Igbo Mass Readings for August 13 2027, Fraịde n’ime Izuụka nke Iri na Itoolu N’Oge Adanyeghị n’Emume.
Nke a bụ Igbo Mass Readings for August 13 2027, Fraịde n’ime Izuụka nke Iri na Itoolu N’Oge Adanyeghị n’Emume.
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 24:1-13
Ihe Ọgụgụ e wetara n’akwụkwọ Jọshụa
Jọshụa kpọkọtara agbụrụ ụmụ Izrel niile na Shekem, kpọọ ndị okenye ndị ndu na ndị ọkaikpe na ndịisi Izrel, ha pụtachaa n’ihu Chineke.
Jọshụa gwara mmadụ niile sị, “Osebụrụwa Chineke nke Izrel kwuru nke a: Nna ụnụ ha biri mgbe ochie n’ofe Yufretes; Tera bụ nna Abraham na Nahọ; ha fere chi ọzọ.
Esi m n’ofe osimiri kpọrọ nna ụnụ Abraham duru ya gaa ala Kenaan niile, mee ụmụ ya ka ha dị ọtụtụ. Enyere m ya Aịzik. Enyere m Aịzik, Jekọb na Iso.
Enyere m Isọ ala obodo ugwu Sịa ka ọ bụrụ nke ya; mana Jekọb na ụmụ ya gbadara Ijipt. Ezigara m Mosis na Erọn wee nye ndị ljipt ahụhụ dịka ihe m mere n’etiti ha; e mechaa, m si ebe ahụ kpọpụta ụnụ.
Esi m n’ljipt kpọpụta nna ụnụ, ụnụ wee bịaruo n’oke osimiri ndị ljipt jiri ụgbọ ịnyịnya ha na ndị ji ịnyịnya alụ agha chụọ ụnụ ọsọ ruo n’oke osimiri.
Mgbe ha kpọkuru Osebụrụwa, O tinyere ọchịchịrị n’etiti ụnụ na ndị Ijipt, mee ka oke osimiri bịakpo ha wee rie ha, ụnụ hụkwara ihe m mere n’ljipt; ụnụ bikwara n’ịkpa ogologo oge.
Eduuru m ụnụ pụta n’ala ndị Amọ, ndị bi n’ofe Jọdan, ụnụ na ha lụrụ agha, m nyefee ha n’aka ụnụ, ụnụ merie ha were ala ha.
Emebisikwara m ha n’ihu ụnụ. Mgbe ahụ, Balak nwa Zipọ, eze Moab kuliri lụso ụmụ Izrel agha. O zipụrụ ka a kpọọ Balam nwa Beọ ka ọ bụọ ụnụ ọnụ.
Ma añaghị m Balam ntị; ya mere ọ gọziri ụnụ. N’ụzọ dị otu a esiri m n’aka ya zọpụta ụnụ. Ụnụ gafere Jọdan wee bata Jeriko.
Ndị Jeriko lụsokwara ụnụ agha, ha na ndị Amọ, ndị Periz, ndị Kenaan, ndị Hit, ndị Gegash, ndị Hiv na ndị Jebus; ma enyere m ha niile n’aka ụnụ.
Ezipụrụ m igwe anụ nke chụpụrụ ndịeze Amọ abụọ ahụ mgbe ụnụ na-abịa; ọ bụghị mmaagha mọbụ ụta ụnụ ka ụnụ ji mee nke a.
Enyere m ụnụ ala nke ụnụ akọghị ihe n’ime ya, nyekwa ụnụ obodo niile ụnụ arụghị; ụnụ biri n’ime ya na-eri mkpụrụ vaịn na oliv nke ụnụ akụghị?
ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps. 136: 1-3, 16-18, 21-22, 24
Azịza: Ịhụnanya ya enweghị njedebe
1. Nyenụ Chineke ekele n’ihina ọ dị mma
ịhụnaanya ya enweghị njedebe
Nyenụ Chineke ka chi niile ekele
n’ihina ịhụnanya ya enweghị njedebe.
Azịza: Ịhụnanya ya enweghị njedebe
2. O siri n’ọzara dufee ndị nke ya
n’ihina ịhụnanya ya enweghị njedebe
O tigburu ndịeze dị ukwuu
n’ihina ịhụnanya ya enweghị njedebe
O gburu ndịeze a maara aha ha
n’ihina ịhụnanya ya enweghị njedebe.
Azịza: Ịhụnanya ya enweghị njedebe
3. O nyere ndịeze ndị ya ala ha dịka ihe nketa ha
n’ihina ịhụnanya ya enweghị njedebe
O nyere ha Izrel nwodibo ya ka ha bụrụ ihe nketa ya
n’ihina ịhụnanya enweghị njedebe
Wee zọpụta anyị n’aka ndịiro anyị
n’ihina ịhụnanya ya enweghị njedebe.
Azịza: Ịhụnanya ya enweghị njedebe
MBEKU – Ps 25:4,5
Alleluia, Alleluia:
Mee ka m mata ụzọ gị, O Onyenweanyị, ma dube m n’ụzọ eziokwu gị.
Alleluia
OZIỌMA – 19:3-12
Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Matiu dere
Ụfọdụ ndị Farisii bịara ịnwale Jesu site n’ịjụ ya sị, “O ziri ezi n’iwu mmadụ ịgba nwunye ya alụkwaghị m n’ihi ihe ọbụla?”
Jesu zara ha sị, Ọ bụ na ụnụ agụtabeghị na site na mbido, onye kere ha kere ha nwoke na nwaanyị, wee kwuo sị, “N’ihi nke a ka nwoke ga-eji hapụ nna ya na nne ya rapara n’ahụ nwunye ya.
Ha abụọ abụrụ otu ahụ. Ha abụghịkwa mmadụ abụọ kama ha bụzi otu ahụ. Ya bụ, ihe Chineke jikọrọ ọñụ mmadụ e kewala ya.”
Ndị Farisii ahụ wee jụọ ya sị, “Ọ bụ gịnị meziri Mosis ji nye iwu ka nwoke nye nwunye ya akwụkwọ alụkwaghị m ma chụpụ ya?”
Jesu zara ha sị, “Ọ bụ n’ihi mkpọchi obi ụnụ ka Mosis jiri hapụ ụnụ ka ụnụ gbaa nwunye ụnụ alụkwaghị m, ma ọ dịghị etu a site na mbido.
Ana m agwa ụnụ, onye ọbụla gbara nwunye ya alụkwaghị m, na-abụghị n’ihi ịgba akwụna, lụrụ nwunye ọzọ, na-akwa iko.
Ndị na-eso ụzọ ya wee sị ya, “Ọ bụrụ na ọ dị otu a n’etiti di na nwunye, ọlụlụ di na nwunye abaghị uru.” Jesu sịrị ha, “Ọ bụghị mmadụ niile pụrụ ị nara nkuzi nke a ma ọ bụghị naanị ndị e mere ka ha nara ya.
N’ihina o nwere ndị a mụrụ onozi site n’afọ nne ha, o nwekwara ndị mmadụ ibe ha mere ka ha bụrụ ndị onozi, bịa nwekwaa ndị mere onwe ha onozi n’ihi alaeze nke eluigwe.” Onye nwere ike ị nabata nke a, ya nara ya.
Igbo Mass Readings for August 13 2027, Fraịde n’ime Izuụka nke Iri na Itoolu N’Oge Adanyeghị n’Emume.