Igbo Mass Readings for July 10 2026, Fraịde Izuụka nke Iri na Anọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.

Nke a bụ Igbo Mass Readings for July 10 2026, Fraịde Izuụka nke Iri na Anọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.

IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 14:2-10

Ihe Ọgụgụ ewetara n’Akwụkwọ Onye Amụma Hosea

Izrel lọghachikwutenụ Yahweh Chineke ụnụ; n’ihina ọ bụ njọ ụnụ wetaara ụnụ ịsọ ngọngọ. Lọghachinụ azụ n’ebe Yahweh nọ, ma gwa ya sị, “Gbaghaara anyị njọ anyị niile, nabata ihe dị mma, anyị ga ejikwa ọnụ anyị kwupụta otito gị.

Asiria enweghị ike ịzọpụta anyị, anyị agaghịkwa agba ịnyịnya ọzọ, mọbụ kpọọ ihe aka anyị mere Chineke anyị. Na gị ka ndị enweghị nne na nna na-enweta ebere.”

Aga m agwọ enweghị okwukwe ha. Aga m eji obi m niile hụ ha n’anya, maka na iwe m esila n’ebe ha nọ pụọ.

Aga m adakwasị Izrel ka igirigi, ọ ga-achawapụ dịka okooko lili, gbasapụkwa mgboọrọgwụ dịka osisi Sida nke Lebanọn.

Ọ ga-epupụta ome ọhụrụ, maa mma dịka osisi oliv, ọ ga-enwe isiọma dịka osisi nke Lebanọn. Ha ga-alọghachi azụ biri na ndo m ha ga-abawanye dịka ọka a kụrụ n’ugbo.

Ha ga-achawapụta dịka osisi vaịn, nweekwa isiọma dịka mmanya nke Lebanọn. Gịnị ọzọkwa ka Ifrem ga-eji ụmụ arụsị mee ebe ọ bụ m na aza ekpere ya, na-elekọta ya anya?

Adị m ka osisi Saịpres anaghị agbu akwụkwọ. Ọ bụ m na-enye ya mkpụrụ ọ na-amịta. Ka onyemaihe ghọta okwu ndị a.

Ka onye nwere uche ghọta ihe ha pụtara, maka na ụzọ nke Yahweh ziri ezi, ndị eziomume na-aga na ha, mana ndị omenjọ na-asọ ngọngọ.

ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps. 51:1-2, 6-7, 10-11, 12, 15

Azịza: Ọnụ m ga-ekwupụta otito gị

1. Meere m ebere O Chineke site n’ịhụnaanya gị

Site na nnukwu obi ebere gị hichapụ njọ m niile;

Sachapụ mmehie m niile

wụchapụ m na njọ m.

Azịza: Ọnụ m ga-ekwupụta otito gị

2. Ma ebe ị na-ahụ eziokwu n’anya

Kụziere m ihe nzuzo amamihe.

Were osisi Hissop wụchaa m ka m dị ọcha,

Sachaa m ka m wee dị ọcha karịa akụ mmiri igwe.

Azịza: Ọnụ m ga-ekwupụta otito gị

3. Chineke, kenye obi dị ọcha n’ime m

tinye n’ime m mmụọ ọhụrụ na nke siri ike.

Achụpụkwala m n’ihu gị,

anapụkwala m mmụọ nsọ gị.

Azịza: Ọnụ m ga-ekwupụta otito gị

4. Nyeghachikwa m añụrị nke nzọpụta gị.

Were ezi mmụọ gị chedo m.

Onyenweanyị meghee egbugbere ọnụ m

Ka ọnụ m wee kwupụta otito gị.

Azịza: Ọnụ m ga-ekwupụta otito gị

MBEKU – Jọn 14:23

Alleluia, Alleluia

Ọ bụrụ na mmadụ ahụ m n’anya, ọ ga-edobe okwu m, Nna m, ga-ahụkwa ya n’anya. Anyị ga-abịakwute ya.

Alleluia.

OZIỌMA – 10:16-23

Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Matiu dere

Jesu gwara ndị na-eso ụzọ ya sị, Lee, ana m ezipụ ụnụ dịka ụmụatụrụ n’etiti ọdụm. Ya bụ, chaanụ akwụ dịka agwọ, ma dịnụ umeanị n’omume dịka nduru.

Zerenụ ndị mmadụ, n’ihina ha ga-arara ụnụ nye n’ụlọikpe, ha ga-apịa ụnụ ihe n’ụlọ nzukọ ha dị icheiche. Ha ga-akpụgara ụnụ ndị na-achị achị na ndịeze n’ihi m.

Ụnụ ga-eji obere ahụ gbaara m akaebe n’ihu ha na ndị mba ọzọ. mgbe ha raara ụnụ nye, ụnụ echegbula onwe ụnụ banyere ihe ụnụ ga-ekwu, mọbụ banyere otu ụnụ ga-esi kwuo ya, n’ihina a ga-akuziri ụnụ ihe ụnụ ga-ekwu n’oge ahụ.

Maka na ọ bụghị ụnụ ga-ekwu, kama mmụọ nke Nna ụnụ ga-esi n’ime ụnụ kwuo okwu. Nwanne ga-arara nwanne ya nye n’ọnwụ; nna ga ararakwa nwa ya nye n’ọnwụ.

Ụmụ ga-ebili megide ndị mụrụ ha, mee ka e gbuo ha. Mmadụ niile ga-akpọ ụnụ asị n’ihi m, ma onye nọgidesiri ike ruo n’isi njedebe ka a ga-azọpụta.

Ọ bụrụ na ha emegide ụnụ n’otu obodo, gbaganụ ọsọndụ n’obodo ọzọ; n’ezie agwa m ụnụ, ụnụ agaghị agazuo obodo niile nke Izrel tupu Nwa nke mmadụ abịa.

Nwata akwụkwọ anaghị akari onye nkuzi ya, odibo akarighịkwa nna ya ukwu; O kwesịrị ekwesị ka nwata akwụkwọ dịka onye nkuzi ya, ka odibo dịka nna ya ukwu. Ọ bụrụ na ha kpọrọ nna nwe ụlọ Belzebụl, ụdị aha gịnị ka ha ga-enye ndị ezinụụlọ ya.

Igbo Mass Readings for July 11 2026, Satọde Izuụka nke Iri na Anọ N’Oge Adanyeghị n’Emume

Igbo Mass Readings for July 10 2026, Fraịde Izuụka nke Iri na Anọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.