Igbo Mass Readings for February 14 2025, Fraịde n’ime Izuụka nke Ise N’Oge Adanyeghị n’Emume.

Nke a bụ Igbo Mass Readings for February 14 2025, Fraịde n’ime Izuụka nke Ise N’Oge Adanyeghị n’Emume.

IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 3:1-8

Ihe Ọgụgụ e wetara n’akwụkwọ Jenesis

Ugbu a, agwọ bụ anụ kacha aghọ aghụghọ n’anụmmanụ niile nke Yahweh Chineke kere. Ọ jụrụ nwaanyị ahụ, “Ọ bụ ezie na Chineke sịrị na ụnụ agaghị ata mkpụrụ osisi ọbụla si n’ime ogige a?”

Nwaanyị ahụ zara agwọ ahụ sị, Anyị nwere ike ịta mkpụrụ osisi niile dị n’ogige a. Ma Chineke sịrị, “Ụnụ agaghị ata mkpụrụ osisi nke si n’osisi ahụ dị n’etiti ogige a; ụnụ agaghịkwa emetụ ya aka; ụnụ taa ya mọbụ metụ ya aka, ụnụ ga-anwụrịrị”.

Mgbe ahụ agwọ ahụ ewere gwa nwaanyị ahụ sị, “Ụnụ agaghị anwụ! Chineke ma n’ezie na ụbọchị ụnụ tara ya, anya ụnụ ga-emeghe, ụnụ abịa dịka Chineke, mara iheọma na ihe ọjọọ”.

Nwanyị ahụ hụrụ na osisi ahụ dị mma oriri ma dịkwa mma n’anya, hụkwa na osisi ahụ na-agụ agụụ maka amamihe nke o nwere ike inye. O were mkpụrụ osisi ahụ taa, ma werekwa ụfọdụ nye di ya, ọ taa.

Mgbe ahụ, anya ha abụọ wee meghee, ha mata na ha gba ọtọ. Ha ewere akwụkwọ fiig dụkọọ ọnụ iji kwatara onwe ha akwa ọmụma.

Nwoke a na nwunye ya nụrụ ụda ụkwụ Yahweh Chineke ka ọ na-aga n’ime ogige ahụ oge ụbọchị juru oyi, ha were zopu onwe ha n’ihu Yahweh Chineke n’etiti osisi niile nke ogige ahụ.

ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps.: 32:1-2, 5, 6, 7.

Azịza: Ngọzi na-adịrị ndị nke a gbaghaara njọ ha.

1. Ngọzi na-adịrị onye nke a gbaghaara njọ ya;

onye nke e kpochapụrụ mmehie ya.

Ngọzi dịrị onye ahụ Onyenweanyị amaghị ikpe,

onye aghụghọ adịghị n’ime obi ya.

Azịza: Ngọzi na-adịrị ndị nke a gbaghaara njọ ha.

2. N’ikpeazụ, ekwere m na m mere njọ,

anakwaghị m ezo njọ m ezo.

Asịrị m, “Aga m ekwupụtara Onyenweanyị njọ m”.

I wee gbaghara m njọ m niile.

Azịza: Ngọzi na-adịrị ndị nke a gbaghaara njọ ha.

3. Ya mere ndị nke gị niile ji ebeku gị,

mgbe ọbụla ha nọ na nsogbu,

ọ bụrụgodu na nsogbu ekworo ka idee mmiri bịa,

ọ gaghị eru ha ahụ.

Azịza: Ngọzi na-adịrị ndị nke a gbaghaara njọ ha.

4. Gị bụ ebe mgbaba m,

Ị na-echebe m n’oge nsogbu,

I ji ukwe nzọpụta agba m gburugburu.

Azịza: Ngọzi na-adịrị ndị nke a gbaghaara njọ ha.

MBEKU – Jọn 14:5

Alleluia, Alleluia:

Mụ onwe m bụ ụzọ, eziokwu na ndụ, Onyenweanyị na-ekwu. Ọ dịghị onye ọbụla ga-abịakwute Nna ma ọ bụghị site na m.

Alleluia.

OZIỌMA – 7:31-37

Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Mak dere

Jesu siri n’okeala Taya pụọ, gafee Sidọn, si na mpaghara Dekapolis ruo osimiri Galili. Ha kpọtaara ya otu nwoke ntị chiri nke na-asụkwa oke nsụ. Ha rịọrọ ya ka o bikwasa ya aka.

Jesu siri n’igwe mmadụ ahụ kpọpụ ya iche, tinye mkpịsịaka ya na ntị abụọ nke onye ahụ ntị chiri, bụsa mkpịsịaka ya asụ, detụ ya n’ire onye ogbi ahụ; O wee lelie anya n’eluigwe, sụọ ude, sị nwoke ahụ, “Efeta!” nke pụtara “Meghee”.

Ntị nwoke ahụ meghere; ire ya tọghepụkwa, o kwukwara okwu nke ọma. Jesu nyere ndị nọ ebe ahụ iwu, ka ha ghara ịkọrọ onye ọbụla banyere ọrụ ebube a.

Ma ka ọ na-agwa ha ka ha ghara ikwu, ka ha gara n’ihu na-akọsa ọrụ ya karịa. Ọ tụrụ ha n’anya nke ukwuu, nke mere na ha na-asị, “O meela ihe niile nke ọma.

Ọ na-eme ọ bụladị ndị ntị chiri ka ha nụ ihe, na-emekwa ndị ogbi ka ha kwuo okwu.

Igbo Mass Readings for February 15 2025, Satọde n’ime Izuụka nke Ise N’Oge Adanyeghị n’Emume.

Igbo Mass Readings for February 14 2025, Fraịde n’ime Izuụka nke Ise N’Oge Adanyeghị n’Emume.