Igbo Mass Readings for March 14 2025, Fraịde Izuụka nke Mbụ n’Oge Ncheta Ahụhụ Kristi
Nke a bụ Igbo Mass Readings maka March 14 2025, Fraịde Izuụka nke Mbụ n’Oge Ncheta Ahụhụ Kristi.
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 18:21-28
Ihe Ọgụgụ e wetara n’akwụkwọ onye Amụma Izikel
“Ọ bụrụ na ajọ mmadụ atụgharịa site na mmehie niile o mere, bịa debe ihe m nyere n’iwu, na-emekwa ihe ziri ezi na ihe dị mma, ọ ga-adịrịrị ndụ; ọ gaghị anwụ.
O nweghịkwa mmehie ọbụla o mere nke a ga-echeta iji megide ya. Ọ ga-adị ndụ maka eziomume niile nke o mere. Ọ na-amasị m bụ ọnwụ nke onye ajọomume?
Ọ bụ Yahweh Chineke na-ekwu, karịa na o chigharịrị n’ụzọ ya wee dị ndụ? Ma mgbe onye eziomume hapụrụ eziomume ya, bịa mee ihe ọjọọ, na-emekwa ihe arụ niile bụ nke onye ajọ mmadụ na-eme, ọ ga-adị ndụ?
O nweghị iheọma niile o mere nke a ga-echeta; ọ ga-anwụ n’ihi akwụdosịghị ike ya, na mmehie niile o mere. “Ma ụnụ na-asị ‘Ụzọ nke Yahweh ezighị ezi! Gee ntị ugbu a, ụlọ Izrel: Ọ bụ na ụzọ m ezighị ezi?
Ọ bụ na ọ bụghị ụzọ ụnụ bụ nke ezighị ezi? Mgbe onye eziomume si n’eziomume ya chegharịa, mebe ihe ọjọọ, ọ ga-anwụ maka ya; ọ ga-anwụ maka ihe ọjọọ nke o mere.
Ma mgbe ajọ mmadụ si n’ajọ omume niile o mere chegharịa bịa mee ihe ziri ezi, a ga-azọpụta ndụ ya. N’ihina o chere echiche wee si na mmehie niile nke o mere chigharịa, ọ ga-adịrịrị ndụ, ọ gaghị anwụ.
ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps. 130: 1-2, 3-4, 5-6, 7-8.
Azịza: Ọ bụrụ na gị, O Onyenweanyị, na-agụ ajọ omume anyị ọnụ, Onyenweanyị, onye ga-eguzo.
1. N’ugbu mmiri ka m na-akpọku gị, O Onyenwenanyị,
Onyenweanyị, nụrụ akwa enyemaka m na- ebe,
che ntị n’arịrịọ m na-arịọ.
Azịza: Ọ bụrụ na gị, O Onyenweanyị, na-agụ ajọ omume anyị ọnụ, Onyenweanyị, onye ga-eguzo.
2. Ọ bụrụ na gị, O Onyenweanyị,
na-agụ ajọomume anyị ọnụ,
Onyenweanyị, onye ga-eguzo.
Mana ị na-agbaghara anyị,
n’ihi nke a, anyị na-asọpụrụ gị.
Azịza: Ọ bụrụ na gị, O Onyenweanyị, na-agụ ajọ omume anyị ọnụ, Onyenweanyị, onye ga-eguzo.
3. Ana m eche Onyenweanyị,
mkpụrụobi m na-eche ya,
na nkwa ya ka m nwere nchekwube.
Mkpụrụobi m na-eche Onyenweanyị,
karịa otu ndị nche si eche ụtụtụ.
Azịza: Ọ bụrụ na gị, O Onyenweanyị, na-agụ ajọ omume anyị ọnụ, Onyenweanyị, onye ga-eguzo.
4. O Izrel, nwee nchekwube n’Onyenweanyị!
N’ihi na ịhụnaanya Onyenweanyị dị ọkpụ,
n’ime ya ka nnukwu nzọpụta dị!
Ọ ga-azọpụta Izrel na njọ ha niile.
Azịza: Ọ bụrụ na gị, O Onyenweanyị, na-agụ ajọ omume anyị ọnụ, Onyenweanyị, onye ga-eguzo.
MBEKU – Ezikel 33, 11
R/ Otito na ebube dịrị Gị, O Dinwenụ, Jesu Kristi.
Agaghị m enwe añụrị n’ọnwụ onye ajọ omume, kama ka o si na njọ ya pụta ma dị ndụ.
R/ Otito na ebube dịrị Gị, O Dinwenụ, Jesu Kristi.
OZIỌMA – 5:20-26
Ihe Ọgụgụ e wetara n’Oziọma dị asọ nke Matiu dere.
Jesu gwara ndị n’eso ụzọ ya sị: “belụsọ ma eziomume ụnụ ọkarịrị nke ndị odeakwụkwọ na nke ndị Farisii, ụnụ agaghị abata n’alaeze eluigwe. “Ụnụ anụla na agwara ndị mgbe ochie sị, ụnụ egbula ọchụ.
Onye ọbụla gburu ọchụ a ga-ekpe ya ikpe. Ma mụ onwe m na-agwa ụnụ sị, Onye ọbụla nke na-eburu nwanne ya iwe n’obi, a ga-ama ya ikpe. Onye ọbụla kparịrị nwanne ya ga-aza azịza n’ụlọikpe.
Onye ọbụla kpọrọ nwanne ya onye nzuzu!’ ga-aba n’ọkụmmụọ. Ya bụ ọ bụrụ na ị na-eweta onyinye gị n’ekwu nchụaja, ma cheta n’ebe ahụ na gị na nwanne gị adịghị na mma, hapụ onyinye gị n’ihu ekwu aja.
Buru ụzọ gaa ka gị na nwanne gị mezie. Mgbe ụnụ mezichara, bịa, ka i nye onyinye gị. Mee ka gị na onye gbara gị akwụkwọ kpezie ọsịsọ tupu ụnụ agaruo n’ụlọ ikpe, ka ọ ghara inyefe gị n’aka onye ọkaikpe, onye ọkaikpe e duru gị nye n’aka ndị nche, ndị nche ewee tinye gị n’ụlọ mkpọrọ. N’eziokwu agwa m gị, ị gaghị esi ebe ahụ pụta ruo mgbe ị kwụchara ụgwọ gị niile.
Igbo Mass Readings for March 15 2025, Satọde Izuụka nke Mbụ n’Oge Ncheta Ahụhụ Kristi
Igbo Mass Readings for March 14 2025, Fraịde Izuụka nke Mbụ n’Oge Ncheta Ahụhụ Kristi.