Igbo Mass Readings for June 19 2026, Fraịde Izuụka nke Iri na Otu N’Oge Adanyeghị n’Emume.

Nke a bụ Igbo Mass Readings for June 19 2026, Fraịde Izuụka nke Iri na Otu N’Oge Adanyeghị n’Emume.

IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 11:1-4, 9-18, 20

Ihe Ọgụgụ ewetara n’Akwụkwọ nke Abụọ nke Ndịeze

Mgbe nne Ahazaya bụ Atalịa hụrụ na nwa ya nwoke anwụọla, o biliri jide ụmụ eze niile gbuchapụ. Kama Jehosheba bụ adaeze Joram bụkwa nwanne nwaanyị Ahazaya duuru Joash bụ nwa Ahazaya wee si n’ime ụmụ eze ndị a ga-egbu egbu zopụ ya na onye na-eku ya.

O zonahụrụ ya Atalịa n’ime ụlọ ebe akwa na-adị nke a mere na e gbughị ya. O zoro ya afọ isii n’ime ụlọ nke Yahweh. Atalịa wee buru eze obodo ahụ.

Ma n’ime afọ nke asaa, Jehoiada ziri ozi, kpọọ ndị isi agha na-elekọta ụlọeze na ndị isi agha na-eche Atalịa nche. Ọ kpọbatara ha n’ime ụlọ nke Yahweh, o gosi ha nwa eze.

Ndịisi usuu agha ahụ mere dịka Jehoiada bụ ụkọchukwu siri nye ha n’iwu, onye ọbụla duuru ndị ọ na-achị ndị ga-arụ ọrụ na ndị anọghị n’ọrụ n’ụbọchị ezumike (Sabat) wee bịakwute Jehoiada onye Ụkọchukwu.

Onye Ụkọchukwu ahụ nyere ndịisi usuu agha ahụ ube na ụta nke Devid ndị nke dị n’ụlọ nke Yahweh. Ndị nche ji ngwaagha gbaa ụlọ ahụ gburugburu bido na mgbago ruo n’ọdịda ụlo ahụ ma n’ebe a na-achụ aja.

Mgbe ahụ ọ kpọtara nwaeze, kpube ya okpueze, nyekwa ya akwụkwọ ọgbụgbandụ, ha abịa mee ya eze, tee ya ude, wee kụọ aka ha ma sị, “Eze ịga-adị ndụ ruo ebighị ebi.”

Ma mgbe Atalịa nụrụ mkpọtụ ndị nche na nke ndị mmadụ, ọ bịakwutere ha n’ime ụlọ nke Yahweh. Ma lee, mgbe o lere anya eze guzoro n’akụkụ ide, dịka omenaala siri dị, ya na ndisi na ndị ogbuopi ya guzo ya n’akụkụ.

Ọha obodo niile na-añụrị na-egbukwa opi. Atalịa dọwara uwe ya tie mkpu sị, “Nnupụisi! Nnupụisi!” Jehoiada onye Ụkọchukwu nyere ndịisi usuu agha iwu sị, “kpọpụnụ ya ebe a, gbuokwanụ onye ọbụla ga-eso ya.

Ụnụ egbula ya n’ụlọnsọ nke Yahweh.” Ha duuru ya ruo n’ụzọ ahụ ịnyịnya si abata n’ụlọeze ebe ha nọ gbuo ya. Jehoiada wee mee ka ndị obodo, eze ha na Yahweh gbaa ndụ, ka ha bụrụ ndị nke Yahweh.

N’aka nke ọzọ, o mekwara ọgbụgbandụ n’etiti eze na ndị obodo. Ndị obodo niile wee banye n’ime ụlọ Baal, kutuo ya. Ha kụpịasịkwara onyinyoo ya na ekwuaja ya kpamkpam, wee gbuo Matan bụ ụkọchukwu Baal n’ihu ebe nchụaja ya. Onye ụkọchukwu ahụ wee họpụta ma zipụkwa ndị nche ga na-eche ụlọ nke Yahweh.

ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps. 132: 11, 12, 13-14, 17-18

Azịza: Onyenweanyị ahọrọla Zayọn ka ọ bụrụ ebe obibi ya.

1. Onyenweanyị ñụọrọ Devid iyi,

ọ gaghị echegharị na ya,

otu n’ime ụmụ gị

ka m ga-akwụba n’ocheeze gị.

Azịza: Onyenweanyị ahọrọla Zayọn ka ọ bụrụ ebe obibi ya.

2. Ọ bụrụ na ụmụ gị edobe iwu niile nke m nyere ha,

na atụmaatụ niile m ga-akụziri ha,

ụmụ ha ga-anọkwa n’ocheeze gị ebeebe.

Azịza: Onyenweanyị ahọrọla Zayọn ka ọ bụrụ ebe obibi ya.

3. N’ihina Onyenweanyị ahọrọla Zayọn,

ọ họrọla ya ka ọ bụrụ ebe obibi.

Ebe a ka m ga-anọ ebeebe,

ebe a bụ ebe obibi m họọrọ.

Azịza: Onyenweanyị ahọrọla Zayọn ka ọ bụrụ ebe obibi ya.

4. N’ebe a aga m akpọlite otu eze n’agbụrụ Devid,

aga m eme ka ọkụ nke onye m tere ude na-achawapụta ebeebe.

Aga m eji ihere kpuchie ndịiro ya ihu,

mana ọchịchị ya ga na-aga n’ihu.

Azịza: Onyenweanyị ahọrọla Zayọn ka ọ bụrụ ebe obibi ya.

MBEKU – Ps. 119:135

Alleluia, Alleluịa:

Mee ka ihu gị chakwasị nwodibo gị, ma kuziere m ime uche gị.

Alleluịa

OZIỌMA – 6:19-23

Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Matiu dere

Jesu gwara ndị na-eso ụzọ ya sị, “Ụnụ akpakọrọla onwe ụnụ akụ n’elu ụwa, ebe ọ ga-agba nchara mọbụ akịka ataa ya, ebe ndị ohi na-etiwa ma zuo ihe niile.

Kama kwadoronụ onwe ụnụ akụ n’eluigwe, ebe ọ na agaghị agba nchara, ebe akịka na-agaghị ata ya, ebe ndị ohi na-agaghị etiwa ma zuo.

N’ihina ebe akụ gị dị, ebe ahụ ka obi gị ga-adịkwa. Anya bụ mmụọkụ nke ahụ”. Ya bụ, ọ bụrụ na anya gị zuru oke, ahụ gị niile ga-ejupụta n’ihe.

Ma ọ bụrụ na anya gị dị njọ, ahụ gị niile ga ejupụta n’ọchịchịrị, lee ka ọchịchịrị ahụ si buo oke ibu!

Igbo Mass Readings for June 20 2026, Satọde Izuụka nke Iri na Otu N’Oge Adanyeghị n’Emume.

Igbo Mass Readings for June 19 2026, Fraịde Izuụka nke Iri na Otu N’Oge Adanyeghị n’Emume.