Igbo Mass Readings for August 1 2025, Fraịde n’ime Izuụka nke Iri na Asaa N’Oge Adanyeghị n’Emume.
Nke a bụ Igbo Mass Readings for August 1 2025, Fraịde n’ime Izuụka nke Iri na Asaa N’Oge Adanyeghị n’Emume.
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 23:1, 4-11, 15-16, 27, 34-37
Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ Levitikọs
Yahweh gwara Mosis okwu sị: Ndị a bụ mmemme dị nsọ Yahweh, nzukọ dị nsọ nke ị ga-akpọkọwa ụmụ Izrel niile n’ụbọchị a kara ya. N’ụbọchị nke iri na anọ, n’ime ọnwa mbụ, n’oge mgbede ga-abụ oriri Ngabiga nke Yahweh.
N’ụbọchị nke iri na ise n’ime ọnwa ahụ ga-abụ ụbọchị mmemme Achịcha na-ekeghị eko. Abalị asaa ka ụnụ ga-eri achịcha na-ekoghị eko. N’ụbọchị mbụ mmemme a ụnụ ga-enwe nzukọ dị nsọ.
Ụnụ agaghị arụ ọrụ ike ọbụla. Ụbọchị asaa ka ụnụ ga-achụnyere Yahweh aja nsureọkụ. N’ụbọchị nke asaa ụnụ ga-enwe nzukọ dị nsọ, ụnụ agaghị arụ ọrụ ọbụla.
Yahweh gwara Mosis okwu sị, Gwa ụmụ Izrel, sị ha: mgbe ụnụ batara n’ala nke m ga-enye ụnụ, ụnụ ghọta ihe ọrụ ubi ụnụ ga-achịkọta mkpụrụ mbụ nke ubi a nye onye ụkọchukwu.
Ọ ga-ehunyere ya Yahweh dịka onyinye ka o wee nara ụnụ. Ụkọchukwu ga-ehunye onyinye a n’ụbọchị na-eso Sabat. Site n’ụbọchị so Sabat mgbe ụnụ chụrụ aja mkpụrụ ubi ụnụ ga-agụ izu ụka asaa zuru ezu.
Ụnụ ga-agụpụta ụbọchị iri ise site n’ụbọchị Sabat nke asaa bụ ụbọchị ụnụ ga-achụrụ Yahweh aja ọhụrụ. Ụbọchị nke iri n’ime ọnwa asaa nke a ga-abụ ụbọchị mmemme mmezi.
Ụnụ ga-enwe nzukọ dị nsọ. Ụnụ ga-ebu ọnụ chụọkwara Yahweh aja nsureọkụ. Gwa ụmụ Izrel na ụbọchị nke iri na ise nke ọnwa asaa ga-abụ oriri Tabanakụl maka Yahweh.
A ga-eme ya ụbọchị asaa. Ụnụ ga-enwe ọgbakọ nsọ n’ụbọchị nke mbụ n’arụghị ọrụ ike ọbụla. Ụnụ ga-achụnyere Yahweh aja nsureọkụ mkpụrụ ụbọchị asaa.
N’ụbọchị nke asatọ ụnụ ga-enwe ọgbakọ nsọ chụọ aja nsureọkụ nye Yahweh. Ọ bụ ụbọchị ọgbakọ pụrụ iche. Ụnụ agaghị arọ ọru ike ọbula.
Ndị a bụ oriri pụrụ iche nke Yahweh nke ụnụ ga-akpọkọwa ụmụ Izrel; ọgbakọ dị nsọ e mere maka aja nsureọkụ, aja mkpụrụ akụkụ, aja ihe ọñụñụ dịka usoro ụbọchị ọbụla siri dị.
ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps. 81:2-3, 4-5, 9-10.
Azịza: Tierenụ Chineke bụ enyemaka anyị mkpu ọñụ
1. Bidonụ egwu, kụọnụ ịgba,
Werenụ une na ụbọ akwara kụọ egwu dị ụtọ.
Gbuonụ opi n’ọnwa ọhụrụ,
Oge ọnwa dị n’uju, n’ụbọchị nnukwu emume anyị.
Azịza: Tierenụ Chineke bụ enyemaka anyị mkpu ọñụ
2. Nke a bụụrụ Izrel iwu,
iwu nke Chineke nke Jekọb
O nyere ya Josef ka iwu
Mgbe o busoro ljipt agha.
Azịza: Tierenụ Chineke bụ enyemaka anyị mkpu ọñụ
3. Ụnụ enwela chi ọzọ n’etiti ụnụ;
ụnụ esekpurula chi ndị mba ọzọ.
Abụ m Osebụrụwa Chineke ụnụ
Onye dupụtara ụnụ n’ala ljipt.
Azịza: Tierenụ Chineke bụ enyemaka anyị mkpu ọñụ
MBEKU – Ps. 145:13
Alleluia, Alleluia
Onyenweanyị dị ntụkwasịobi n’okwu ya niile; Omume ya niile jupụtara n’obi ebere.
Alleluia.
OZIỌMA – 13:54-58
Ihe Ọgụgụ nke a si n’oziọma dị asọ nke Matiu dere
Mgbe ọ batara n’obodo ya, ọ kụziiri ha nkuzi n’ụlọ nzukọ. Nkuzi a tụrụ ha n’anya nke mere ha ji wee juọ sị, olee ebe nwoke a siri nweta amamihe dị otu a na ike ịrụ ọrụ ebube ndị a?
Ọ bụ na onye a abụghị nwa Josef onye ọkụ ntu? Ọ bụ na ọ bụghị nne ya ka a na-akpọ Marịa? Ụmụnne ya ndị nwoke, ha abụghị Jemis, Josef, Saịmọn na Judas?
Ọ bụ na anyị na ụmụnne ya ndị nwaanyị anọghị n’ebe a? Oleekwanụ ebe o nwetere ike ndị a? Ha wesara ya iwe.
Ma Jesu sịrị ha, Onye amụma ọbụla nwere nsọpụrụ ebe ọbụla ewezuga n’ala nna ya, na n’ezinụụlọ nke aka ya. N’ihina ha enweghị okwukwe ọ rụghị ọtụtụ ọrụ ebube n’ebe ahụ.
Igbo Mass Readings for August 2 2025, Satọde n’ime Izuụka nke Iri na Asaa N’Oge Adanyeghị n’Emume.
Igbo Mass Readings for August 1 2025, Fraịde n’ime Izuụka nke Iri na Asaa N’Oge Adanyeghị n’Emume.