Igbo Mass Readings for June 6 2031, Fraịde n’ime Izuụka nke Itoolu N’Oge Adanyeghị n’Emume.

Nke a bụ Igbo Mass Readings for June 6 2031, Fraịde n’ime Izuụka nke Itoolu N’Oge Adanyeghị n’Emume.

IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 11:5-15

Ihe Ọgụgụ e wetara n’akwụkwọ Tobit

Ugbu a Anna nọdụ ala n’okporo ụzọ ahụ, na-atụsi anya ike maka nwa ya. Ọ hụrụ ya ka ọ na-abịa, wee gwa di ya sị, “Lee, nwa gị na onye ya na ya so pụọ alọtawala”!

Rafel kwuru sị ‘Tobiyas, ama m na anya nna gị ga-emepe. Ya bụ, ị ga-ete ya mkpọmilu ahụ n’anya; mgbe ọ kọchara, ọ ga-ehi aka n’anya nke ga-eme ka ihe ahụ na-acha ọcha kpuchiri ya anya dapụ, ọ ga-ahụkwa gị.

Mgbe ahụ, Anna gbara gaa izute ha, makụọ nwa ya sị ya, “Ahụla m gị nwa m, adịzi m nkwadebe ịnwụ ọnwụ”. Ha abụọ wee bee akwa.

Tobit kuliri pụtaba n’ọnụụzọ ma daa ada, mana nwa ya gbakwuuru ya, kulite ya ma tee ya mkpọmilu ahụ n’anya sị, “Obi sie gị ike nna m”.

Mgbe ihe ahụ kọrọ, O bidoro hibe aka n’anya, ihe ahụ na-acha ọcha esi n’akụkụ anya ya dapụ. Ọ hụ nwa ya nwoke makụọ ya, bee akwa sị, “Ngọzi dịrị gị O Chineke, ngọzi dịrị aha nsọ gị ebeebe, ngọzị dịkwara ndị mmụọozi gị niile.

Maka na ị taala m ahụhụ ma gosịkwa m ebere; ugbu a, anya m ahụla nwa m Tobiyas”! Nwa ya ji añụrị baa n’ime ụlọ, kọọrọ nna ya ihe ịtụnaanya niile meere ya na Media.

ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps. 146:1-2,7,8-9,10.

Azịza: Alleluia! Mkpụrụobi m too Chineke.

1. Mkpụrụobim too Chineke.

Aga m eto Osebụrụwa n’ụbọchị ndụ m niile,

aga m ekwegara Chineke m ukwe, oge niile m dị ndụ.

Azịza: Alleluia! Mkpụrụobi m too Chineke.

2. Onyenweanyị kwesịrị ntụkwasịobi ebeebe

Ọ na-enye ndị a na-emegbu emegbu ikpe nkwụmọtọ.

Ọ na-enye ndị agụụ na-agụ nri

Ọ na-emekwa ka ndị e ji eji nwere onwe ha.

Azịza: Alleluia! Mkpụrụobi m too Chineke.

3. Onyenweanyị na-eme ka ndịisi hụ ụzọ.

Ọ na-ebulite ndị ibu arọ nyịdara n’ala.

Onyenweanyị hụrụ ndị eziomume n’anya.

Onyenweanyị na-echekwaba ndị ọbịa.

Azịza: Alleluia! Mkpụrụobi m too Chineke.

4. Ọ na-echekwaba ndị na-enweghị nne na nna na ndị ajadu.

Onyenweanyị na-eme ka ihe siere ndị obi ọjọọ ike

Onyenweanyị ga-achị eze ebeebe,

Chineke gị, O Zayọn, ga-achị site na ndụdụgandụ ruo na ndụdụgandụ. Alleluia.

Azịza: Alleluia! Mkpụrụobi m too Chineke.

MBEKU – Eph 1:17-18

Alleluia, Alleluia:

Ka Chineke nke Dinwenụ anyị Jesu Kristi, Nna nke otito, meghee anya nke obi ụnụ, ka ụnụ wee mata ihe bụ nchekwube nke ọkpụkpọ ọ kpọrọ ụnụ.

Alleluia.                         

OZIỌMA – 12:35-37

Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Mak dere

Mgbe Jesu na-akụzi ihe n’ụlọnsọ Chineke, ọ jụrụ sị, “Olee otu ndị odeakwụkwọ ji ekwu na Kristi bụ nwa David?

David n’onwe ya site na mkpalite nke Mmụọ Nsọ kwuru sị, “Onyenweanyị gwara Nna m ukwu, Nọdụ ala n’aka nri m, Ruo mgbe m ga-edote ndịiro gị n’okpuru ụkwụ gị.

David n’onwe ya kpọrọ ya Nna ukwu, olee ka ọ ga-esi bụrụkwa nwa ya? Ya mere oke igwe mmadụ nọ n’ebe ahụ ji ọñụ nụrụ okwu ya.

Igbo Mass Readings for June 7 2031, Satọde n’ime Izuụka nke Itoolu N’Oge Adanyeghị n’Emume.

Igbo Mass Readings for June 6 2031, Fraịde n’ime Izuụka nke Itoolu N’Oge Adanyeghị n’Emume.