Igbo Mass Readings for April 25 2025, Fraịde Izuukwu nke Mbilite n’Ọnwụ Kristi

Nke a bụ Igbo Mass Readings for April 25 2025, Fraịde Izuukwu nke Mbilite n’Ọnwụ Kristi.

IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 4:1-12

Ihe Ọgụgụ ewetara n’Ọrụ Ndịozi

Ka Pita na Jọn nọ na-agwa ndị Juu okwu, ndị nchụaja, na ọchịagha na-elekọta ndị agha nke ụlọ nsọ Chineke, na ndị Sadusii bịakwutere ha. Iwe were ha, n’ihi na ndị ozi abụọ ahụ nọ na-akụziri ndị mmadụ na Jesu esila n’ọnwụ bilie, nke bụ igosi na mbilite n’ọnwụ dị.

Ha jidere ndịozi ahụ, tinye ha n’ụlọ mkpọrọ, ruo echi ya, n’ihi na anyasị eruola nso. Ma ọtụtụ ndị nụrụ okwu ha kweere na Jesu, ọnụọgụgụ ndị nwoke ndị kwerenụ ruru ihe dịka puku ise.

N’ụbọchị so ya, ndịisi ọchịchị ndị okenye na ndị odeakwụkwọ nke ndị Juu zukọrọ na Jerusalem. Ha na Anas onyeisi nchụaja, Kaịfas, Jọn na Elegzanda, na ndị ọzọ si ikwu nke ndịisi nchụaja sokwa na nzukọ ahụ.

Mgbe ha kpọpụtara Pita na Jọn n’etiti ha, ha ajụọ ha sị, “Ọ bụ site n’ike onye na site n’aha onye ka ụnụ jiri mee ihe ndị a?” N’oge ahụ Pita jupụtara na Mmụọ Nsọ wee sị ha, “Ndịisi na ndị okenye nke ndị Juu, Ọ bụrụ na ihe e ji ekpe anyị ikpe taa bụ n’ihi ọrụ ọma a rụrụ n’ahụ onye ngwọrọ, na etu e si mee ka ahụ ya dị mma,

Ka o wee ụnụ anya, na ọ bụ n’aha Jesu Kristi onye Nazaret onye ụnụ kpọgburu n’obe, onye Chineke mere ka o si n’ọnwụ bilie ka nwoke a jiri kwuru n’ihu ụnụ n’ahụ ike. Nke a bụ okwute nke ndị na-arụ ụlọ jụrụ nke mechara ghọọ okwute ji ụlọ.

Nzọpụta adịghịkwa na onye ọbụla ọzọ n’ihina ọ dịghị aha ọzọ dị n’okpuru eluigwe, nke Chineke nyere ụmụ mmadụ, nke aga eji zọpụta anyị.

ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps. 118: 1-2, 4, 22-24, 25-27.

Azịza: Ọ bụ okwute nke ndị na-ewu ụlọ jụrụ ajụ, bụzi ide ji ụlọ.

1. Nye Onyenweanyị ekele n’ihi na ọ dị mma

ịhụnaanya ya enweghị njedebe,

ka ụmụ Izrel kwuo sị,

ịhụnaanya ya enweghị njedebe.”

Ka ndị na-atụrụ Onyenweanyị egwu kwuo sị,

“Ịhụnaanya ya enweghị njedebe.”

Azịza: Ọ bụ okwute nke ndị na-ewu ụlọ jụrụ ajụ, bụzi ide ji ụlọ.

2. Ọ bụ okwute nke ndị na-ewu ụlọ jụrụ ajụ, bụzi ide ji ụlọ.

Nke a bụ aka ọrụ nke Onyenweanyị,

ọ dịkwa ịtụnaanya n’anya anyị.

Taa bụ ụbọchị ahụ Onyenweanyị mere,

ka anyị nwee añụrị ka obi dị anyị ụtọ na ya.

Azịza: Ọ bụ okwute nke ndị na-ewu ụlọ jụrụ ajụ, bụzi ide ji ụlọ.

