Babịlọn, buga ha niile na Babịlọn. Mana ọchịagha a hapụrụ ndị ụwa na-atụ n’ọnụ ka ha na-arụ ọrụ n’ugbo.

ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps. 137:1-2, 3, 4-5, 6.

Azịza: Ka ire m tapara n’ọnụ m Ọ bụrụ na echefuo m gị.

1. N’akụkụ mmiri nke Babịlọn

ka anyị nọdụrụ ala bee akwa

mgbe anyị chetara Zayọn.

Anyị kobere ụbọ akwara anyị

n’elu osisi dị n’akụkụ mmiri ahụ.

Azịza: Ka ire m tapara n’ọnụ m Ọ bụrụ na echefuo m gị.

2. Ebe ahụ ka ndị dọtara anyị n’agha

Rịọrọ n’aka anyị okwu-abụ anyị

Ndị lụtara ihe anyị n’agha

gwara anyị ka anyị kweere ha

ụfọdụ ukwe nke Zayọn iji mee ha obi ụtọ.

Azịza: Ka ire m tapara n’ọnụ m Ọ bụrụ na echefuo m gị.

3. Mana olee otu anyị ga-esi ekwe ukwe nke Onyenweanyị,

n’obodo ndị ọgọ mmụọ?

Ọ bụrụ na echefuo m gị O Jerusalem,

Ka aka nri m kpọnwụọ!

Azịza: Ka ire m tapara n’ọnụ m Ọ bụrụ na echefuo m gị.

4. Ka ire m tapara n’ọnụ m

ma ọ bụrụ na m echefuo gị

Ọ bụruụ na anaghị m ewere Jerusalem

dịka ihe kacha enye m añụrị!

Azịza: Ka ire m tapara n’ọnụ m Ọ bụrụ na echefuo m gị.

MBEKU – Ps. 119:27

Alleluia, Alleluịa:

Mee ka nghọta ihe iso ụzọ gị pụtara, ka m wee nwee ike ịchịgharị ọrụ ịtụnaanya gị n’obi m.

Alleluia.

OZIỌMA – 8:1-4

Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Matiu dere

Mgbe Jesu siri n’elu ugwu ahu rịdata, oke igwe mmadụ sooro ya; otu onye ekpenta bịakwutere ya, sekpuru ala n’ihu ya rịọ ya sị, “Dinwenụ, ọ bụrụ na ị chọrọ, mee ka m dị ọcha”.

Jesu setịrị aka ya, metụ ya aka sị: “Achọrọ m; dị ọcha”. Ozigbo ahụ, ọrịa ekpenta ya wee laa. Ma Jesu sịrị ya, “Hụkwa na ị gwaghị onye ọbụla; gaba, gosi onye ụkọchukwu onwe gị, tụọ mmamma dịka Mosis nyere n’iwu, iji gosi ndị mmadụ na ahụ adịla gị mma”.

Igbo Mass Readings for June 27 2026, Satọde n’ime Izuụka nke Iri na Abụọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.

Igbo Mass Readings for June 26 2026, Fraịde Izuụka nke Iri na Abụọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.