Igbo Mass Readings for July 4 2025, Fraịde n’ime Izuụka nke Iri na Atọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.
Nke a bụ Igbo Mass Readings for July 4 2025, Fraịde n’ime Izuụka nke Iri na Atọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 23:1-4, 19; 24:1-8, 62-67
Ihe Ọgụgụ e wetara n’akwụkwọ Jenesis
Ihe Sera biri n’elu ụwa bụ otu narị afọ na iri afọ abụọ na asaa. Sera nwụrụ na Kiriat-Aba nke bụ Hebrọn ugbu a n’ala Kenaan. Abraham gbaara ya mkpe.
Abraham hapụrụ ozu nwunye ya gwa ụmụ Het okwu sị, “Abụ m onye ọbịa bi n’etiti ụnụ, ka m nweta ebe olili ozu nke aka m ebe a, ka m wee nwee ike ili nwunye m nwụrụ anwụ”.
Mgbe nke a gachara, Abraham liri nwunye ya Sera n’ime ọgba nke ala Mak-pela, nke chere Mamre ihu (ugbu a Hebrọn) n’ala Kenaan.
Ugbu a Abraham emeela okenye, gbakwaa ọtụtụ afọ, Yahweh agọzikwaala ya n’ụzọ niile. Abraham sịrị nwodibo ya nke kacha okenye n’ezinụụlọ ya, onye na-elekọta akụnụụba niile o nwere.
“Tinye aka gị n’okpuru apata ụkwụ m, aga m eme gị ka i were Yahweh, Chineke nke Eluigwe na ụwa ñụọ iyi na ị gaghị esi n’ụmụ nwaanyị ndị Kenaan m bi n’etiti ha lụtara nwa m nwoke nwaanyị.
Kama, gaa n’ala a mụrụ m, n’agbụrụ nke m họtara nwa m nwoke Aịzik nwaanyị”. Nwodibo ahụ jụrụ ya sị, “Ọ bụrụkwanụ na nwata nwaanyị ahụ ajụ iso m bịa n’obodo a, aga m akpọghachi nwa gị nwoke n’obodo nke i si bịa?”
Abraham zaghachiri ya sị, “Ya enwekwala ihe ọbụla ga-eme gị ka ị kpọghachi nwa m nwoke azụ ebe ahụ. Yahweh, Chineke nke Eluigwe na ụwa, kpọọrọ m site n’ụlọ nna m, na site n’ala nke ndị agbụrụ m ñụọrọ m iyi na ya ga-enye ụmụụmụ m obodo a.
Ọ ga-ezite mmụọọma ya ugbu a n’ihu gị, ka i nwee ike ịhọtara nwa m nwoke nwaanyị ebe ahụ. Ọ bụrụ na nwata nwaanyị ahụ jụ iso gị ị ga-enwere onwe gị n’iyi nke ị ñụụrụ m.
Naanị akpọghachila nwa m nwoke azụ n’ebe ahụ”. Aịzik onye biiri na Negeb alọghachitelarị n’ịkpa nke ụmị Lahai Roi.
Ugbu a, Aịzik pụrụ na-agagharị n’ogige n’oge anyasị, ka ọ na-elelite anya, ọ hụrụ ụgbọịnyịnya ndị na-abịa ya nso. Ribeka lelitere anya elu hụ Aịzik.
Ọ wụdata n’elu ụgbọịnyịnya ya, jụọ nwodibo ahụ, “Onye bụ nwoke ahụ si n’ogige na abịa izute anyị?” Nwodibo ahụ zaghachiri sị, “Onye ahụ bụ nna m ukwu.” Owere ịchafu ya kpuchie ihu ya.
Nwodibo ahụ wee kọọrọ Aịzik ihe niile merenụ. Mgbe ahụ, Aịzik kpọbatara Ribeka n’ime ụlọikwu ya mee ya nwunye ya; hụkwa ya n’anya. Ya mere na Aịzik nwere nkasiobi n’ihi ọnwụ nne ya.
ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps. 106:1-2,3-4,4-5
Azịza: Alleluia, Nyenụ Onyenweanyị ekele n’ihina ọ dị mma.
1. Alleluia, nyenụ Onyenweanyị ekele n’ihina ọ dị mma,
ịhụnaanya ya enweghị njedebe,
Onye ga-enwe ike ịgụta ọrụ ebube niile Onyenweanyị rụrụ ọnụ?
onye ga-enwe ike inye ya otito zuru ezu.
Azịza: Alleluia, Nyenụ Onyenweanyị ekele n’ihina ọ dị mma.
2. Ngọzi dịrị ndị na-akwụba aka ọtọ
ndị na-eme mma oge niile.
Cheta m O Osebụrụwa!
N’ihi ịhụnaanya i nwere n’ebe ndị nke gị nọ.
Azịza: Alleluia, Nyenụ Onyenweanyị ekele n’ihina ọ dị mma.
3. Bịakwute m dịka onye nzọpụta.
Ka m soro keta oke n’añụrị nke ndị ị họtara,
na ọñụ nke mba ị họọrọ,
ka m wee nwee afọ ojuju n’ịbụ otu onye na ndị ga-eri ekpe gị.
Azịza: Alleluia, Nyenụ Onyenweanyị ekele n’ihina ọ dị mma.
MBEKU
Alleluia, Alleluịa:
Okwu gị Onyenweanyị bụ eziokwu, were eziokwu gị doo anyị nsọ.
Alleluịa.
OZIỌMA – 9:9-13
Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Matiu dere
Ka Jesu hapụrụ ebe ahụ, ọ hụrụ otu nwoke a na-akpọ Matiu, ka ọ nọ n’ụlọụtụ. Jesu sịrị ya, “Sobe m” O wee bilie sobe ya.
Ka Jesu nọ n’oriri n’ụlọ Matiu, ọtụtụ ndị ọnaụtụ na ndị omenjọ bịara soro ya na ndị na-eso ụzọ ya nọdụ na-eri nri.
Mgbe ndị Farisii nọ n’ebe ahụ hụrụ nke a, ha jụrụ ndị na-eso ụzọ ya sị: “Gịnị mere onye nkuzi ụnụ ji eso ndị ọnaụtụ na ndị omenjọ eri nri?
Mgbe Jesu nụrụ nke a, Okwuru sị: “Ọ bụghị ndị ahụ dị ike na-achọ dibịa, kama ọ bụ ndị ahụ adịghịị. Gaanụ chọpụta ihe nke a pụtara, ihe na-amasị m bụ ebere, ọ bụghị aja. N’ihina abịaghị m ịkpọ ndị eziomume kama ndị omenjọ”.
Igbo Mass Readings for July 5 2025, Satọde n’ime Izuụka nke Iri na Atọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.
Igbo Mass Readings for July 4 2025, Fraịde n’ime Izuụka nke Iri na Atọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.