3. Biko Onyenweanyị, biko zọpụta anyị,

biko Onyenweanyị, biko nye anyị ọganiihu!

Ngọzi dịrị onye ahụ na-abịa n’aha Onyenweanyị,

anyị na-eto gị site n’ụlọ Onyenweanyị.

Osebụrụwa bụ Chineke, o ji ihu ọchị ele anyị.

Azịza: Ọ bụ okwute nke ndị na-ewu ụlọ jụrụ ajụ, bụzi ide ji ụlọ.

MBEKU

ALLELUIA ALLEUIA:

Taa bụ ụbọchị ahụ Onyenweanyị mere, ka anyị nwee añụrị ka obi dị anyị ụtọ na ya.

ALLELUIA.

OZIỌMA – 21:1-14.

Ihe Ọgụgụ ewetara n’Oziọma dị asọ nke Jọn dere

Mgbe ihe ndị a gachara, Jesu gosikwara ndị na-eso ụzọ ya onwe ya ọzọ n’osimiri nke Tiberias. Otu a ka o si mee: Saịmọn Pita, Tọmọs nke a na akpọ ejima, Nataniel onye Kena nke Galili, ụmụ Zebedi, na mmadụ abụọ ndị ọzọ n’ime ndị na-eso ụzọ ya nọkọtara ọnụ. Saịmọn Pita sịrị ha, “Ana m aga ise azụ.”

Ha gwara ya sị, “Anyị ga-eso gị gaa. “Ha niile pụrụ banye n’ụgbọmmiri. Ọ dịghị azụ ọbụla ha gbutere n’abalị ahụ. Ka chi na-abọ, Jesu nọdụrụ n’akụkụ mmiri, ma ndị na-eso ụzọ ya amataghị na ọ bụ Jesu.

Jesu ajụọ ha sị, “Ụmụ okorobịa, ụnụ gbutekwara azụ? Ha asị ya, “Mba” Ọ sịrị ha, “Wụnyenụ ụgbụ ụnụ n’akụkụ akanri nke ụgbọ, Ụnụ ga-egbute azụ.”

Ha wụnyere ya, ma ha enweghịkwa ike ibupụtalị ya n’ihina azụ juru ya, Nwaazụ ahụ Jesu hụru n’anya asị Pita, “Ọ bụ Onyenweanyị.” O yiiri uwe ya manye n’ime mmiri n’ihina ọ gbabu ọtọ.

Ndị na-eso ụzọ Jesu ndị ọzọ banyere n’ụgbọ, na-adọkpụ ụgbụ ha nke azụ juru. Ebe ha nọ adịghị anya n’elu ala. Ọ dị ihe dịka otu narị mita. Mgbe ha rịpụtara n’elu ala, ha hụrụ icheku ọkụ n’ebe ahụ, na azụ a tụkwasara n’elu ya na ogbe achịcha.

Jesu asị ha, “Wetanụ ụfọdụ n’ime azụ ndị ahụ ụnụ gbutere ugbu a. Saịmọn Pita banyere n’ụgbọ dọpụta ụgbụ ahụ n’ala. Ụgbụ ahụ jupụtara n’azụ nke ọnụọgụgụ ya bụ ihe dịka otu narị na iri ise na atọ.

N’agbanyeghị na azụ a buru ibu, ụgbụ ahụ adọkaghị. Jesu sịrị ha, “Bịanụ, rie nri ụtụtụ.” Ma ọdịghị onye ọbụla n’ime ndị na-eso ụzọ ya juru ya sị, “Onye ka Ị bụ?”

N’ihina ha matara na ọ bụ Onyenweanyị. Jesu bịara were achịcha ahụ nye ha. Otu ahụ ka o mekwara azụ ahụ. Nke a bụ nke atọ Jesu gosiri ndị na-eso ụzọ ya onwe ya kamgbe o bilitechara n’ọnwụ.

Igbo Mass readings for April 26 2025, Satọde Izuukwu nke Mbilite n’Ọnwụ Kristi.

Igbo Mass Readings for April 25 2025, Fraịde Izuukwu nke Mbilite n’Ọnwụ Kristi.