Igbo Mass Readings for July 31 2026, Fraịde Izuụka nke Iri na Asaa N’Oge Adanyeghị n’Emume.

Nke a bụ Igbo Mass Readings for July 31 2026, Fraịde Izuụka nke Iri na Asaa N’Oge Adanyeghị n’Emume.

IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 26:1-9

Ihe Ọgụgụ e wetara n’akwụkwọ Onye Amụma Jeremaya

Na mbido ọchịchị Jehoyakim nwa Josaya eze nke Juda, okwu nke a si n’aka Yahweh bịa sị: “Ọ bụ Yahweh na-ekwu ‘Guzoro n’ihu ụlọ Chineke ma gwa obodo niile nọ na Juda ndị bịara ife ofufe n’ụlọ nke Yahweh, okwu niile nke m nyere gị n’iwu ka ị gwa ha; ezokwala okwu ọbụla.

O nwere ike bụrụ na ha ga-ege ntị, ma chegharịa na mmehie ha; nke ga-emekwa ka m chegharịa ma wepụkwa ihe ọjọọ nke m chọrọ ime n’ebe ha nọ n’ihi agwa ọjọọ ha.

Ị ga-agwa ha sị, ‘Lee ọ bụ Yahweh na-ekwu ọ bụrụ na ụnụ egeghị m ntị, bịa soro ụzọ iwu m nke m chere n’ihu ụnụ, ma geekwa ntị n’okwu nke ụmụodibo m ndị amụma ndị m na-ezitere ụnụ ọsọọsọ, ndị ụnụ na-egebeeghị ntị mbụ, mgbe ahụ, aga m eme ụlọ ụnụ dịka Shịlọ, agakwa m eme obodo a ka ọ bụrụ ihe ịbụ ọnụ n’ebe mba niile dị n’elu ụwa nọ.”

Ndị ụkọchukwu na ndị amụma na ndị mmadụ niile hụrụ Jeremaya ka ọ na-ekwu okwu ndị a n’ime ụlọ nke Chineke.

Mgbe Jeremaya kwuchara ihe nile Yahweh nyere ya n’iwu ka o kwuo, ndị ụkọchukwu na ndị amụma na ndị mmadụ niile abịa jide ya gwa ya sị, “Ị ga-anwụrịrị.

Olee ihe kpatara i jiri na-ebu amụma n’aha nke Yahweh na-ekwu na-asị, Ụlọ nke a ga-adị ka Shịlọ, obodo nke a ga-abụkwa ihe e mebichara emebicha o nweghị onye ga-ebi n’ime ya?” Ndị mmadụ niile wee gbakọọ gburugburu n’ebe ahụ Jeremaya nọ n’ime ụlọ nke Yahweh.

ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps. 69: 4,7-9,13

Azịza: Onyenweanyị, n’oke ịhụnaanya, gị za m.

1. Ndị kpọrọ m asị na-enweghị ihe kpatara ya

buru ibu karịa ntụtụisi m

ndị chọrọ igbu m dị ọtụtụ dịka ntụtụisi m

Ha na-asị m nyeghachi ihe m na ezughị.

Azịza: Onyenweanyị, n’oke ịhụnaanya, gị za m.

2. Ọ bụ maka gị ka m jiri na-edi mkparị,

nke na-eme m ihere

nke na-eme ka m bụrụ onye ọbịa n’etiti ụmụnne m

na-emekwa m onye mbịa mbịa n’ụmụnne m ndịọzọ;

I nwe mmasị nke ụlọ gị eriela m obi,

mkparị nke ndị na-akparị gị na-adakwasị m.

Azịza: Onyenweanyị, n’oke ịhụnaanya, gị za m.

3. Ana m arịọ gị Onyenwe m

oge masịrị gị, n’oke ịhụnaanya gị za m

n’ikwụsiike nke nzọpụta gị.

Azịza: Onyenweanyị, n’oke ịhụnaanya, gị za m.

MBEKU – Ps. 145:13

Alleluia, Alleluia

Onyenweanyị dị ntụkwasịobi n’okwu ya niile; Omume ya niile jupụtara n’obi ebere.

Alleluia.

OZIỌMA – 13:54-58

Ihe Ọgụgụ nke a si n’oziọma dị asọ nke Matiu dere

Mgbe ọ batara n’obodo ya, ọ kụziiri ha nkuzi n’ụlọ nzukọ. Nkuzi a tụrụ ha n’anya nke mere ha ji wee juọ sị, olee ebe nwoke a siri nweta amamihe dị otu a na ike ịrụ ọrụ ebube ndị a?

Ọ bụ na onye a abụghị nwa Josef onye ọkụ ntu? Ọ bụ na ọ bụghị nne ya ka a na-akpọ Marịa? Ụmụnne ya ndị nwoke, ha abụghị Jemis, Josef, Saịmọn na Judas?

Ọ bụ na anyị na ụmụnne ya ndị nwaanyị anọghị n’ebe a? Oleekwanụ ebe o nwetere ike ndị a? Ha wesara ya iwe.

Ma Jesu sịrị ha, Onye amụma ọbụla nwere nsọpụrụ ebe ọbụla ewezuga n’ala nna ya, na n’ezinụụlọ nke aka ya. N’ihina ha enweghị okwukwe ọ rụghị ọtụtụ ọrụ ebube n’ebe ahụ.

Igbo Mass Readings for August 1 2026, Satọde Izuụka nke Iri na Asaa N’Oge Adanyeghị n’Emume

Igbo Mass Readings for July 31 2026, Fraịde Izuụka nke Iri na Asaa N’Oge Adanyeghị n’Emume.